Actors' Guild of Nigeria
| Abbreviation | AGN |
|---|---|
| Type | Trade union |
| Headquarters | National Theatre, Lagos, Nigeria |
President | Emeka Rollas |
| Website | Templeeti:Official url |
Actors' Guild of Nigeria (AGN) bụ òtù ncheanwụ nke na-achịkwa ma na-anọchite anya ihe ọbụla gbasara ndị na-eme fim na Naijiria yana mba ofesi [1]. E debara aha òtù a n'aka gọọmenti n'afọ 1998. [2] Isi ụlọ ọrụ ha dị na Suite 29, Block 2, N.C.A.C, Artiste Village, National Theatre, Iganmu - Lagos.[3] Onye isi òtù ahụ bụ Emeka Rollas onye jere ozi dị ka onye isi ya kemgbe August 22, 2017[4][5] Dịka Rollas si kwuo n'afọ 2019, AGN nwere ihe karịrị nde mmadụ abụọ debanyerela aha na steeti iri atọ na isii dị na Naijiria ma bụrụkwa òtù ndị na-eme ihe nkiri kachasị ukwuu n'Africa.[6]
Kansụl nchịkwa Mba (NEC), nke onye isi ya na-elekọta, gụnyere ndị osote onye isi isii na-anọchite anya mpaghara isii niile nke mba ahụ. Kansụl Nchịkwa Steeti (SEC) na-ahụ maka ihe omume nke mpaghara dị iche iche na steeti ọbụla nke ọ bụ onye isi oche na-eduzi mpaghara ọbụla. Dịka ebe Julaị 2024, e nwere isi steeti iri na anọ.[7][8][9]
Ndị Isi Òtù a Chịrịla
[dezie | dezie ebe o si]Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Badmus, Kayode. "Meet the most powerful kid in Nollywood", Nigerian Entertainment Today, 7 March 2016.
- ↑ About Us (en).
- ↑ namo. Home.
- ↑ "Emeka Ike Sacked, As New AGN President Emerges", P.M. News, 24 August 2017. Retrieved on 12 September 2017.
- ↑ Njoku, Benjamin. "Emeka Rollas rolls out plans to rebuild AGN", Vanguard, 30 August 2017. Retrieved on 12 September 2017.
- ↑ AGN Leadership Pay Courtesy Call On Delta State Political Bigwig, Ned Nwoko, Pledges To Support AGN Trust Fund With 10Million Naira..
- ↑ National Exco (en).
- ↑ State Exco (en).
- ↑ Fawole (2024-02-14). Actors Guild of Nigeria Appoints New Special Advisers, Dates Film Festival (en-US).