Jamaikạ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Wuá ébé: otú uzọr, chọwa
Jamaikạ
Asụsụ obodo Bekee

Jamaica bu òbòdò àgwè nọ na ime otú-Obodo Karibiyạn. O nor na ímé Osịmịrị Karibiyạn, nleda anyanwu ya bu ébé Cuba nor, na odida anyanwu ya wu ala-elu-mmiri há nạ kpo Hispanyola, ime ala nke bu obodo Hēyítị na Ochichiiwu Dọminícạ. Diạlạ Jamaikạ bu ndi Taíno ndi na su asụsụ Arawak, ha gùrù obodo ha Xaymaca, wuru "Alạ nkú na mmirị", ma o bu "Alạ mmirị jụrụ".

Búrú obodo ndi Spain wẹrẹ ha kpọrọ Santiago, mgbe ogẹ gáfèrè o dafụrụ áká ha, da na ime ochíchí ndi Britain aha ya wuzi 'Jamaica'. Wéré madu rúrú nde 2.8, o bu obodo ató nor na Olile anyanwu Amerika na su asụsụ Inglish wéré madu kacha, Nke ndi mbu bu Njikota Obodo Amerika na Kánada. O nor okpúrụ Eze nwanyi Elizabeth II bu ishi iwu alạ. Kingston bu ama ukwu bu nke kacha ívu na Jamaikạ