Adenike Grange

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adenike Grange
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAdenike Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụphysician, public health physician Dezie
onye were ọrụMahadum nke Lagos Dezie
Ọkwá o jiMinister of Health Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of St Andrews, St. Francis' College, Letchworth Dezie

{{Added databox


Adenike Grange bụ onye bụbu Mịnịsta na-elekọta Mịnịstịrị ahụ ike dị n'aka nke gọọmentị etiti.

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

Adenike Grange gụrụ akwụkwọ sekọndrị na Legos steeti, ma mechaa gaa St. Francis 'College,na Letchworth dị na United Kingdom. Site n'afọ 1958 ruo afọ 1964 ka ọ gụrụ maka ọgwụ na Mahadum St Andrews di na Scotland. Ọ rụrụ ọrụ na Dudley Road Hospital dị na Birmingham tupu ọ laghachite Naijiria n'afọ 1965, ebe ọ gara n'ihu na-arụ ọrụ n'ụlọ ọgwụ dị na Legos. Ọ laghachiri U.K n'afọ 1967 were bụrụ onye isi ụlọ (paediatrics) na <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Saint_Mary's_Hospital,_Manchester" rel="mw:ExtLink" title="Saint Mary's Hospital, Manchester" class="cx-link" data-linkid="37">St Mary's Hospital for children</a>, were nweta diplọma na Ahụike ụmụka n'afọ 1969. N'afọ 1971, ọ banyere na Lagos University Teaching Hospital . N’afọ 1978, ọ ghọrọ onye nkuzi na College of Medicine, Mahadum nke Lagos . Ọ ghọrọ Onye Nkuzi dị elu n'afo 1981 nakwa Prọfesọ n'afọ 1995. [1]

Adenike Grange mere ka onye ndụmọdụ nke <a href="./Ministry of Health (Nigeria)" rel="mw:WikiLink" data-linkid="44" data-cx="{&quot;adapted&quot;:false,&quot;sourceTitle&quot;:{&quot;title&quot;:&quot;Federal Ministry of Health (Nigeria)&quot;,&quot;pageprops&quot;:{&quot;wikibase_item&quot;:&quot;Q5440303&quot;},&quot;pagelanguage&quot;:&quot;en&quot;},&quot;targetFrom&quot;:&quot;mt&quot;}" class="cx-link" id="mwGw" title="Ministry of Health (Nigeria)">Mịnịstịrị</a> ahụ ike dị n'aka nke gọọmentị etiti, WHO, UNICEF, UNFPA na USAID . Ọ bụ onye ndụmọdụ WHO na mmemme Ahụike ịmụ nwa na Naijiria site n'afọ 1993 ruo n'afọ 1999. Ọ bụ onye ode akwụkwọ ihe karịrị akwụkwọ sayensị iri ise, ọ kachasị n'afọ ọsịsa na nri na-edozi ahụ ụmụaka. O jere ozi dị ka Onye isi nke International Pediatric Association. [2] N'ime ogologo ọrụ ya, a bịara mara ya dị ka olu siri ike n'ọgụ iji meziwanye ahụike nke ụmụaka. [3]

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike[dezie | dezie ebe o si]

N'ụbọchị nke 25 n'ọnwa Julaị n'afọ 2007, Adenike Grange ka a họpụtara ị bụ Mịnịsta Ahụike nke Mịnịstịrị ahụ ike dị n'aka nke gọọmentị etiti, nwanyị mbụ na-abụ Mịnịsta nke Ahụike.

N'ụbọchị nke 9 n'ọnwa Nọvemba n'afọ 2007, Prọfesọ Adenike Grange nyere Lancet Lecture na Centre for International Health & Development nke UCL. O kwuru na "E nwere izuoke n'ihe gbasara atụmatụ ihe mmụta,usoro, ngwa ọrụ, ọgwụ na usoro ọgwụgwọ iji gwọọ ọrịa ma mee ka ndụ dị ogologo, mana nke bụ eziokwu bụ na sistemụ e hiwere iji nweta ndapụta ndị a ezughi oke ma ya fọdụzie ị dị. Nke a bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ. " Ọ kọwara ọrụ na Naịjirịa iji dozie ụzọ esi e nweta ahụike ma ị ṅomi omume kachasị mma n'aka mba ndị ọzọ. Ihe ndị dị mkpa gụnyere i kpochapụ ọrịa polio, ị chịkwa ịba, i belata ọnwụ ndị nne na-amụ nwa, na i belata ogo nke ọrịa na otu ndị ọ kachasị e metụta. [4]

N'ọnwa Jenụwarị n'afọ 2008, na mmemme nke nwunye Onye isi ala Turai Umar Musa Yar'Adua bịara, Adenike Grange gwara nwanyị mbụ a ka ọ dọta uche Naijiria maka mkpa ahụike metụtara Millennium Development Goals . Ọ kpọkuru <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/National_Assembly_of_Nigeria" rel="mw:ExtLink" title="National Assembly of Nigeria" class="mw-redirect cx-link" data-linkid="65">National Assembly</a> ka ha mee ngwa ngwa i wepụta akwụkwọ iwu ahụike Naijiria, ma kpọkuo ndị nwunye nke ndị Gọvanọ Steeti ka ha mee ka iwu kwalite ọdịnma ụmụ nwanyị na ụmụaka. [5]

