Agnes Bell Collier
Ọdịdị
Agnes Bell Collier (31 Jenụwarị 1860 - 2 Jenụwarụ 1930) bụ onye Britain na-eme mgbakọ na mwepụ bụ onye so na ndị nwanyị mbụ na-eme mgbakọ na mwepụ, nke ya na Cambridge nwere njikọ.
A mụrụ Collier na Hyde, Cheshire. Ọ gụrụ akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ naanị ụmụ nwanyị Ellerslie Ladies' College, Manchester yana Newnham College, Cambridge site na 1880 ruo 1883, na-agafe Mathematical Tripos n'afọ 1883. Ọ bụụrụ onye nkuzi kọleji na mgbakọ na mwepụ site na 1883 ruo 1925 na onye nduzi ọmụmụ 1883-1920. Ọ bụ osote onye isi kọleji 1920-25, na onye mmekọ kọleji site na 1893 ruo 1917.