Adesuwa Onyenokwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adesuwa Onyenokwe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha ọmụmụAdesuwa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1963 Dezie
Ebe ọmụmụIbadan Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ Dezie
ụdị ọrụ yaokoo akuko, Odee akwụkwọ, motivational speaker, Onye nkwusa Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Obafemi Awolowo Dezie
ogo mmụtaBachelor of Arts, nzere masters Dezie

Adesuwa Onyenokwe (a mụrụ n’ụbọchị nke asatọ n'ọnwa Ọgọst n’afọ 1963 n’Ibadan) bụ Onye na- eme ihe onyonyo na Naijiria. Ọ bụ onye na-emebu ihe nkiri na NTA tupu ọ ghọọ onye nchịkọta akụkọ nke magaziini akụkọ "Todays Woman". Ọ bụ onye na-ekwu okwu ihe mmemme nke mmemme ahụ ''Seriously Speaking'' nke bịara na onyonyo n'afọ 2014. Ọ bụ onye na-ekwu okwu agbamume na onye na-enye ndụmọdụ gbasara ịkọwapụta okwu, bi na Legos na Naijiria.

Mmalite ndu ya na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Adesuwa Onyenokwe n'ụbọchị nke 8 n'ọnwa Ọgọst,n'afọ 1963 na Ibadan, dị n'Oyo steeti,na Naijiria nke otu ezinụlọ ji ụmụ 11. Ọ bụ nwa nke ise. [1] Ọ gara ụlọ akwụkwọ Emotan Preparatory, na Idia Koleji, dịcha na Benin City,n'Edo Steeti . O mechara gaa mụọ ihe nkiri na Mahadum nke Obafemi Awolowo (OAU) na Ile-Ife, dị n'Osun Steeti, na Naijiria. Mgbe ọ nwtechara nzere mbụ ya na OAU, ọ gara n’ihu i nweta nzere nke Masta n'asụsụ nka na Mahadum nke Ibadan . Mgbe ọ nọ na nzere nke mbụ ya, ọ bụ otu n'ime ndị nwere isi ọma Prọfesọ Wole Soyinka, onye Nobel Laureate kuziri. [2] [3] [4] Ọ lụrụ Ikechukwu Onyenokwe onye injinia na onye ndụmọdụ nchịkọta si Mpaghara Gọọmenti Ndokwa East nke Delta Steeti n'afọ 1988. Di na nwunye a nwere umu isii. [5] [6] [7]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Nna ya chọburu ka ọ bụrụ onye ọka ikpe mana Adesuwa nọ na-arọ nrọ ihe onyonyo mgbe niile site na nwata. [8] Nzute mbụ Adesuwa Onyenokwe zutere mgbasa ozi bụ mgbe ndị National Youth Service Corp (NYSC) zigara ya ka ọ jee ozi na Nigerian Television Authority (NTA) na Sokoto Steeti n'afọ 1983. Onye isi nke ngalaba ihe ngosi nke ọdụ ahụ n'oge ahụ, Maazị Danladi Bako, họpụtara ya ka ọ gosi usoro mmemme ụmụaka n'ihe onyonyo. Nke ahụ bụ nke mbụ ọ pụtara dị ka onye ngosi n'onyonyo. Mgbe ọ fechara ala nna ya n'afọ 1984, ọ hapụrụ Sokoto Steeti ma nara ọrụ dịka onye nkuzi na Akenzua II Grammar School,dị na Benin, n'Edo Steeti. N'afọ 1985, ọ laghachiri na mgbasa ozi mgbe ọ kwetere ọrụ na Bendel Broadcasting Service n'oge ahụ nke mechara gbanwee kpọwa ya Edo Broadcasting Service (EBS). [9] [10] Mgbe ọ lụrụ di n'afọ 1988, ọ hapụrụ obodo Benin iji binyere di ya bi na Legos. Ọ gbara arụkwaghịm n'Edo Broadcasting Service ma banye na Nigerian Television Authority (NTA) na Legos [11] [12]

O gosipụtara ọtụtụ mmemme na NTA. Ọ bụ onye ngosi ihe ngosi magaziini NTA a na-akpọ Newsline. A na-eme mmemme ahụ ụbọchị Sọnde ọbụla site n'elekere itoolu nke abalị n’ọnọdụ nta akụkọ Network kwa ụbọchị. Otu n'ime ọrụ ya na-agaghị echefu echefu na NTA bụ mgbe e kenyere ya ọrụ ileta nleta Katọlik Pontiff, Pope John Paul II na Naijiria n'afọ 1998. Ọ lara ezumike nká mgbe ọ rụchara ọrụ afọ 15 na NTA. [13] N'afọ 2000, o bidoro i mepụta ihe onyonyo nke ọkara awa were gosipụta onwe ya na TV nke akpọrọ '' Today’s Woman with Adesuwa ''. Ndị ọrụ ochichi telivishọn nke Naijiria (NTA) nyere ya oge na ohere ị malite mmemme ahụ. Mmemme a were afọ iri tupu ọ kwụsị. [14]

