Gaa na ọdịnaya

Ụmụnne Massabki

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ụmụnne Massabki
sibling trio
Ụbọchị ọnwụ ya1860 Dezie

Ụmụnne Massabki (Arabic: الأخوة المسابكيين), Abdel Moati Massabki, Francis Massabki and Raphael Massabki bụụrụ ndị Katọlik Maronite si Damascus, ebe bụ Syria ugbua. Ụmụnne atọ a bụụrụ ụmụ Nehme Massabki.

Na ubochi iri n’ọnwa Julaị afo 1860, e gburu ụmụnne ahụ n'ihi okpukpe ha mgbe ha na-ekpe ekpere n'ime ụlọ ụka Franciscan di na Damaskọs, n'oge esemokwu obodo nke afo 1860 na Ugwu Lebanọn na Damaskọus. E chiri ha echichi ndị nsọ n’ afo 1926 ma mee ha ndị nsọ n'afọ 2024.

Usoro Ichi Ha Echichi Ndị Nsọ na Ime Ha Ndị Nsọ

[dezie | dezie ebe o si]

Pope Pius nke Iri na Otu kwupụtara ichi echichi ndị nsọ nke ụmụnne atọ ahụ n’afo 1926.

N’ubochi iri na asato n’onwa Disemba nke afo 2022, onyeisi ndị Maronite Bechara Boutros al-Rahi mara ọkwa na a ga-amata umunne Massabki ndị a dịka ndị nso na-enweghị mkpa maka ọrụ ebube n'ihi na ha bụ ndị nwụrụ n'ihi okwukwe.[1]

N’abalị mbụ n'ọnwa Julaị afo 2024, Pope Francis duziri nzukọ ndị kadinal, nke kwadoro ka a emee emume ime ha ndị nsọ nke mmadụ iri na ise, gụnyere Ụmụnne Massabki. N'Obí Ndịozi maka nzukọ ọha na eze, Kadinal Marcello Semeraro gosipụtara 'Peroratio', akụkọ banyere ndụ na ọrụ ebube nke The Massabki Brothers, n'etiti ndị ọzọ.[2]

A họpụtara ụmụnne ahụ ka ha bụrụ ndị nsọ n’ubochi iri abụọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2024 tinyere ndị nsọ iri na otu ọhụrụ.[3]

  • Ndị nwụrụ n'ihi okwukwe ha na Damaskọs

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. The Three Blessed Massabki Brothers to be named saints (en). LBCI Lebanon (18 December 2022). Retrieved on 2022-12-18.
  2. Carlo Acutis and 14 Blesseds approved for canonization - Vatican News (en). www.vaticannews.va (2024-07-01). Retrieved on 2024-07-01.
  3. Carlo Acutis and 14 Blesseds approved for canonization - Vatican News. www.vaticannews.va (2024-07-01). Retrieved on 2024-07-01.