Gaa na ọdịnaya

Agnès Jaoui

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Agnès Jaoui
Born
Antony, France
Alma materThéâtre Nanterre-Amandiers
OccupationOnye ome ihe nkiri, onye na-ede ihe nkiri, onye nduzi ihe nkiri, onye ọbụ abụ
Years active1983–present
PartnerJean-Pierre Bacri (1987Templeeti:Nbnd2012)
Children2

Agnès Jaoui (amụrụ na 19 Ọktoba 1964) bụ onye France bụ onye ome ihe nkiri, onye na-ede ihe nkiri, onye nduzi ihe nkiri na onye ọbụ abụ.[1][2]

Jaoui enwetala ihe nrite César Awards isii,[3] ihe nrite Lumière Awards atọ,[4] yana ihe nrite Best Screenplay Award na Cannes Film Festival.[5] O nwetakwara ọtụtụ ihe nrite ndị ọzọ na nhọpụta, gụnyere nhọpụta maka Academy Award for Best Foreign Language Film.[6]

Ndụ na ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Jaoui na Antony, Hauts-de-Seine, ma ọ bụ onye sitere na agbụrụ Tunisian Jewish descent.[7] Ọ bụ nwa Hubert Jaoui na Gyza Jaoui, ndị abụọ bụ ndị ode akwụkwọ.[7] Ha kwagara Paris mgbe ọ dị afọ 8. Ọ malitere ihe nkiri (theatre) mgbe ọ nọ na ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Lycée Henri-IV na Paris.[7] Ọ banyere na Cours Florent mgbe ọ dị afọ 15.[7] Patrice Chéreau, onye nduzi nke Théâtre des Amandiers na Nanterre ebe ọ malitere ịga klas ihe nkiri na 1984, nyere ya ọrụ na fim Hôtel de France na 1987. N'otu afọ ahụ, ọ pụtara na egwuregwu Harold Pinter L'anniversaire na Jean-Pierre Bacri, onye mechara bụrụ onye ọrụ ibe na onye mmekọ ya mgbe e mesịrị.[8]

Jaoui na Bacri dere egwuregwu Cuisine et dépendances, nke Philippe Muyl gbanwere ka ọ bụrụ fim na 1992. Na 1993, onye nduzi Alain Resnais jụrụ ha ka ha mee ntụgharị (adaptation) nke egwuregwu akụkụ asatọ nke Alan Ayckbourn Intimate Exchanges, nke ghọrọ fim nwere akụkụ abụọ Smoking/No Smoking. Fim a nke na-egosi echiche banyere free will na destiny meriri César Award for Best Original Screenplay or Adaptation na 1994. Na 1996, ha nwetara ihe ịga nke ọma ka ukwuu na mmegharị nke Cédric Klapisch nke egwuregwu ha Family Resemblances (Un air de famille), nke gosiri ikike ha ileba anya ma kọwaa ndụ kwa ụbọchị, yana ịkatọ ụkpụrụ ọha site na ọchị na okwu dị ilu. Ha meriri ọzọ César Award for Best Original Screenplay or Adaptation na 1997, n'otu afọ ahụ ha soro Resnais rụọ ọrụ ọzọ na Same Old Song (On connaît la chanson), nke ha dere ma mee. Ha meriri César nke atọ maka Best Original Screenplay or Adaptation, ma Jaoui meriri César mbụ ya maka Best Supporting Actress.

Jaoui duziri fim mbụ ya, The Taste of Others (Le Goût des autres, 2000, nke ya na Bacri dere), nke na-ajụ ajụjụ gbasara njirimara mmekọrịta na omenala. Fim ahụ ghọrọ nnukwu ihe ịga nke ọma na France ma dọta nde mmadụ 4 ndị na-ekiri ya. Ọ merikwara César Awards 4 na 2001 gụnyere Best Film na César Award for Best Original Screenplay or Adaptation, ma bụrụkwa onye a họpụtara maka Academy Award for Best Foreign Language Film. Na 2004, fim nke abụọ Jaoui dịka onye nduzi, Look at Me (Comme une image), nke ya na Bacri dere, a họpụtara ya maka Cannes Festival ma merie ihe nrite maka Best Screenplay Award (Cannes Film Festival). Ọ pụtara na fim ikpeazụ nke Richard Dembo, La maison de Nina (2005) wee tụgharịa uche ya na egwu, wepụta album Latin ya Canta (2006). Ọ laghachiri na sinima na 2008 na Let's Talk About the Rain (Parlez-moi de la pluie), ya na onye na-eme ọchị French Jamel Debbouze na ọrụ dị iche na nke ọ na-emekarị.

