Alakụba na Naijiria
Islam bụ otu n’ime okpukpe abụọ kacha nwee ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ya na Naịjirịa. Naịjirịa nwekwara ọnụ ọgụgụ ndị Alakụba kacha ukwuu n’Afrịka. N’afọ 2018, CIA World Factbook mere atụmatụ na ndị Alakụba bụ 53.5% nke ndị bi na Naịjirịa.[1] Okpukpe Islam gbadoro ụkwụ karịsịa n’akụkụ ugwu nke mba ahụ. Steeti ndị dị n’akụkụ ndịda ọdịda anyanwụ nwekwara ọnụ ọgụgụ ndị Alakụba ka ukwuu. Steeti ndị dị ka Lagos, Ogun, Oyo na Osun.Akụkụ ọwụwa anyanwụ na akụkụ ndịda nke mba ahụ nwekwara ọnụ ọgụgụ ndị Alakụba pere mpe ma dị ịrịba ama bi n’ógbè ndị ahụ.[2] Ọtụtụ akụkụ nke ugwu Naịjirịa na-achịkwa n’okpuru iwu Sharia, ebe a na-achịkwa akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ n’okpuru iwu ọchịchị ụwa (secular law).[3] Ọnụọgụ ndị Alakụba n’ime ọnụ ọgụgụ ndị bi na Naịjirịa na-arịwanye elu, n’ihi na ọnụego ọmụmụ ha dị elu.
Ndị ahịa si n’Ebe Ugwu Afrịka na mpaghara mmiri Senegal webatara Islam n’ebe a bụ Naịjirịa taa n’ime narị afọ nke 11, ọ bụkwa okpukpe Abrahamic nke mbụ na-ekwere n’otu Chineke rutere Naịjirịa. Akụkụ ugwu nke Naịjirịa nọbu n’okpuru ọchịchị steeti na alaeze Islam dị iche iche, dịka Alaeze Kanem–Bornu, Alaeze Mali, Alaeze Songhai, na Alaeze Hausa. Usman dan Fodio, onye ọkà mmụta Islam nke ndị Fulani, tọrọ ntọala Sokoto Caliphate, nke chịrị akụkụ ugwu Naịjirịa n’ime narị afọ nke iri na itoolu n’oge agha jihadi ndị Fulani, ruo mgbe Alaeze Ukwu Britain weghaara ya n’afọ 1903. Ndị ozi ala ọzọ ndị Portugal webatara Iso Ụzọ Kraịst n’akụkụ ndịda Naịjirịa n’ime narị afọ nke iri na ise, ọ ghọkwara otu n’ime okpukpe ndị kacha ewu ewu na Naịjirịa, tinyere Islam, n’oge ọchịchị ndị Britain malitere ná ngwụcha narị afọ nke iri na itoolu.
Ndị Alakụba nọ na Naịjirịa bụkarị ndị Sunni na-agbaso ụlọ akwụkwọ echiche Maliki. Otú ọ dị, e nwere obere ìgwè ndị Shia dị ukwuu, ọkachasị na steeti Kaduna, Kano, Katsina, Osun, Kwara, Yobe na Sokoto (lee Shia na Naịjirịa). Karịsịa, nnyocha Pew Forum nke afọ 2008 banyere ụdị okpukpe dị iche iche chọpụtara na pasentị 5 nke ndị Alakụba Naịjirịa bụ ndị Shia.[4] Ndị otu Ahmadiyya na ndị Alakụba na-enweghị otu okpukpe a kapịrị ọnụ nwekwara ọnụnọ buru ibu n’obodo ahụ.[5]
- ↑ "The World Factbook — Central Intelligence Agency". www.cia.gov. Archived from the original on 9 January 2021. Retrieved 10 April 2018.
- ↑ "Islam in Nigeria". 15 November 2002. Archived from the original on 4 December 2021. Retrieved 4 December 2021.
- ↑ "Sharia implementation in northern Nigeria after 15 years | Oxford Department of International Development". www.qeh.ox.ac.uk. Archived from the original on 2023-04-06. Retrieved 2023-03-24.
- ↑ "The World's Muslims: Unity and Diversity". Pew Forum on Religious & Public life. August 9, 2012. Archived from the original on March 10, 2019. Retrieved August 14, 2012.
- ↑ "Achievements of Ahmadiyya Muslim Jamaat in Nigeria