Igba arụkwaghị na ikpe[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Febụwarị n'afọ 2008, onye isi ala Umaru Yar'Adua nyere iwu ka e jide Adenike Grange jidere maka mmefu nke ego nde narị naira atọ nke bọjetị afọ 2007 na inye ndị ọrụ ngo ọrụ, ma nyocha ya site na Economic and Financial Crimes Commission (EFCC). O sịrị na ndị ndu ya duhiere ya. [6] A kọrọ na Onye isi ala nyere iwu ka e weghachi ego niile ndị e jighi rụọ ọrụ, mana e kwuru na ndị ọrụ ahụike na-ekeriela ya bụ ego. [7] N'ọnwa Machị n'afọ 2008, Onye isi ala Yar’adua nabatara leta arụkwaghịm nke Adenike Grange. [8]

N'ọnwa Machị nke afọ 2008, Nigerian Medical Association (NEC) tara onwe ha ụta maka ihe niile kpatara Adenike Grange jiri gbaa arụkwaghịm. Ndi NEC kwenyere i guzosi ike n'ezi ihe, ezi obi na itinye aka n'ọrụ nke Adenike Grange, ntụnye oke ya nye nlekota nke otutu nde umuaka nke Naijiria na mgbalị ya n'obere oge ya na Mịnịstịrị ahụ ike dị n'aka nke gọọmentị etiti. [9]

N’ọnwa Eprel afọ 2008, otu ụlọikpe dị elu nke dị n’Abuja nyere iwu ka a kpọchie ya n’ụlọ mkpọrọ nke Economic and Financial Crime Commission. E boro Sinetọ Iyabo Obasanjo-Bello, ada onyebubụ isi ala Olusegun Obasanjo ebubo ma ọ bịaghị n'ụlọ ikpe.

N'ọnwa Disemba nke afọ 2009, Ụlọ ikpe Mkpegharị nke nọ na https://www.ipa-world.org/, na kpere ikpe nkwekọrịta, nye iwu ka Prọfesọ Grange ghara iguzo ọzọ n'ikpe ọbụla. A gbahapụrụ ya na ikpe niile ma kachapụ ebubo niile. [10]

Ndụ mgbe ọ gbachara arụkwaghịm[dezie | dezie ebe o si]

Okanmuta Adenike Grange laghachiri n'ụzọ zuru ezu n'imezu nkwa ya iji kwalite ahụike nke ndị nne na ụmụaka ka ọ nabatara ọrụ siri ike nke ị bụ onye isi n'ụlọ ọgwụ Naijiria bụ ọpụrụiche n'ihe gbasara ụmụaka, a na-akpọ Otunba Tunwase National Pediatric Center, nke o nyere aka guzobe ma nyefee ya University College Hospital, nke Ibadan dị ka ụzọ isi kwalite ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ. O webatara ọtụtụ atụmatụ mmepe nke nyeere ụlọ ọgwụ aka itolite nke ukwuu. Otu n'ime atụmatụ ndị o webatara bụ Local Health Insurance Scheme maka ndị bi n'Ijebu bụ ndị e nweghị ike ịkwụ ụgwọ maka ezigbo nlekọta ahụike, sitekwazie na atụmatụ mkpuchi a, ọtụtụ ndị nọ n'obodo ahụ nwere ike ịnweta i nweta nlekọta nke ụlọ ọgwụ ahụ. .

Kemgbe ahụ ọ na-arụsi ọrụ ike site na Global Alliance for Vaccination.

Site n'enyemaka nke otu onye ntorobịa a ma ama na Naijiria bụkwazị onye ọkachamara n'ihe nzụlite ndị ntorobịa, Abayomi Mighty, ọ malitere AdeGrange Child Foundation, otu NGO gbara mbọ ị kwalite ọdịnma nke ndị nne na ụmụaka site na mmemme nkwado. [11]

Ebem si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Professor Adenike Grange. World Health Organization. Retrieved on 31 October 2009.
  2. Welcoming Adenike Grange and Gabriel Aduku. Nigeria Health Watch (27 July 2007). Archived from the original on 29 April 2010. Retrieved on 31 October 2009.
  3. Article: Adenike Grange – Crusading for the African Child's Health. Women & Environments International Magazine Article (1 October 2002). Retrieved on 31 October 2009.
  4. UCL Lancet Lecture: health reform in Nigeria. University College London (12 November 2007). Retrieved on 31 October 2009.
  5. Constance Ndubuisi-Enyali (29 January 2008). Turai Yar 'Adua commits to saving women and children. Development Communications Network. Retrieved on 31 October 2009.
  6. Stanley Nkwazema, Kingsley Nwezeh (3 March 2008). Yar'Adua Moves Against Health Minister. This Day. Archived from the original on 27 August 2008. Retrieved on 31 October 2009.
  7. Ben Agande and Inalegwu Shuaibu (26 March 2008). Health Ministers Quit. The Vanguard. Retrieved on 31 October 2009.
  8. Daniel Idonor and Sylvester Akor (26 March 2008). Fired! Yar'Adua Sacks Health Minister Over N300m Scam. Daily Champion. Retrieved on 31 October 2009.
  9. COMMUNIQUÉ OF THE EMERGENCY NATIONAL EXECUTIVE COUNCIL MEETING OF THE NIGERIAN MEDICAL ASSOCIATION (NMA) HELD AT PARKVIEW HOTEL, ABUJA ON 29TH MARCH, 2008. Nigerian Medical Association. Archived from the original on 23 July 2008. Retrieved on 31 October 2009.
  10. Ise-Oluwa Ige (11 December 2009). N300m scam: Appeal Court acquits ex-Health Minister, Grange. The Daily Vanguard. Retrieved on 11 December 2009.
  11. AZOMA CHIKWE (3 January 2012). OTNPC handed over to UCH. NFB NEWS. Retrieved on 1 May 2014.