Gaa na ọdịnaya

Alou Harouna

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Alou Harouna
mmádu
Ụdịekerenwoke Dezie
Mba o sịNiger Dezie
Aha enyereAlou Dezie
Aha ezinụlọ yaHarouna Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya2 Maachị 1942 Dezie
Ebe ọmụmụTillabéri Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, minister Dezie
Ọkwá o jiMinister of Justice of Niger Dezie

Alou Harouna (amụrụ ya na ọnwa Machị nke ụbọchi 24 n’oge afọ 1942 na Tillabéri; ụfọdụ oge a na-asụ Alou Arouna) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye nnọchi anya mba Niger.

Ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Alou Harouna gara ụlọ akwụkwọ praịmarị ya na Madaoua ya na kwazi Bonkoukou na Lycée National na Niamey. Ọ gụsịrị akwụkwọ na nzere iwu wee malite ịrụ ọrụ dịka onye isi ngalaba na ọrụ gọọmentị Naijiria n’oge afọ 1968. N'ime ụlọ ọrụ nke Minista nke Interior, ọ rịgooro na onye nduzi nchịkwa, mgbe ahụ onye ndụmọdụ teknụzụ. Ọ nọrọ otu afọ na Bordeaux maka ọzụzụ ọzọ n’oge afọ 1972. N'afọ sochirinụ, ọ ghọrọ onye nduzi nke Minista nke Interior, Yansambou Maïga Diamballa . [1]

Ndụ Onwe Onye

[dezie | dezie ebe o si]

Alou Harouna alụọla nwanyị ma nwee ọtụtụ ụmụ.[1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị

[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe e wepụrụ onye isi ala Hamani Diori n'onwa Apreel nke ụbọchi iri n’ise nke oge afọ 1974, na mmalite nke ọchịchị nke Kansụl Kasị Elu nke Ndị Agha, onye isi ala ọhụrụ, Seyni Kountché, kpọbatara Alou Harouna n'ime ọchịchị ya, ebe ọ nọgidere ruo oge afọ 1982. Site na onwa Juun nke ụbọchi asatọ n’oge afọ 1974, ruo onwa February 21, nke oge afọ 1976, Harouna jere ozi dịka odeakwụkwọ nke steeti maka ime obodo. Kountché n'onwe ya nwere ọfịs dị elu nke Minista nke Interior na mbido na njedebe nke oge ya, ebe Idrissa Arouna nwere ya site n’onwa Nọvemba 30, nke oge afọ 1974, ruo onwa Juun 3, nke ohe afọ 1975. N’ ọnwa Febụwarị 21, nke oge afọ 1976, Harouna ghọrọ Minista nke Interior, nke dị n'okpuru Onye isi ala. Site na ọnwa Juun 7, nke oge afọ 1976, ọ rụrụ ọrụ dịka Minista nke Ọrụ Obodo na Ọrụ, na Minista nke Post na Telecommunications.[2] Ọkwá ndị a bụ nke Mamadou Diallo Sory, onye a họpụtara mgbe ahụ ka ọ bụrụ Minista nke Interior. Alou Harouna nọchiri Mamadou Malam Aouami dị ka Minista Ikpe Ziri Ezi na 10 Septemba nke oge afọ 1979. Mamadou Diallo Sory weghaara ngalaba nke Post na Telecommunications, na Issoufou Mayaki weghaara ọrụ ọha na eze na ọrụ. Harouna hapụrụ gọọmentị na ụbọchi iri na anọ nke ọnwa Juun n’oge afọ 1982. Mahamadou Halilou Sabbo nọchiri ya dịka Minista Ikpe Ziri Ezi.[3]

N'ụbochị ise n'ọnwa Ọgọstụ n'oge afọ 1982, a họpụtara Alou Harouna ka ọ bụrụ onye nnọchi anya Niger na Soviet Union, na-anọchi Mahamane Karimou.[4] E nyekwara ya ikike na East Germany.[5] Na ụbọchị iri na ato Jenụwarị nke oge afọ 1985, a họpụtara Alhousseïni Mouloul ka ọ nọchie ya. [4]

A họpụtara Harouna ka ọ bụrụ onye nnọchi anya Algeria n'otu ụbọchị ahụ, na-anọchi Abdou Garba. Moustapha Tahi nọchiri ya dịka onye nnọchi anya n’ụbọchi 12 Mee nke oge afọ 1988.[6] Harouna mechara bụrụ onye otu kọmitii ntuli aka mba maka ntuli aka iwu nke oge afọ 1992, ntuli aka ndị omeiwu nke oge afọ 1993, na ntuli aka onye isi ala nke oge afọ 1993 [7]

  1. 1.0 1.1 (1974) Niger Briefs: New State Secretary of the Interior. Arlington: U. S. Joint Publications Research Service, 27. 
  2. Service (1978). Translations on Sub-Saharan Africa (in en). 
  3. Liste des gouvernements successifs de la République du Niger de 1957 à 2016. www.fichier-pdf.fr. Archived from the original on 2018-11-14. Retrieved on 2025-07-29.
  4. 4.0 4.1 Aboubacar Kio Koudizé. La diplomatie nigérienne. Niamey: Ministère des affaires étrangères et de la coopération, 104. 
  5. (1986) World Guide to Foreign Services. A Directory of Ministries of Foreign Affairs, Embassies, Consulates, High Commissions, Missions, Legations, Delegations, and Representations. Weissensberg: World Guides, 551. 
  6. Aboubacar (2009). La diplomatie nigérienne. Niamey: Ministère des affaires étrangères et de la coopération, 78. 
  7. (1992-12-14) Décision N° 273/MI/DAPJ du 14 Décembre 1992. Portant nomination des membres de la Commission Nationale des Élections. Ministère de l’Intérieur, République du Niger.