Afrijet Airlines

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Afrijet Airlines
airline
Oge/afọ mmalite1999 Dezie
aha gọọmentiAfrijet Airlines Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaLagos Dezie
ọdụ ụgbọ eluMurtala Muhammed International Airport Dezie
Isi ọgbakaAfrijet Airlines Dezie
nwere enyemakaAfrijet Airlines Dezie
ọdịdị isi ụlọ ọrụIkeja Dezie
asụsụ eji dee ọrụBekee Dezie
dissolved, abolished or demolished date2009 Dezie
webụsaịtịhttp://www.flyafrijet.com/ Dezie
IATA airline designator6F Dezie
ICAO airline designatorFRJ Dezie

Afrijet Airlines bụ ụlọ ọrụ ụgbọ elu nke nwere isi ụlọ ọrụ ya na NAHCO Building na ala nke Murtala Muhammed International Airport na Ikeja, Nigeria.[1] E guzobere ya nakwa ọ malitere ọrụ ibu na mpaghara n'afọ 1999. Isi ụlọ ọrụ ya bụ Murtala Mohammed International Airport.[2]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Tinyere ịrụ ọrụ ibu site na Naijiria, ụlọ ọrụ ụgbọelu ahụ na-arụkwa ọrụ ụgbọ elu nchebe dị elu na Democratic Republic of Congo. Ụlọ ọrụ ụgbọelu ahụ esila n'ọfịs ya na Murtala Mohammed International Airport kwaga n'isi ụlọ ọrụ ya na Opebi, Lagos. Ọ ka na-elekọta ụlọ ahịa mmezi ụgbọ elu na ụlọ ọrụ Elite Aviation.

Gọọmentị Naịjirịa setịpụrụ oge a kara aka n'April 30, 2007 maka ụlọ ọrụ ụgbọ elu niile na-arụ ọrụ na mba ahụ iji mee ndozighari ma ọ bụ ha akwusi ọrụ, na mgbalị iji hụ na ọrụ na nchekwa ka mma. Ụlọ ọrụ ụgbọelu ahụ mezuru ụkpụrụ nke Nigerian Civil Aviation Authority n'ihe gbasara ndozighari ụlọọrụ ma debanye aha ya maka ọrụ. Otú ọ dị, na 2009, e mechiri Afrijet Airlines.

Ụgbọ[dezie | dezie ebe o si]

Ụgbọelu Afrijet Airlines gụnyere ụgbọelu ndị a (dị ka nke 20 Ọktoba 2009):

  • 3 MD-82

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Directory: World Airlines." Flight International. 16–22 March 2004. 53.
  2. "Directory: World Airlines", Flight International, 2007-03-27, p. 51.