Na 2012, Jaoui duziri Under the Rainbow (Au bout du conte), nke ya na Bacri dere. Ọ na-enyocha ọtụtụ akụkọ ifo dịka Cinderella, Snow White, na Little Red Riding Hood. Ọ natara otuto site n'aka ndị nkatọ na ndị na-ekiri maka mmalite na ọchị dị na ederede na mkparịta ụka.[9]

Jaoui mụrụ egwu na conservatoire mgbe ọ dị afọ 17, mana ọ malitere ọrụ ya dịka onye na-abụ abụ naanị na 2006 mgbe e wepụtara album mbụ ya Canta. Ọ jikọtara ụdị egwu Latin dị iche iche (Latin music), dịka flamenco, bolero, na bossa, ma na-abụ naanị n'asụsụ Spanish na Portuguese.[10] Na 2007, o meriri onyinye Victoire de la Musique maka "best traditional music album".

Album nke abụọ Jaoui, Dans Mon Pays, wepụtara na 2009. Ọ gụnyekwara ụda Latin na egwu e dere n’asụsụ Spanish na Portuguese, ewezuga egwu abụọ n’asụsụ French.[11]

Na November 2024, Jaoui duziri mmalite dị ụkọ nke opera Baldassare Galuppi nke 1762 L'uomo femina na Opéra de Dijon, nke mesịrị kwaga na Opéra Royal du Château de Versailles.[12]

Ndụ onwe

[dezie | dezie ebe o si]
Jaoui na Jean-Pierre Bacri na 2013 na mmalite nke Au bout du conte.

Jaoui bụ nwa nwanyị Gyza Jaoui; onye bụ onye ọsụ ụzọ n’ihe a na-akpọ transactional analysis, ụdị psychotherapy nke Eric Berne malitere. Jaoui nwere nwanne nwoke, Laurent Jaoui [fr], onye bụkwa onye na-ede ihe nkiri na onye nduzi.

Jaoui nọ na mmekọrịta ịhụnanya na Jean-Pierre Bacri site na 1987 ruo 2012.[8] Mgbe ha kewasịrị, ha abụọ gara n’ihu ịnọ n’udo ma nọgidekwa na-arụkọ ọrụ ọnụ.[13][14]

Jaoui kuchiri ụmụ abụọ si Brazil nakweere (adopt) na 2012.[15]

Jaoui bụ onye otu 50/50 collective, nke na-achọ ịkwalite nha anya nwoke na nwanyị na ịdị iche iche n’ụlọ ọrụ ihe nkiri.[16]

Ụfọdụ ndị ezinụlọ Jaoui, n’akụkụ nna ya,bụ ndị atoro ma gbụo n’oge Hamas October 7 attacks.[17]

Ihe nkiri

[dezie | dezie ebe o si]

Dịka onye na-eme fim

[dezie | dezie ebe o si]
Year English Title Original Title Notes
2000 The Taste of Others Le goût des autres Ya na Jean-Pierre Bacri sọrọ were dee ya
2004 Look at Me Comme une image
2008 Let It Rain / Let's Talk About the Rain Parlez-moi de la pluie
2013 Under the Rainbow Au bout du conte
2018 Place publique [18][19]
2026 Crescendo L'Objet du Délit

Naanị onye edemede

[dezie | dezie ebe o si]
Year English Title Original Title Notes
1993 Cuisine et Dépendances
Smoking/No Smoking Ya na Jean-Pierre Bacri sọrọ were dee ya
1996 Family Resemblances Un air de famille Ya na Cédric Klapisch na Jean-Pierre Bacri sọrọ were dee ya
1997 Same Old Song On connaît la chanson Ya na Jean-Pierre Bacri sọrọ were dee ya
2014 The Easy Way Out L'Art de la fugue Ya na Brice Cauvin na Raphaëlle Desplechin sọrọ were dee ya

