Gaa na ọdịnaya

Adamantios Korais

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Adamantios Korais or Koraïs (Greek: Ἀδαμάντιος Κοραῆς; Latin: Adamantius Coraes; French: Adamance Coray; 27 Eprel 1748 – 6 Eprel 1833) bụụrụ onye ọkammụta Grik onye a na-ekwunyere na ọ bụ ya tọrọ ntọala akwụkwọ ọgụgụ Grik dị ugbu a nakwa onye a ma ama na mmepe anya mmụta Grik. Ihe ndị o megasịrị mepere ụzọ nye Agha Nnwere Onwe Grik yana mmalite nke ụdị asụsụ Grik anyụchara nkè oma, a maara dịka Katharevousa. Encyclopædia Britannica na-ekwu na "mmetụta o nwere n'asụsụ na omenala Grik dị ugbua ka a tụnyeere nke Dante nwere na Itali yana Martin Luther na German".

Ndụ na echiche

[dezie | dezie ebe o si]

  A mụrụ Korais na Smyrna, n'afọ 1748. Nna ya Ioannis, nke sitere na Chian, bụ demogérontas na Smyrna, ọkwa yiri prokritoi nke isi ala Gris, mana ndị obodo Gris nke obodo ahụ họpụtara ya ma ndị Ottoman amanyeghị ya amanye.

Ebe obibi Korais na Amsterdam

Ọ nwere mmasị pụrụ iche na nkà ihe ọmụma, ịgụ na ide na asụsụ ma mụọ ihe nke ukwuu n'oge ọ bụ ntorobịa. Ọ gụrụ akwụkwọ na mbụ n'obodo ya, Smyrna, ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na Evangelical Greek School . [1]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ biri na Amsterdam nwa oge dị ka onye ahịa, mana n'oge na-adịghị anya o kpebiri na ọ chọrọ ịgụ akwụkwọ na mahadum. Ọ mụkwara Hibru, Dutch, French na Bekee ma e wezụga ihe ọmụma ya banyere Grik na Latịn oge ochie.

Korais gụrụ akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ ọmụmụ ọgwụ nke Mahadum Montpellier site na 1782 ruo 1787. Akwụkwọ edemede diplọma ya nke 1786 akpọrọ Pyretologiae Synopsis, ebe akwụkwọ edemede inweta nzere ọkankuzi ya nke afọ 1787 ka a kpọrọ Medicus Hippocraticus .

O mere njem gaa Paris ebe ọ ga-anọgide n'ịnụ ọkụ n'obi ya maka inweta mmụta. N'ebe ahụ, o kpebiri ịsụgharị edemede ndị Grik oge ochie ma mepụta mpịakọta iri atọ nke nsụgharị ndị ahụ, bụrụ otu n'ime ndị ọkà mmụta asụsụ Grik nke oge a na ndị na-ebipụta akwụkwọ Grik oge ochie.

Mgbe afọ 1788 gachara, ọ ga-anọ ihe ka ukwuu n'oge ndụ ya dị ka onye mba ọzọ na Paris. Dị ka onye ọkà mmụta oge ochie, mmetụta Byzantium n'ebe ndị Gris nọ mere ka Korais kaa azụ, ọ ma bụrụ onye nkatọ siri ike maka enweghị agụmakwụkwọ n'etiti ndị ụkọchukwu na okè nrubeisi ha n'okpuru Alaeze Ukwu Ottoman, ọ bụ ezie na ọ kwetara na ọ bụ Chọọchị Ọtọdọks chebere njirimara mba nke ndị Gris.

Korais kwenyere na ákụkụ ọdịda anyanwụ Europe bụ ndị nketa nke mmepeanya Gris oge ochie, nke e nyefere ndị Gris nke oge a site na agụmakwụkwọ. Tụkwasị na nke a, ọ kwadoro nweghachi na ojiji okwu a bụ "Hellene" (Έλληνας) ma ọ bụ "Graikos" (Γραικός) dị ka aha nna ndị Gris, n'ọnọdụ Romiós, nke ọ hụrụ dịka nke na-adịghị mma.

