Ọrụ Maka Asụsụ Ndị Nọ N'Ize Ndụ
| Enwere ya na | Asụsụ Dịgasị iche (7) |
|---|---|
| Ntọala | June 2012[1] |
| URL | www.endangeredlanguages.com |
| Ọnọdụ dị ugbu a | Ịrụsi Ọrụ Ike |
Ọrụ Endangered Languages Project (ELP) (ọrụ maka asụsụ ndị nọ n'ize ndụ) bụ njikọ aka zuru ụwa ọnụ n'etiti Òtù asụsụ ụmụ amaala, ndị ọkà mmụta asụsụ, ụlọ agụmakwụkwọ ndị dị elu, na ndị mmekọ ụlọ ọrụ dị mkpa iji mee ka Asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ sie ike. Ntọala nke ọrụ ahụ bụ ebe nrụọrụ weebụ, nke malitere na Jun 2012.
Akụkọ Mmalite
[dezie | dezie ebe o si]E bidoro ELP na Jun 2012 na ebumnuche nke ịbụ "isi iyi ozi zuru oke, kwesịkwara oge a gbasara asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ n'ụwa" dị ka onye nduzi nke Catalogue of Endangered Languages (ELCat), bụ Lyle Campbell, ọkammụta nke asụsụ na Maanoa College of Languages, Linguistics and Literature si kwuo. O kwuru na "... A chọrọ ebe ndekọ (katalọgụ) ahụ iji kwado ndetukọ na mmelite asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ, iji mee ka ọha na eze na ndị ọkà mmụta mara, iji nyere ndị òtù asụsụ ha nọ n'ihe ize ndụ aka, na iji dọta uche ndị mmadụ gaa n'asụsụ ndị kachasị nwee mkpa nchekwa ha. " Dịka ọmụmaatụ, nzukọ ahụ na-ekewa asụsụ Métis nke Canada bụ Michif dị ka nke nọ n'ihe ize ndụ n'ihi ọnụ ọgụgụ ndị na-asụ ya nke ọma na-ebelata n'ikè n'ike. [2]

E nwere ndị mmekọ anọ so guzobe ya ndị hụrụ maka mmepe na mmalite nke ebe nrụọrụ weebụ ahụ, gụnyere Kansụl Ọdịbendị Ndị Mbụ, Mahadum Eastern Michigan, ngalaba asụsụ nke Mahadum Hawai'i na Mānoa, yana na Google.org. Taa, ọ bụ abụọ n'ime ndị ahụ guzobere ya, na-edu ya: First Peoples' Cultural Council na Mahadum nke Hawai'i na Mānoa na nkwekọrịta ya na Kansul Nchịkwa ya.[3]
Ebumnuche nke ọrụ ahụ
[dezie | dezie ebe o si]Ebumnuche nke ELP bụ ịkwalite nkekoọrịta ozi metụtara asụsụ ndị dị n'ihe ize ndụ na ime ka nnyocha na ndetukọ nke asụsụ ndị dị n'oké egwu dị ngwa, iji kwado obodo ndị na-echebe ma ọ bụ mee ka asụsụ ha dịghachi ndụ. Ndị ọrụ nke ebe nrụọrụ weebụ ahụ na-arụ ọrụ dị ukwuu n'itinye asụsụ ha n'ịntanetị site na itinye ozi ma ọ bụ ihe nlele n'ụdị ederede, ụda, njikọ gasị ma ọ bụ faịlụ vidiyo.[4] Ozugbo ebugoro ya na ebe nrụọrụ weebụ ahụ, ndị ọrụ nwere ike ịdebanye aha ha site na ụdị ihe onwunwe iji hụ na enwere ike ịchọ ha n'ụzọ dị mfe. Ụdị ihe onwunwe dị ugbu a gụnyere:
- Nnyocha Asụsụ na Asụsụ
- Mweghachi Asụsụ
- Ihe Ndị Asụsụ
- Mmụta Asụsụ
- Nkwado Asụsụ na ime ka a mara asụsụ
- Asụsụ, Omenala na Nkà
- Asụsụ na Nkà na Ụzụ
- Mgbasa ozi
Asụsụ ndị dị na ebe nrụọrụ weebụ ahụ yana ozi egosiri banyere ha sitere na Catalogue of Endangered Languages (ELCat), nke ngalaba asụsụ na Mahadum Hawai'i na Mānoa yana Mahadum Eastern Michigan mepụtara.[5] Ebumnuche nke katalọgụ ahụ bụ ịnọgide na-emeziwanye. Ọ bụ ezie na akwụkwọ ahụ malitere site na mbipụta ndị dị adị, ELP chọrọ ndị ọkachamara iji mejupụta ntinye ndị na-ezughị ezu ma dozie njehie ọ bụla. A na-agba ndị ọrụ maara banyere otu asụsụ kwesịrị ekwesị maka ELCat ume ka ha nyefee ozi gbasara imeziwanye ma ọ bụ inyefe otu asụsụ etinyere.[6] Ebe nrụọrụ weebụ nke nzukọ ahụ na-enyekwa maapụ mmekọrịta iji gosipụta mmalite nke asụsụ ndị a na gburugburu ụwa.[7]
Ihe ịga nke ọma na nchọpụta nke ọrụ ahụ