Dịka onye ome ihe nkiri

[dezie | dezie ebe o si]
YearEnglish titleOriginal titleRoleNotes
1983 Le FauconSandra
1987 Hôtel de FranceMadame Bouguereau
L'AmoureuseAgathe
1990 IvanovBabakina
1991 Canti
1993 Cuisine et DépendancesCharlotte
1996 Family ResemblancesUn air de familleBetty Ménard
1997 Le DéménagementClaire
Same Old SongOn connaît la chansonCamille
1998 Le CousinClaudine Delvaux
1999 On The RunKristin
2000 Une femme d'extérieurFrançoise
The Taste of OthersLe Goût des autresMani
2003 24 Hours in the Life of a Woman24 heures dans la vie d'une femmeMarie Collins Brown
2004 The Role of Her LifeLe Rôle de sa vieElisabeth Baker
Nina's HouseLa Maison de NinaNina
Look at MeComme une imageSylvia Millet
2008 Let It RainParlez-moi de la pluieAgathe Villanova[20][21]
2012 The DandelionsDu vent dans mes molletsColette Gladstein
2013 Under the RainbowAu bout du conteMarianne
2014 The Easy Way OutL'Art de la fugueAriel
2015 The Sweet EscapeComme un avionLaëtitia
I'm All YoursJe suis à vous tout de suiteSimone Belkacem
2017 AuroreAurore[22]
2018 Place publique Helene [18][19]
2018 Best IntentionsLes Bonnes IntentionsIsabelle
2021 À l'ombre des filles Catherine
Compagnons Hélène
2024 Kaiser Karl Gaby Aghion

Ihe nkiri egwu

[dezie | dezie ebe o si]
YearTitle
2006 Canta
2009 Dans Mon Pays
2015 Nostalgias

Ihe nrite na nhọpụta

[dezie | dezie ebe o si]
YearAwardNominated workOriginal titleResult Notes
1994César Award for Best Original Screenplay or AdaptationSmoking/No SmokingMerie [3]
1997César Award for Best Original Screenplay or AdaptationFamily ResemblancesUn air de familleMerie [3]
1997César Award for Best Supporting ActressAhọpụtara [3]
1997Lumière Award for Best ScreenplayMerie [4]
1997César Award for Best Original Screenplay or AdaptationSame Old SongOn connaît la chansonMerie [3]
1998César Award for Best Supporting ActressMerie [3]
2000Lumière Award for Best FilmThe Taste of OthersLe Goût des autresMerie [4]
2000Lumière Award for Best DirectorMerie [23]
2000Lumière Award for Best ScreenplayMerie [4]
2000European Film Award for Best FilmAhọpụtara
2000European Film Award for Best ScreenwriterMerie
2000Montreal World Film Festival - Grand Prix des AmériquesMerie
2001César Award for Best FilmMerie [3]
2001César Award for Best Original Screenplay or AdaptationMerie [3]
2001César Award for Best Supporting ActressAhọpụtara [3]
2001César Award for Best DirectorAhọpụtara [3]
2001Academy Award for Best Foreign Language FilmAhọpụtara [6]
2001BIFA for Best Foreign Independent FilmAhọpụtara
2001Guldbagge Award for Best Foreign FilmAhọpụtara
2001René Clair Awardwith BacriMerie
2004Cannes Film Festival - Best ScreenplayLook at MeComme une imageMerie[24] [5]
2004European Film Award for Best ScreenwriterMerie
2004European Film Award for Best DirectorAhọpụtara
2004London Film Critics' Circle Award for Screenwriter of the YearAhọpụtara
2005César Award for Best Original Screenplay or AdaptationAhọpụtara [3]
2005Bodil Award for Best Non-American FilmMerie
2007Victoires de la Musique — World music album of the yearCantaMerie
2016César Award for Best Supporting ActressThe Sweet EscapeComme un avionAhọpụtara [3]
2024 Honorary César Herself Templeeti:Honored

