Gaa na ọdịnaya

Alina Chertock

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Alina Chertock bụ onye mgbakọ na mwepụ nke nnyocha ya na-agụnye usoro ọnụọgụ maka partial differential equations n'asụsụ bekee , ọkachasị ndị a na-eme n'usoro fluid dynamics, gas dynamics, na chemotaxis. Onye gụrụ akwụkwọ na Soviet Union na Israel, [1] ọ na-arụ ọrụ na mba US dị ka LeRoy B. Martin, Jr. Prọfesọ pụrụ iche nke mgbakọ na mwepụ na onye isi nke ngalaba nke mgbakọ na mwepụ na Mahadum North Carolina State. [2]

Agụmakwụkwọ na ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

Chertock nwetara nzere masta na ngalaba mgbakọ na mwepụ a na-etinye n'ọrụ site na Mahadum Moscow State n'afọ 1989, na nzere Ph.D. na mgbakọ na mwepụ a na-etinye n'ọrụ na Mahadum Tel Aviv n'afọ 1999.[1] Akwụkwọ edemede inweta nzere ọkankuzi ya, Strict stability of high-order compact implicit finite-difference schemes: the role of boundary conditions for hyperbolic PDEs, bụ nke Saul Abarbanel lekọtara.[3]

Mgbe ọ mechara nnyocha na-esote nnweta nzere ọkankuzi ya na Mahadum California, Berkeley yana Lawrence Berkeley National Laboratory, ọ sonyeere Mahadum North Carolina State dị ka osote prọfesọ nke mgbakọ na mwepụ n'afọ 2002. E buliri ya n'ọkwa ka ọ bụrụ osote prọfesọ n'afọ 2007 ma bụrụ prọfesọ zuru oke n'afọ 2013. Ọ bụ onye isi ngalaba ebe ahụ kemgbe afọ 2015.[1]

Nkwanye Ùgwù

[dezie | dezie ebe o si]

A kpọrọ Chertock aha dị ka LeRoy B. Martin, Jr. Distinguished Professor n'afọ 2021.[1] A kpọrọ ya aha dị ka onye òtù Society for Industrial and Applied Mathematics (SIAM) n'afọ 2023, "maka ihe ntinye ya dị ịrịba ama na usoro ọnụọgụ maka usoro hyperbolic nke iwu nchekwa na ọrụ dị mkpa nye ndị na-eme mgbakọ na mwepụ".[4]

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Curriculum vitae (PDF), March 2023, archived from the original (PDF) on 2023-04-08, retrieved 2023-04-08
  2. "Alina Chertock", People, NCSU Department of Mathematics, retrieved 2023-04-08
  3. Templeeti:Mathgenealogy
  4. "SIAM Announces Class of 2023 Fellows", SIAM News, SIAM, March 30, 2023, retrieved 2023-04-08

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  • Peeji mbido
  • Mbipụta niile nke Alina Chertockndị edepụtara Google Scholar