[dezie | dezie ebe o si]Ka ọ na-erule 2020, ELP edepụtala ihe karịrị asụsụ puku atọ nọ n'ihe ize ndụ na ELCat ya na-elekọta mba / mpaghara otu narị na iri asatọ n'ụwa niile. Ụfọdụ n'ime asụsụ ndị a gụnyere Nubi, Irish, Orok, Welsh, Asụsụ ndị ogbi mba Sweden, na Boruca. E nwere asụsụ narị atọ na iri isiị nọ n'ihe ize ndụ edeturu na Australia, naanị.[8] ELP na-ekwu na "ihe karịrị pasent iri anọ nke ihe dịka asụsụ puku asaa n'ụwa niile nọ n'ihe ize ndụ nke ịpụ n'anya".[3]
N'afọ 2018, ndị otu ELCat bipụtara akwụkwọ banyere ọrụ ahụ, nke akpọrọ Cataloguing the World's Endangered Languages . [9]

Mmalite na ndị ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ndị ndu na Nhazi ndị isi òtù
[dezie | dezie ebe o si]Òtù ndị ọkachamara a kpọrọ òkù mejupụtara Kansụl Nchịkwa na Kọmitii ndụmọdụ nke na-elekọta òtù ahụ. Kansụl Gọọmenti ya nwere ndị òtù iri na otu ugbu a, gụnyere Lyle Campbell na Oliver Loode, nwere ahụmịhe na ọrụ dịgasị iche iche, gụnyere òtù nnyocha asụsụ dị iche iche, mahadum gasị, na Google.[10]
Kansụl Ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]Kansụl ọchịchị na-arụsi ọrụ ike nwere ndị nnọchiteanya si United States, Canada, Australia, Estonia, Cameroon na Netherlands. Ọrụ ha bụ njikwa nke ebe nrụọrụ weebụ ahụ, nlekọta nke mgbalị mgbasa ozi na atụmatụ ogologo oge maka ọrụ ahụ.
Ndị Njikọ Aka
[dezie | dezie ebe o si]Na mgbakwunye na òtù ndị na-achị achị edepụtara n'elu, njikọ zuru ụwa ọnụ nke òtù ndị na-arụ ọrụ iji wusie ike ma chekwaa asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ na-amalite site na ebe nrụọrụ weebụ ahụ. A maara òtù a dị ka Alliance for Linguistic Diversity. Òtù a na Google na-arụkọ ọrụ iji rụọ ọrụ asụsụ ndị nọ n'ihe ize ndụ. [11]
Ndị ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]ELP nwere ndị ọrụ oge niile abụọ ugbu a, ndị nkuzi mmeziwanye asụsụ anọ na-arụ ọrụ nwa oge, yana ndị na-amụ ọrụ anọ. Ndị ọrụ ELP na ndị na-amụ ọrụ ugbu a sitere na US, Cameroon, Canada, China, India, Ireland, Kenya, Mexico, na Peru.[12]
Ebemsidee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "Google partners with UH Manoa linguists on endangered languages project". University of Hawaiʻi. 2012-06-12. Retrieved 2019-03-21.
- ↑ Wenz (September 1, 2020). The Fragile State of "Contact Languages". www.bbc.com. Retrieved on October 3, 2020.
- 1 2 Endangered Languages Project. Endangered Languages Project. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>tag; name ":0" defined multiple times with different content. - ↑ Kazi Stastna (2012-06-26). New Google site aims to save endangered languages. CBC News.
- ↑ Campbell (2017). Cataloguing the World's Endangered Languages. London: Routledge.
- ↑ About the Catalogue of Endangered Languages. University of Hawaiʻi at Mānoa. Retrieved on 10 October 2020.
- ↑ Gottlieb. "Google Fights for Endangered Languages", June 21, 2012. Retrieved on 9 October 2020.
- ↑ Languages. Endangered Languages Project. Archived from the original on 2014-04-13. Retrieved on 9 October 2020.
- ↑ (30 June 2020) in Campbell: Cataloguing the world's endangered languages, 1 (in en), Milton Park, Abingdon, Oxon: Routledge. ISBN 9780367580902. Retrieved on 22 December 2022.
- ↑ The Endangered Languages Project. About the Endangered Languages Project. Endangered Languages Project. Retrieved on 9 October 2020.
- ↑ Kushinka. The Endangered Languages Project. RedLine. RedLine Language Services. Archived from the original on 3 November 2020. Retrieved on 9 October 2020.
- ↑ Instagram.