Gaa na ọdịnaya

Ịchụghachị ndị mbịarambịa West Africa si Naịjịrịa gaa ala ha n'ike

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nigerian Immigrants

Ịchụghachị ndị mbịarambịa West Africa si Naịjirịa mere ozugbo e tìrì iwu nchịkwa nke Jenụwarị 1983 sitere n'aka Onye isi ala Shehu Shagari, nke manyere ndị mbịarambịa iwu na-akwadoghị ịhapụ mba ahụ ma ọ bụ akpọchie ha. N'ihi iwu Shagari nyere, a chụpụrụ ihe karịrị nde mmadụ abụọ, gụnyere otu ndè ndị Ghana.[1] 

Akụkọ ka O Si Mee

[dezie | dezie ebe o si]

Ọtụtụ n'ime ndị mbịarambịa ndị ahụ ka a dọtara mmasị ha na Naịjirịa n'ihi ọganihu mmanụ nke afọ 1970, mana ka ọ na-erule afọ 1983, akụ na ụba adịghịzi ike.[2] Iwu Shagari ahụ bụ nzaghachi a na-ebo ebubo na ọ bụ maka ọgba aghara okpukpe nke jupụtara n'akụkụ ụfọdụ nke mba ahụ n'afọ 1980 (nke a maara dị ka Kano Riots) nakwa afọ 1981. [3] Tupu afọ 1983, a chụpụrụ ndị mbịarambịa ọtụtụ ugboro na West Africa n'ihi ihe dị iche iche.[4][5] Ndị a gụnyere nchụpụ Ghana chụpụrụ ndị Naijiria n'afọ 1954 na n'afọ 1969 na nchụpụ Togo chụpụrụ ụmụ amaala si Côte d'Ivoire, Dahomey, na Naijiria n'afọ 1958.[4][5]

Ọnọdụ E Nyere ndị Mbịarambịa

[dezie | dezie ebe o si]

Ụzọ bụ isi e si aga Ghana bụ site n'ebe ọdịda anyanwụ, na-agafe Benin na Togo. N'ihi mgbalị a nwara iwere ọchịchị n'ike n'afọ gara aga, Onye isi ala Ghana, Jerry Rawlings, mechiri ụzọ isi gafee ala na Togo, nakwa iji zere mbata mberede nke ndị laghachiri, Togo mechikwara ókèala ya na Benin. Ya mere, ozugbo ndị mbịarambịa rutere Benin, a machibidoro ụzọ ha si apụ ma manye ha ịnọ n'ọdụ ụgbọ mmiri Cotonou, oche gọọmentị nke mba ahụ, na-anwa ịchọta ụgbọ mmiri na-aga Ghana. Mgbe ha tọrọ atọ ihe karịrị otu izu, Ghana meghere ókèala ya, na-eme ka Togo mee kwa otu ihe ahụ ka ndị Ghana nwee ike ịlaghachi n'ụlọ.[2]

Ihe Ncheta

[dezie | dezie ebe o si]

Akpa "Ghana Must Go"

[dezie | dezie ebe o si]

Ụdị akpa na-adịghị okè ọnụ nke eji naịlọn akpara àkpà ka úté mee, nke ndị mbịarambịa na-eji ebu ihe ha, nwetara aha "Ghana Must Go" n'oge ọpụpụ ndị mbịarambịa ahụ. Ruokwa ebe afọ 2019, a ka na-akpọkwa akpa ahụ aha a n'ọtụtụ akụkụ nke Naijiria, Ghana, na akụkụ ụfọdụ nke West Africa.[6][7] N'afọ 2020, onye Naijiria na-ese foto bi na New York bụ Obinna Obioma jiri akpa ndị ahụ mee uwe na ihe ndị ọzọ na ihe ngosi banyere nkwagarị nke akpọrọ Anyi N'Aga n'asụsụ Igbo. [8]

N'ụwa niile, akpa ahụ nwere aha ndị ọzọ dịgasị iche iche na-ejikọta ya na ndị mbịarambịa. Na Germany a na-akpọ ya "Türkenkoffer" (akpa ndị Turkey), na US, "Chinatown tote", na Guyana, "Guyanese Samsonite", na n'ebe ndị ọzọ dị iche iche, "Akpa ndị ọgbọsọ agha".[9]

Mmetụta na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge a

[dezie | dezie ebe o si]

Mmekọrịta dị n'etiti Naịjirịa na Ghana adịkwuola mma kemgbe ihe ndị ahụ mere n'afọ 1983. [10]

  • Ghana Must Go (akwụkwọ akụkọ)

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Daly (2022-07-30). "Ghana Must Go: Nativism and the Politics of Expulsion in West Africa, 1969–1985". Past & Present. DOI:10.1093/pastj/gtac006. ISSN 0031-2746. 
  2. 2.0 2.1 Solomonov. "Ghana Must Go: Exodus From Nigeria Remembered", Yen.com.gh, 2015-08-15. Retrieved on 2017-05-14. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Yen" defined multiple times with different content
  3. Daly (2022-07-30). "Ghana Must Go: Nativism and the Politics of Expulsion in West Africa, 1969–1985". Past & Present. DOI:10.1093/pastj/gtac006. ISSN 0031-2746. 
  4. 4.0 4.1 Peil (August 1971). "The Expulsion of West African Aliens". The Journal of Modern African Studies 9 (2): 205–229. DOI:10.1017/S0022278X00024903. 
  5. 5.0 5.1 Peil (Autumn 1974). "Ghana's Aliens". The International Migration Review 8 (3): 367–381. DOI:10.1177/019791837400800303. 
  6. Daly (2022-07-30). "Ghana Must Go: Nativism and the Politics of Expulsion in West Africa, 1969–1985". Past & Present. DOI:10.1093/pastj/gtac006. ISSN 0031-2746. 
  7. Daly (2022-07-30). "Ghana Must Go: Nativism and the Politics of Expulsion in West Africa, 1969–1985". Past & Present. DOI:10.1093/pastj/gtac006. ISSN 0031-2746. 
  8. Orjinmo. "In pictures: Turning the iconic Ghana Must Go bag into high fashion", BBC News, 2020-11-19. Retrieved on 2020-11-19.
  9. Daly (2022-07-30). "Ghana Must Go: Nativism and the Politics of Expulsion in West Africa, 1969–1985". Past & Present. DOI:10.1093/pastj/gtac006. ISSN 0031-2746. 
  10. Daly (2022-07-30). "Ghana Must Go: Nativism and the Politics of Expulsion in West Africa, 1969–1985". Past & Present. DOI:10.1093/pastj/gtac006. ISSN 0031-2746.