Gaa na ọdịnaya

Agathe-Pauline Caylac nke Caylan

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Agathe-Pauline Caylac nke Caylan
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịFrance Dezie
Aha ezinụlọ yaCaylac, de Caylan Dezie
Aha pseudonymMme la comtesse de Bradi, Comtesse de B…, Pauline de B **** Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Mee 1782 Dezie
Ebe ọmụmụParis Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya7 Mee 1847 Dezie
Ebe ọ nwụrụParis Dezie
NwaMarie de L'Épinay Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench Dezie
Ọrụ ọ na-arụodee akwụkwọ Dezie
Kọwara na URLhttps://archive.org/details/DuplessyTresorLitteraireDesJeunesPersonnes/page/n283/, https://archive.org/details/biographiedeshom0301sarr/page/254/, https://gallica.bnf.fr/ark:/12148/bpt6k2093918, https://gallica.bnf.fr/ark:/12148/bpt6k109084x, https://fr.wikisource.org/wiki/Les_Femmes_c%C3%A9l%C3%A8bres_contemporaines_fran%C3%A7aises/Bradi Dezie
Ikike nwebiisinka dị ka onye okikecopyrights on works have expired Dezie

Agathe-Pauline Caylac de Caylan, Comtesse de Bradi (1 Mee 1782 - 7 Mee 1847) bụ onye odee akwụkwọ nke mba French nke nyere aka na akwụkwọ akụkọ, mepụtara ọmụmụ akụkọ ihe mere eme nke Corsica ma dee akwụkwọ maka ndị na-eto eto.

Akụkọ ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Caylac de Ceylan na 1 Mee afo 1782 na mba Paris, France . [1][2] Nna ya Guillaume Caylac de Ceylan bụ Knight nke Saint-Louis na kwa onyeisi ndị agha ịnyịnya nke sitere na Basque.[3] Nne ya bụ Bonne-Mille-Claude Caylac de Ceylan (née de Newer) si Sweden.[3][4]

Caylac de Ceylan lụrụ onye bụ isi obodo Corsican mgbe ọ dị afọ iri na asaa. [5] [6][7] Ọ sooro di ya gaa mba Ịtali e merụọ di ya ahụ site na shrapnel nke Siege of Genoa ma ọ fọrọ nke nta ka ọ nwụọ n'ihi agụụ.[5][6] Mgbe ọ ghọsịrị nne nke ụmụ atọ, Caylac de Ceylan laghachiri France, biri na Château de Rebrechien, nso Orléans.[4][5]

Caylac de Ceylan bipụtara akwụkwọ gbasara akụkọ ihe mere eme nke Corsica, nke a jụrụ mgbe ọdịda Napoleon gasịrị.[7] N'afọ 1826, o bipụtara nkatọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe nke echiche nke onye odee akwụkwọ nke ndi ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndi François Dominique de Reynaud, Comte de Montlosier, nke Vatican City nabatara nke ọma mana ọ mere ka ndị Liberals kpọọ ya onye ara, onye nzuzu Ndị Jesuit.[5]

Caylac de Ceylan bụ onye nyere aka na magazin ejiji, Journal des dames et des modes nke site na 1818, [4] na-ede banyere omume na ụkpụrụ omume. [8] O dekwara akwụkwọ maka ndị na-eto eto, nke ndi gụnyere akwụkwọ akụkọ dị mkpirikpi La fille spectre (1833), nke a sụgharịrị n'asụsụ Bekee dị ka The Little Dead Woman (1836). [2]

Joseph Duplessy dere banyere Caylac de Ceylan na "ihe niile nke sitere na mkpịsị akwụkwọ ya bụ ihe nke a na-amata site na ịdị elu nke echiche ya, ịdị elu nke metụtara ya, ihe nke amara nke ụdị ya". [6]

Na mgbakwunye na ide ihe, Caylac de Ceylan nwere ụlọ akwụkwọ ndị oké ozu. [8] onye nede akwụkwọ akụkọ na onye odee na-ede akwụkwọ gbasara agụmakwụkwọ bụ Stéphanie Félicité, Comtesse de Genlis mere ya enyi.[4][5]

Caylac de Ceylan nwụrụ n'abalị 7 Mee n'afo 1847 na mba Paris, France, mgbe ọ dị afọ 65.[2] Nwa ya nwanyị Marie de L'Épinay ghọkwara onye edemede.[4][8]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Bradi, Agathe Pauline Caylac de Ceylan. CERL Thesaurus. Retrieved on 2026-04-21.
  2. 1 2 3 Chronological Bibliography: Comtesse de Bradi. The Internet Speculative Fiction Database. Retrieved on 2026-04-21.
  3. 1 2 de Montferrand (1843). "Mme La comtesse de Bradi", Les Femmes célèbres contemporaines françaises (in fr), 49-54. 
  4. 1 2 3 4 5 Bradi, Agathe-Pauline Caylac de Ceylan. SHE WROTE. Retrieved on 2026-04-21.
  5. 1 2 3 4 5 Sarrut (1835). Biographie des hommes du jour industriels,--conseillers-d'État,--artistes,--chambellans,--députés,--prêtres,--militaires,--écrivains,--rois,--diplomates,--pairs,--gens de justice,--princes,--espions fameux,--savans., Boston Public Library (in fr), Paris : H. Krabe, 254. Sarrut, Germain; Saint-Edme, Théodore Bourg (1835). Biographie des hommes du jour industriels,--conseillers-d'État,--artistes,--chambellans,--députés,--prêtres,--militaires,--écrivains,--rois,--diplomates,--pairs,--gens de justice,--princes,--espions fameux,--savans (in French). Boston Public Library. Paris : H. Krabe. p. 254.
  6. 1 2 3 Duplessy (1862). Trésor littéraire des jeunes personnes (in fr), 277. Duplessy, Joseph (1862). Trésor littéraire des jeunes personnes (in French). p. 277.
  7. 1 2 Comtesse Agathe-Pauline Caylac de Ceylan de Bradi. Babelio. Archived from the original on 2025-08-06. Retrieved on 2026-04-21.. Babelio. Retrieved 21 April 2026.
  8. 1 2 3 L’ÉPINAY (Marie de) 1801-1864 (fr). Theatre-documentation. Retrieved on 2026-04-21.

Ịgụ ihe ọzọ

[dezie | dezie ebe o si]
  • [Ihe e dere n'ala ala peeji] (1836) Biographie des femmes auteurs contemporaines françaises / avec portraits dessinés de selon nature par M. Jules Boilly; et sous la dire. nke Maazị Alfred de Montferrand dere. peeji nke 47.