Mgbe ọ nọ na Paris, ọ hụrụ Nnwogha French. O nwetara mmetụta sitere na mgbanwe na nnwere onwe nke oge ya. Ọ nwere mmasị na Thomas Jefferson ma soro onye ọchịchị America ahụ kerịtaa echiche gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke nkà ihe ọmụma. Otu nwoke gosipụtara mmepe anya mmụta, Korais gbara ndị Gris bara ọgaranya ume imeghe ọbá akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ ọhụrụ na Gris niile. Korais kwenyere na agụmakwụkwọ ga-eme ka ọ bụghị naanị inweta nnwere onwe kamakwa nguzobe iwu kwesịrị ekwesị maka steeti Gris a tọhapụrụ ọhụrụ. O chepụtara ọchịchị onye kwuo uche ya na Gris, na-eweghachi ebube nke Golden Age nke Perikles.

Korais nwụrụ na Paris mgbe ọ dị afọ iri asatọ na anọ n'oge na-adịghị anya mgbe o bipụtachara mpịakọta mbụ nke akụkọ ndụ ya. N'afọ 1877, e bugara ozu ya na Gris ka e lie ya n'ebe ahụ.

Akwụkwọ ndị O bipụtara

[dezie | dezie ebe o si]
Ihu akwụkwọ ya "Salpisma Polemistirion" (1801)

Ihe ntinye kachasị adịgide adịgide nke Korais tinyere bụ ide akwụkwọ. Ndị nyere aka na mbipụta, na igosi ọrụ ya n'ihu ọha bụ ndị ahịa si Chios. O nwere ekele ruo mgbe ebighi ebi nye ndị ahịa a, ebe ọ bụ na ọ bụrụ na ọ bụghị ha, ọ gaara abụrụ ya ihe na-agaghị ekwe omume n'ihi adịghị ego maka ibipụta ọrụ ya. Ọrụ ndị a gụnyere mbipụta nke Strabo na Grik, ọzọ na Marcus Aurelius, nsụgharị ya nke Herodotus, nsụgharị nke Iliad, na ọrụ edemede ya bụ isi, mpịakọta iri na asaa nke "Library of Greek Literature".

Ihe odide ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya malitere site na mbipụta ya na mmalite nke narị afọ nke iri na itoolu nke Asma Polemistirion ("War Chant") na Salpisma Polemistiron ("Military Bugal Call"), na-eme emume maka ọnụnọ nke ndị agha Gris na-alụ ọgụ ha na ndị France na Ijipt. N'oge gara aga, ya na Adelphiki Didaskalia ya, bụ onyeisi Ndị Ọtọdọks nke Jerusalem nwere nghọtahie maka ịgba ndị Kraịst nọ n'okpuru Sultan ume (n'iji broshuọ okpukpe Patriki Didaskalia) ka ha kwado ndị Ottoman n'ibu agha megide ndị French "na-ekweghị na Chineke". N'aka nke ọzọ, ọ kpọrọ ndị Gris òkù ka ha lụọ ọgụ n'akụkụ ndị France, "ndị nwere ikike agha nke ndị Gris oge ochie", megide ọchịchị aka ike nke Ottoman.

N'afọ 1803, Korais gara n'ihu bipụta akụkọ ya banyere ọnọdụ mmepeanya dị ugbu a na Gris, dabere na usoro nkuzi ole na ole o nyere na Paris, na-eto njikọ dị n'etiti ịrị elu nke klas ndị ahịa ọhụrụ nke Gris na ọganihu nke mmepe anya mmụta nke oge a. N'Akwụkwọ "Gịnị ka anyị ndị Grik ga-eme n'ọnọdụ dị ugbu a?" , o dere na 1805, ọ gbalịrị ime ka ndị sonyere ya kwadoo kwa Napoleon ma pụọ n'ihe kpatara ndị òtù okpukpe Russia. Otú ọ dị, n'afọ ndị sochirinụ, ịnụ ọkụ n'obi ya maka Eze Ukwu France belatara, o mechakwara site n'ịkpọ ya 'onye ọchịchị aka ike.'

Ịpụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge a, Korais mere ọtụtụ ihe iji mee ka echiche nke Gris dịghachi ọhụụ site n'ịmepụta Ọ́bá Akwụkwọ Gris, nke a raara nye mbipụta ọhụrụ nke ụfọdụ ederede oge ochie, malite na nke Homer na 1805. N'ime afọ iri abụọ sochirinụ, ọtụtụ ndị ọzọ pụtara, na-enwe ogologo okwu mmalite nke Korais dere nke akpọrọ 'Impromptu Reflections', na echiche ya banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agụmakwụkwọ na asụsụ. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị Gris karịrị ya, ọ keere òkè dị mkpa n'ịkpụzi ihe ọmụma ọhụrụ n'etiti ndị nwere ọgụgụ isi, nke ga-ekere òkè n'ịmepụta mba ọhụrụ.

Site na mmalite nke Nnwogha Greek na 1821, o meela agadi isonye na ọgụ ahụ. Otú ọ dị, ụlọ ya na Paris ghọrọ ebe ozi dị iche iche, nzukọ dị iche iche n'etiti ndị Gris Paris na enyemaka ego. O dekwara ọtụtụ akwụkwọ ozi na-adụ ndị na-eme mgbanwe ọdụ. Na mbụ ọ bụ onye na-akwado Kapodistrias, n'ikpeazụ ọ megidere iwu ya.

Echiche banyere okpukpe

[dezie | dezie ebe o si]

Korais bụ onye Ọtọdọks nke Gris ma bụrụkwa onye nkatọ nke ọtụtụ omume nke Chọọchị Ọtọdọks. Ọ bụ onye nkatọ siri ike nke Ecumenical Patriarchate nke Constantinople, na-ewere ya dị ka ngwá ọrụ bara uru n'aka Ndị Ottoman megide nnwere onwe Gris. Ya mere, mgbe e mesịrị, ọ bụ otu n'ime ndị na-akwado Chọọchị Gris e guzobere ọhụrụ.

Ọ katọkwara ndị Mọnk, enweghị agụmakwụkwọ n'etiti ndị ụkọchukwu, na omume ndị dị ka nke "Ọkụ Nsọ". Ọ bụ onye na-akwado Nnwere onwe nke okpukpe, empiricism, rationalism na nnagide. O guzobere onwe ya na-emegide ụfọdụ echiche metaphysical nke omenala ndị Gris ma chọọ ịkpụzi usoro Ọtọdọks nke Greek gaa na ntọala okpukpe ọzọ, iji mee ka ọ nọrọ n'okpuru nkwado nke echiche na gọọmentị.

Echiche banyere asụsụ Grik

[dezie | dezie ebe o si]
Cenotaph nke Korais; Ebe ili ozu Montparnasse.

Otu n'ime ihe ndị dị ịrịba ama ọ rụzuru bụ ntinye ya n'ịhazi Asụsụ Grik nke oge a. N'oge ndụ ya, ndị Gris gbasara n'ọtụtụ ebe gburugburu Mediterenian na Europe dum, asụsụ ha na-asụ nwekwara ọtụtụ ihe ndị si mba ọzọ, dabere na mpaghara na ọdịnala obodo ha nọ. Korais tụrụ aro asụsụ a ga na-asụ nke e wepụrụ ọtụtụ ihe ndị si mba ọzọ dị otú ahụ (karịsịa Turkish, kamakwa okwu na ahịrịokwu si ọdịda anyanwụ). Ọzọkwa, e nwere ọtụtụ ụkabụilu ndị Gris na-asụ kwa ụbọchị na enweghị nkwekọrịta ọ bụla maka olumba kwesịrị ịbụ ihe ndabere maka asụsụ izugbe Greek nke oge a. N'ikpeazụ, ndị na-etinye aka na Ajụjụ Asụsụ Grik kewara nwee "ndị ochie" na ndị na-akwado asụsụ dị mfe.

Ụ́sà Korais wetara bụ ịnọ n'etiti gbasara nsogbu ndị a niile. Ọ kpochapụrụ asụsụ nke ọ na-atụ aro ịbụ asụsụ izugbe pụọ na ihe ndị ọ weere dị ka ndị si mba ọzọ ma ọ bụ ndị na-adịghị mma na ntị. Ọzọkwa, ọ tụrụ aro ka e mepụta "Katharevousa" (ụdị Grik "dị ọcha"), dabere na asụsụ ụka nke Chọọchị Ọtọdọks nke Gris, nke dị nso na Grik Koine. [citation needed] Ndị ọkà mmụta yana steeti Gris mechara nabata ụkpụrụ a. 

