Afdhere Jama
Afdhere Jama (amụrụ n'afọ 1980) bụ onye Somalia bụ onye odee bi n'America na onye na-eme ihe nkiri.
A mụrụ Jama ma zụlite ya na Somalia. Ọ kwagara America mgbe ọ dị afọ iri na ụma. N'etiti afọ 2000 na 2010, ọ bụ onye nchịkọta akụkọ nke Huriyah. Jama bụ nwoke nwanyị na onye Alakụba.
N'ọnwa Juun afọ 2016, mgbe a gbachara egbe na Orlando, e kesara otu isiokwu Jama dere na 2014 banyere ndị Alakụba LGBT na oghere mgbasa ozi ikuku.[1]
Huriyah
[dezie | dezie ebe o si]Jama bụụrụ onye isi nchịkọta akụkọ nke Huriyah[2] (Arabic: حريةرية, "freedom"), otu akwụkwọ mgbasa ozi ndị <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/LGBT" rel="mw:ExtLink" title="LGBT" class="mw-redirect cx-link" data-linkid="44">LGBT</a> Alakuba bipụtara n'etiti afọ 2000 na 2010. Isi ụlọ ọrụ ha dịịrị na San Francisco, California. Huriyah nọọrọ na-eji okwu njirimara bụ "Queer Muslim Magazine".
E bipụtara magazin ahụ na mbụ n'asụsụ Arabic ma malite ya n'asụsụ Bekee n'afọ 2002, na-elekwasị anya na okwu ndị gbasara LGBT na nke Ndị Alakụba na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nka, na ihe ime mmụọ. Ọ nọ na-enwe nnukwu ajụjụ ọnụ kwa ọnwa, nke Jama duziri, gụnyere Daayiee Abdullah na Faisal Alam.
Echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]N'afọ 2006, Jama kwuru, sị, "Ihe dị iche n;etiti mụ na ọtụtụ ndị Alakụba bụ nkwenye na ala nna ndị Juu bụ ọganihu dị mkpa nye anyị niile, ọkachasị onye nọ n'ala nna nna ha n'Izrel". Ọ gara n'ihu kwuo, "Ndị Alakụba nọ na United States ga-ekpebi ma ha ga-ahụ otu ndị dị ka Hamas na Hizbullah dị ka mmegide ziri ezi ma ọ bụ ihe kpatara nsogbu ndị Alakụba na-enwe na mpaghara ahụ".
Ihe nkiri Ndị O Mere
[dezie | dezie ebe o si]- Hearts (2015)
- Angelenos (2013)
- Bits (2012)
- Over the Rainbow (2011) (segment "Carlita")
- Apart (2010)
- From Here To Timbuktu (2010) (segment "Trio")
- Rebound (2009)
- Ani (2009)
- Berlinsomnia (2008)
- Shukaansi (2007)
Akwụkwọ Ndị O Dere
[dezie | dezie ebe o si]- Being Queer and Somali: LGBT Somalis At Home and Abroad (2015)[3]
- Queer Jihad: LGBT Muslims on Coming Out, Activism, and the Faith (2013)
- Illegal Citizens: Queer Lives in the Muslim World [4]
- At Noonday with the Gods of Somalia (2004)
Ihe e deturu
[dezie | dezie ebe o si]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]Njikọ Mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "Counterview: It's time to stop blaming British imperialism for India's prejudice against gay people". Scroll.in (in Bekee ndị America). 22 June 2016. Archived from the original on 2016-06-23. Retrieved 2021-04-23.
- ↑ "Irans Anti-Gay Pogrom". In These Times (in Bekee). 4 January 2006. Retrieved 2020-11-19.
- ↑ Jama, Afdhere (2015). Being Queer and Somali. Oracle Releasing. ISBN 9780983716198. Retrieved April 19, 2021.
- ↑ Jama, Afdhere (2008). Illegal Citizens: Queer Lives in the Muslim World. Salaam Press. ISBN 9780980013887. Retrieved April 19, 2021.
- CS1 Bekee ndị America-language sources (en-us)
- Articles containing Arabic-language text
- CS1 Bekee-language sources (en)
- Articles with ISNI identifiers
- Articles with VIAF identifiers
- Articles with BNF identifiers
- Articles with GND identifiers
- Articles with J9U identifiers
- Articles with LCCN identifiers
- Articles with NTA identifiers
- Articles with SUDOC identifiers
- Articles with WorldCat-VIAF identifiers
- Mmadụ ndi di ndụ
- Articles with hCards