Alan Sugar

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ



The Lord Sugar
Sugar at the 2010 BAFTAs
Born
Alan Michael Sugar

(1947-03-24) 24 Maachị 1947 (age 77)
Occupation
Political partyIndependent (2015–present)
Labour[1] (1997–2015)[2]
Spouse(s)
Ann Simons, Lady Sugar
(m. Àtụ:Hover title)
Children3
RelativesRita Simons (niece-by-marriage)
Enterprise Champion to the Business Secretary
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
Àtụ:Str rep
25 May 2016
Prime MinisterDavid Cameron
Theresa May
Boris Johnson
Liz Truss
Rishi Sunak
Business SecretarySajid Javid
Greg Clark
Andrea Leadsom
Alok Sharma
Kwasi Kwarteng
Jacob Rees-Mogg
Grant Shapps
Kemi Badenoch
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Prime MinisterGordon Brown
Business SecretaryThe Lord Mandelson
Member of the House of Lords
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
Àtụ:Str rep
20 July 2009

Alan Michael Sugar, Baron Sugar (amụrụ na 4 Machị 1947) bụ onye obodo Britain ji ego achu ego, onye mgbasa ozi, onye edemede, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye ndụmọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.[3][4][5] N'afọ 1968, ọ malitere ihe ga-emesị bụrụ nnukwu azụmaahịa ya, ụlọ ọrụ eletrọniki Amstrad. N'afọ 2007, ọ rere oke ya fọdụrụ na ụlọ ọrụ ahụ na nkwekọrịta na BSkyB maka £ 125M.[6]

Sugar bụ onyeisi oche na onye nwe Tottenham Hotspur site na 1991 ruo 2001, na-ere òkè ya fọdụrụ na klọb ahụ na 2007 nakwa, maka £ 25m.[6] A makwara ya maka ịbụ onye na elekota ndị ọbịa na "Boss" maka usoro asọmpi nke BBC The Apprentice, nke a na-agbasa kwa afọ, ma e wezụga 2020, kemgbe 2005. Ọ malitekwara ọrụ maka The Celebrity Apprentice Australia maka Australia's Nine Network na 2021.

Dị ka akwụkwọ mgbasa ozi Sunday Times n'ahụ maka ndị nwere ego si nwe kwuo ,Mazi Sugar ghọrọ nnukwu ọgaranya nwere nde kwuru nde ego na 2015. N'afọ 2021, e mere atụmatụ na akụ na ụba ya dị £ otu nde na uma iri abụo na otu nke a mere ka ọ nọrọ na ọnọdụ onye nke otu naari na iri atọ na asato na ndị kacha baa ọgaranya na mba UK.[7]

A mụrụ Sugar na 24th Maachị 1947 na Hackney, East London, n'ezinụlọ ndị Juu.[8] Nna ya, Nathan, bụ onye na-akwa ákwà na ụlọ ọrụ uwe nke East End.[9] A mụrụ nne na nna ya ochie n'akụkụ nke nne ya na mba Russia, a mụrụ nna ya ochie n'akụkụ nna ya na mba Poland. A mụrụ nne nne ya n'akụkụ nna Sugar aha ya bụ Sarah Sugar, na mba London na ezi n'ụlọ nne na nna bu ndi Poland

Mgbe Sugar bụ obere nwa, ezi n'ụlọ ha biri n'ụlọ kansụl. N'ihi ntutu isi ya, nke juferu oké, a na-akpọ ya "isi akwa eji ehicha ụlọ," aha ka so kwa ya rue n'oge a. Ọ gara akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ nke a n'akpo Northwold Primary School na Brooke House Secondary School na Upper Clapton, Hackney, ma nweta kwuru ego site n'ịrụ ọrụ na ebe ana ere ọtụtụ ihe dị iche iche [10] Mgbe ọ hapụsịrị ụlọ akwụkwọ mgbe ọ dị afọ iri na isii, ọ rụrụ ọrụ nwa oge maka ọrụ gọọmentị dị ka onye na-ahụ maka ọnụ ọgụgụ na Ministry n'ahụ maka Agụmakwụkwọ

N'afọ 1968, mgbe ọ dị afọ iri abụo na otu Sugar ji otu naari pounds we guzobere ụlọ ọrụ a n'akpo Amstrad site n'ego o dokwaru ọfuma na ụlọ ọrụ ebe a na ezipu leta na ihe ndị ọzọ. Ọ malitere ire ngwa ọrụ redio maka ụgbọala na ihe eletrik ndị ọzọ site n'ime ụgbọ ala nke ọ zụrụ n'onu £ irí ise ma tinye ya n'aka ndị ụlọ ọrụ nchekwa n'onu £asato

Kọmputa onwe onye CPC 464 nke Amstrad

O weputarụ aha ụlọ ọrụ ahụ site na na mkpụrụ edemede atọ mbụ bidoro aha ya na kwa mkpụrụ edemede anọ mbụ nke okwu ahia: Alan Michael Sugar Trading . Ọ malitere dị ka onye na-atubata ngwá ahịa / onye na-ezipụ ngwa ahịa na onye na-ere ahịa n'ubara, ka ọ na-erule afọ 1970, okwaochala ihe nile gbasara ụlọ ọrụ ga na emepụta ihe ọhụrụ . O nwetara ọnụahịa emepụta dị ọnụ ala site na iji plastik ihe eji agba ọgwụ maka mkpuchi hi-fi turntable, mee ka ọnụ ahịa daa nke ukwu n'ebe ndị ọzọ ya na ha na asọmpi na-eji usoro mmepụta ikuku. E mere ka ikike mmepụta gbasaa iji tinye mmepụta nke ihe nakwalite ịnụ okwu na nke na eme ka uda ụzụ dakoo nke ọma

  1. Lord Sugar. Parliament of the United Kingdom.
  2. "Alan Sugar resigns from Labour party over 'shift to left'", The Guardian, 11 May 2015. (in en)
  3. Review: What you see is what you get: My Autobiograohy by Alan Sugar. independent.
  4. Let's do the business. The Jewish Chronicle (14 May 2008). Archived from the original on 4 March 2016. Retrieved on 26 August 2014.
  5. Sir Alan, you're hired as our rep. The Jewish Chronicle (19 May 2008). Archived from the original on 19 October 2015. Retrieved on 26 August 2014.
  6. 6.0 6.1 "BSkyB agrees £125m Amstrad deal", BBC News, 31 July 2007. Retrieved on 28 January 2009.
  7. The Sunday Times – The Rich List. The Times. Retrieved on 16 May 2020.
  8. Beckford. "Sir Alan Sugar fails to make top 100 Jews list", The Daily Telegraph, 9 May 2008. Retrieved on 3 June 2012.
  9. "The Lords think I'm a brusque, ignorant cockney", The Daily Telegraph
  10. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named TRAS