Mmetụta ya na usoro iwu na ikpe ikpe nke Gris

[dezie | dezie ebe o si]
Ihe oyiyi Korais na Athens (ọrụ nke Ioannis Kossos).
Ili ya n'ebe olili ozu mbụ nke Athens

Nke ọtụtụ ndị na-amaghị, Korais nwere echiche siri ike banyere otu usoro Iwu ga-esi rụọ ọrụ na ọchịchị onye kwuo uche ya (echiche nke, n'ezie, nwere mmetụta dị ukwuu site na mmepe anya mmụta French, dị nso na Montesquieu karịa Rousseau) ma gbalịa nwee mmetụta dị ukwuu, ọ bụ ezie na ọ bụghị kpọmkwem, na Iwu nke Nnwogha Greek, kamakwa, karịsịa, na Iwu ma ọ bụ Syntagma e mepụtara mgbe Nnwogha Greek gasịrị. Akụkụ a nwere ihe dị mkpa ma ọ bụrụ na mmadụ e lenye anya n'eziokwu ahụ bụ na Iwu ndị a e mere na-esote Nnwogha ahụ kabụkwa, ruo taa, ntọala nke akwụkwọ Iwu Gris na nkà ihe ọmụma nke ụkpụrụ nduzi nke usoro iwu na ikpe nke Gris gbanyere mkpọrọgwụ.

Mmetụta Korais nwere na Iwu Gris bụ n'ihi mmekọrịta onwe onye nke ya bụ onye ahụ nwere ọgụgụ isi nke ukwuu nwere n'onye Gris ọzọ ụbụrụ na-ahọkwa nkọ, onye ọkà mmụta iwu a na-anụ aha ya na mba ụwa N. I. Saripolos, onye, mgbe Nnwogha Gris gasịrị, ghọrọ nna ntọala hiwere Iwu Gris na "onye dere" akwụkwọ Iwu Gris. Ihe akaebe nke mmekọrịta a yana echiche siri ike na nke na-aga n'ihu Korais nwere banyere otu e kwesịrị iguzobe usoro iwu nke steeti ohụrụ bụ Gris, dabeere na akwụkwọ ozi mmadụ abụọ ahụ deere onwe ha, n'ime ogologo oge, na-amalite tupu Mgbanwe Gris. Akwụkwọ ozi ndị a nke na-egosipụta mmetụta onye okenye ụbụrụ na-aghọ nkọ (Korais) nwere n'ebe onye na-achọ ịbụ ọkaiwu n'oge ahụ bụ Saripolos nọ, ma dị n'ihe ndekọ nke Ọbá Akwụkwọ mba Grik, bụ ndị a chọtara ma webata n'ìhè agụmakwụkwọ, n'afọ 1996, site n'aka nwa akwụkwọ na-amụ iwu nọ na-eme nchọpụta nke Faculty of Law nke Mahadum Athens na National Academy for Constitutional Research and Public Law (nke dị nso na Mahadum nke Athens) nyere nkwado ego. E bipụtara edemede ahụ.

Ihe Ncheta Ya

[dezie | dezie ebe o si]

Ndị na-eme mgbanwe kwupụtara na Korais bụ Pater Patriae ("Pateras tis Patridos") na Nzukọ nke Atọ nke Mba na Troezen. E gosipụtara onyinyo Korais n'azụ akwụkwọ ego Grik Dp 100 nke 1978-2001. A na-akpọ ọtụtụ okporo ámá na Gris niile aha ya, ebe enwere ike ịchọta ihe ndekọ ya bụ na Korais Library dị na Chios (obodo) .

"Adamantios Korais" bụkwa aha ụgbọ mmiri na-ejikọ Alexandroupoli, Samothrace, na Lemnos. Ụgbọ mmiri ahụ, nke e wuru na 1987 na Onomichi Japan, bụ nke Zante Ferries bụbu ndị ji ya arụ ọrụ na mbụ ma Fast Ferries na-eji ya ugbu a.[2]

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]

Ịgụrụ Gawa

[dezie | dezie ebe o si]

 

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]

Templeeti:Age of EnlightenmentTempleeti:Modern Greek EnlightenmentTempleeti:Greek War of Independence