Okwu:Jisọs Kraịst

Page contents not supported in other languages.
Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ụmụ nne m nwaoke n'ụmụ nne m nwanyì, Ana m ékélé ụnụ o. Ọ bụ n'ezịe na ndị nna-nna anyi hà nwere Chi ha n'éfè, ma na nsogbụ nọ n'ébé ahù bụ na ndị nna-nna anyi amaghí ihe ha n'éfè. Anyi ga ahụ ihe a sịte n'okwụ Onyenweanyi Jesu Krịst kwara nwanyi Samerita n'olulu mmịrị ha, Ebe nwanyi ahụ biara ịkụrụ mmịrị ọnhụnhụ.(Jọn.4:22) Nzọpụta ga esị n'aka ndị jịu bịa, jesu krịst bu onye jịu.(Jọn.4:25,26) Únú ahụla ịhe merenụ, Ndị nna-nna anyi ha amaghí ihe ha n'éfè. Okpụkpere chi ha adịghị ịche na okpụkpere Chi ndị ala ọzọ dị ka, ndị Grik na ndị Rom, Ndị Pọlụ gwara Okwụ a n'akwụkwọ nsọ nke(Ọrụ ndị ozị(Acts).17:22-34.Ndi Rom.1:18-23,25) Chineke anaghi atụ asị, mgbe Ọ si n'anyi nịle dị ka atụrụ fụrụ efụ(Aịsaịa.53:6) N'ìhì ya ka Chineke jiri zike ọkpara ya ka ọ kụziere anyi ụzọ esị ekpere ya (Chineke) n'ime mmụọ n'eziokwu(Jọn.4:23,24)

N'ezia okpụkpere Chi ndi obodo nịle Nke uwa kpere tụpụ Kraist ábiá bù ihe fụrụ efụ ma ọbụ ihe n'ezughi ezu. Ọ bù sịte n'aha Kraist Onyeweanyi ka okpụkpere Chi onye ọbụla ga ezụ òkè. Ọgwụla nanị sịte na ịso ụzọ Kraist ka anyi ga esị bátá n'amara Chineke.(Jọn.14:6) Anyi ahapughị Ị na eto Chineke n'ihi na Onyere anyi ụzọ amara ya sịtere na Kraist bịara anyi.

Nye Kraist ndụ tà tà, N'ihi na Oge n'agafe.


Ka Chukwu gozie ụnụ nịle ndi na eso ụzọ Kraist.

Aha m bụ IfeanyiChukwu. <email removed>