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. ↑ "Agnès Jaoui". TVGuide.com (in Bekee). Retrieved 2022-12-31.
  2. ↑ AlloCine. "Agnès Jaoui". AlloCiné (in French). Retrieved 2022-12-31.
  3. 1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 "Agnès Jaoui". Cesar Awards (in French). Archived from the original on Dec 31, 2022. Retrieved 2022-12-31. {{cite web}}: More than one of |accessdate= and |access-date= specified (help); More than one of |archivedate= and |archive-date= specified (help); More than one of |archiveurl= and |archive-url= specified (help)
  4. 1 2 3 4 AlloCine. "Awards And Nominations For Agnès Jaoui". AlloCiné (in French). Archived from the original on Dec 31, 2022. Retrieved 2022-12-31.
  5. 1 2 "Agnès JAOUI - Festival de Cannes 2023". www.festival-cannes.com (in Bekee). Archived from the original on Dec 31, 2022. Retrieved 2022-12-31.
  6. 1 2 "Academy Awards Database Search | Academy of Motion Picture Arts & Sciences". awardsdatabase.oscars.org. Archived from the original on Dec 31, 2022. Retrieved 2022-12-31.
  7. 1 2 3 4 Klifa, Thierry (February 2000). "Agnès Jaoui: L'art de vivre". Studio magazine (153): 124–129. ISSN 0982-8354.
  8. 1 2 Lorrain, François-Guillaume (11 Septemba 2008). "Jaoui ne se laisse pas faire". Le Point. Archived from the original on 17 Maachị 2014. Retrieved 31 Maachị 2014.
  9. ↑ ""Au bout du conte", d'Agnès Jaoui, une comédie piquante très Jaoui-Bacri". Télérama.fr. 3 June 2013. Retrieved 31 March 2014.
  10. ↑ ""Canta" ou la délicatesse d'Agnès Jaoui". Linternaute.com. February 2006. Archived from the original on 25 February 2025. Retrieved 31 March 2014.
  11. ↑ ""Dans mon pays", Agnès Jaoui y El Quintet Oficial". Cosmopolitan. Retrieved 31 March 2014.
  12. ↑ Blanmont, Nicolas. Report from Dijon. Opera, March 2025, Vol.76 No.3 p.370-371.
  13. ↑ Amalric, Laurent (31 January 2013). "Le conte est bon à Six-Fours pour le duo Bacri-Jaoui". Nice-Matin. Archived from the original on 2014-03-26. Retrieved 31 March 2014.
  14. ↑ Williams, Michael (1998-08-31). "Agnes Jaoui & Jean-Pierre Bacri". Variety (in Bekee ndị America). Retrieved 2022-12-31.
  15. ↑ Karelle, Fitoussi (26 August 2012). "Agnès Jaoui, la douceur de vivre". Paris Match. Retrieved 31 March 2014.
  16. ↑ ""Mains baladeuses", sexisme et âgisme : Agnès Jaoui tacle le monde du cinéma". www.terrafemina.com (in French). Retrieved 2023-06-12.
  17. ↑ "Guerre Israël-Hamas : le bouleversant témoignage d'Agnès Jaoui, frappée par les attaques du 7 octobre". Le Point. 2023-11-19.
  18. 1 2 Keslassy, Elsa (2017-05-19). "Director Agnes Jaoui and SBS Films Team With Le Pacte for 'Place Publique' (EXCLUSIVE)". Variety (in Bekee ndị America). Retrieved 2022-12-31.
  19. 1 2 Hoeij, Boyd van (2018-04-23). "'Place Publique': Film Review". The Hollywood Reporter (in Bekee ndị America). Retrieved 2022-12-31.
  20. ↑ Holden, Stephen (2010-06-17). "You Have Issues? So Does Everybody". The New York Times (in Bekee ndị America). ISSN 0362-4331. Retrieved 2022-12-31.
  21. ↑ Dupont, Joan (2008-10-10). "Modern French society, through Agnès Jaoui's lens". The New York Times (in Bekee ndị America). ISSN 0362-4331. Retrieved 2022-12-31.
  22. ↑ Byrnes, Paul (2018-05-18). "Aurore review: Agnes Jaoui in role of her life in achingly real film". The Sydney Morning Herald (in Bekee). Retrieved 2022-12-31.
  23. ↑ AlloCine. "Meilleur mise en scène - Lumières de la presse étrangère". AlloCiné (in French). Retrieved 2022-12-31.
  24. ↑ "Festival de Cannes: Look at Me". festival-cannes.com. Archived from the original on 21 December 2013. Retrieved 31 March 2014.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]