Agata Ciabattoni
Agata Ciabattoni bụ onye Itali na-ahụ maka mgbakọ na mwepụ nke na-ahụkarị maka lọjik na-abụghị nke oge ochie. Ọ bụ ọkammụta zuru oke na Institute of Logic and Computation nke Faculty of Informatics [1] na Mahadum Teknụzụ nke Vienna (TU Wien), na onye so n'isi oche nke Vienna Center for Logic and Algorithms nke TU Wien (VCLA). [2] [3]
Agụmakwụkwọ na ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ciabattoni bụ onye Ripatransone. Ọ gụrụ sayensị kọmputa na Mahadum Bologna, wee gụchaa nweta nzere Ph.D. ya n'afọ 2000 na Mahadum Milan .[2] Daniele Mundici lekọtara edemede ya, Proof-theory in many-valued logics.[4]
Ọ kwagara Vienna n'afọ 2000 site na nkwado nke EU Marie Curie Fellowship, na n'afọ 2007, ọ nwetara ikike ya na TU Wien . [2] Ọ nọgidere na-arụkọ ọrụ yana TU Wien, dị ka prọfesọ na ngalaba nke informatics. [5] Ọ na-ejekwa ozi dị ka onye isi oche nke usoro nkuzi Collegium Logicum maka Kurt Gödel Society.[6]
Ihe Ntinye ya Ga
[dezie | dezie ebe o si]Otu n'ime ọrụ Ciabattoni na TU Wien gụnyere iji usoro mgbakọ na mwepụ mee ka arụmụka omume dị na Vedas, òtù ihe odide dị nsọ nke India. [7]
Nkwanye Ùgwù
[dezie | dezie ebe o si]N'afọ 2011, Ciabattoni ritere ihe nrite Start-Preis nke Austrian Science Fund, naanị nwanyị ritere ihe nrite ahụ n'afọ ahụ.[2][8]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Faculty of Informatics, TU Wien (13 January 2017). Retrieved on 20 April 2020.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 "Eine logische Klasse für sich", Der Standard, 28 June 2011
- ↑ Weltrekord: Größtes menschliches Sortiernetzwerk in Wien. BMK Infothek: Bundesministerium für Klimaschutz, Umwelt, Energie, Mobilität, Innovation und Technologie (25 September 2019). Retrieved on 20 April 2020.
- ↑ Templeeti:Mathgenealogy
- ↑ Theory and Logic Group Staff, Faculty of Informatics, TU Wien, retrieved 10 December 2018
- ↑ Organization, Kurt Gödel Society, retrieved 10 December 2018
- ↑ Indian Sacred Texts and the Logic of Computer Ethics, TU Wien, 29 January 2018, retrieved 10 December 2018
- ↑ START-Preis 2011 für Agata Ciabattoni, TU Wien, retrieved 10 December 2018
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- Ebe obibi
- Agata Ciabattonimbipụta ndị edepụtara site naOnye Ọkà mmụta Google