N’afọ 2007, Adesua Oyenokwe weputara Today’s Women magazine, nke na-ede maka ndụ ụmụ nwanyị. Ọ bụ onye mbipụta na onye isi-akwụkwọ akụkọ nke akwụkwọ akụkọ ahụ. Ọ bụkwa onye nnọchi anya ihe nkiri onyonyo: "TW Conversations," nke a na-egosi na Africa Magic nke DSTV. [15] Ọ haziri ma kwado mkparịta ụka onye isi ala nke Naijiria Goodluck Ebele Jonathan n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2015. Ọ na-arụkwa ọrụ ngosi nke ọtụtụ ihe emumendị ama ama na Naịjirịa. [16] Adesuwa bidoro ihe ngosi onyonyo ọzọ, Seriously Speaking n'ọnwa Julaị, n'afọ 2014. E mere ihe nkiri a na Channels TV ma nwekwaa mkparịtaụka ogologo oge nke ndị ama ama, ọnụ ọgụgụ ọha na eze na ndị ọbịa ama ama. [17] [18] [19] N’abali iri n’onwa Ọgọst nke afọ 2016, Adesua Onyenokwe weputara emume nke usoro nke VLOG ya bu ‘Speaking my mind with Adesuwa’. Usoro izizi nke VLOG bụ ka a kpọrọ 'Identity' ebe ọ tụlere etu ahụmịhe na mbido nke Naijiria nwere ike isi kọwaa ụmụ amaala ya n'ụzọ pụrụ iche karịa ka a na-eche. E mere emume a iji mee ncheta afọ iri ise na atọ ya. [20] [21] Ọ bụ ndị nwe ya bụ Multichoice Nigeria họpụtara ya,ndị nwe DSTV na GOtv, ka ọ rụọ ọrụ nke Aunty onye bụ isi na ihe nkiri onyonyo ya bụ Ultimate Love, nke na-amalite n'ụbọchị nke 9 n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2020 n'elekere 7:30 nke abalị WAT na DStv na GOtv. [22] [23] [24] ọ bụ onye ọnụ n’eru n'okwu n'ihe gbasara nmekorita, na ahụ ike na Naijiria. [25]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://punchng.com/my-husband-feels-proud-whenever-men-admire-me-adesuwa-onyenokwe/
  2. https://www.vanguardngr.com/2015/05/adesuwa-onyenokwe-empowering-women-through-the-power-of-the-media/
  3. https://punchng.com/my-husband-feels-proud-whenever-men-admire-me-adesuwa-onyenokwe/
  4. https://mybiohub.com/2016/06/adesuwa-onyenokwe-biography-family-age.html/
  5. https://ynaija.com/7-reasons-adesua-onyenokwe-icon-generation/
  6. <https://mybiohub.com/2016/06/adesuwa-onyenokwe-biography-family-age.html/
  7. https://www.vanguardngr.com/2015/05/adesuwa-onyenokwe-empowering-women-through-the-power-of-the-media/
  8. https://punchng.com/my-husband-feels-proud-whenever-men-admire-me-adesuwa-onyenokwe/
  9. https://www.vanguardngr.com/2015/05/adesuwa-onyenokwe-empowering-women-through-the-power-of-the-media/
  10. https://punchng.com/my-husband-feels-proud-whenever-men-admire-me-adesuwa-onyenokwe/
  11. https://www.vanguardngr.com/2015/05/adesuwa-onyenokwe-empowering-women-through-the-power-of-the-media/
  12. https://punchng.com/my-husband-feels-proud-whenever-men-admire-me-adesuwa-onyenokwe/
  13. https://ynaija.com/7-reasons-adesua-onyenokwe-icon-generation/
  14. https://www.vanguardngr.com/2015/05/adesuwa-onyenokwe-empowering-women-through-the-power-of-the-media/
  15. https://ynaija.com/7-reasons-adesua-onyenokwe-icon-generation/
  16. https://www.vanguardngr.com/2015/05/adesuwa-onyenokwe-empowering-women-through-the-power-of-the-media/
  17. https://www.bellanaija.com/tag/adesuwa-onyenokwe/
  18. http://encomium.ng/tag/adesuwa-onyenokwe/
  19. https://www.vanguardngr.com/2015/05/adesuwa-onyenokwe-empowering-women-through-the-power-of-the-media/
  20. https://leadingladiesafrica.org/adesuwa-onyenokwe-launches-vlog-series-watch/
  21. https://mybiohub.com/2016/06/adesuwa-onyenokwe-biography-family-age.html/
  22. https://theeagleonline.com.ng/adesuwa-onyenokwe-unveiled-as-aunty-on-ultimate-love/
  23. https://stories.showmax.com/5-things-you-should-know-aunty-on-ultimate-love/
  24. https://www.thisdaylive.com/index.php/2020/04/17/adesuwa-onyenokwe-kachis-patience-rosies-honesty-made-them-winners-of-ultimate-love/
  25. Archive copy. Archived from the original on 2020-02-11. Retrieved on 2020-11-06.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Today's Woman.