Gaa na ọdịnaya

Amanda Chetwynd

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Amanda G. Chetwynd PFHEA bụ onye Britain na-eme mgbakọ na mwepụ nakwa onye na-ahụ maka ọnụ ọgụgụ nke ngalaba ọkachamara ya bụ na combinatorics na ọnụ ọgụgụ mbara igwe. Ọ bụ Prọfesọ nke mgbakọ na mwepụ na ọnụ ọgụgụ na Provost maka ahụmịhe ụmụ akwụkwọ, kọleji na ọbá akwụkwọ na Mahadum Lancaster, nakwa onye òtù ndị isi nke Higher Education Academy . [1]

Agụmakwụkwọ na Nnyocha

[dezie | dezie ebe o si]

Chetwynd nwetara nzere Ph.D. site na Mahadum Open n'afọ 1985. Anthony Hilton na Robin Wilson jikọrọ aka lekọta edemede ya, Edge-colourings of graphs.[2] O mere nnyocha onye nwetarala nzere ọkankuzi ya na Mahadum Stockholm tupu ọ banye Mahadum Lancaster . [3] Ihe nchoputa na-amasị ya gụnyere graph theory, edge coloring, na Latin square na combinatorics, yana Nchịkọta ala na ndekọ ahụike.[1]

Nkwanye Ùgwù na Ije Ozi Ya

[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2003, Chetwynd ritere ịbụ onye òtù National Teaching Fellowship na mmata ịdị mma nkuzi ya. [4] Ọ bụ osote onye isi oche nke London Mathematical Society n'afọ 2005, n'oge ọmụmụ mgbakọ na mwepụ na mahadum na-ebelata, ma siri n'ọ́kwá a gbaa gọọmentị UK ume ka ha gbochie ọdịda n'ọnụ ọgụ ahụ site n'inyetukwu ego maka agụmakwụkwọ mgbakọ na mwepụta.[5]

Akwụkwọ Ndị O Dere

[dezie | dezie ebe o si]

Chetwynd bụ onye dere, ya na Peter Diggle, akwụkwọ ndị a: Discrete Mathematics (Modular Mathematics series, Arnold, 1995) na Statistics and Scientific Method: An Introduction for Students and Researchers (Oxford University Press, 2011). [6] Ya na Bob Burn bụ onye dere A Cascade of Numbers: An Introduction to Number Theory (Arnold, 1995). [7]

Ebemsidee

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 "Provost for Student Experience, Colleges and the Library: Professor Amanda Chetwynd, BSc, MSc, PhD", Senior Officers, Lancaster University, retrieved 16 June 2019
  2. Templeeti:Mathgenealogy
  3. Author biography from Statistics and Scientific Method
  4. Lancaster wins National Teaching Fellowship Prize for 4th Year Running, Lancaster University, 10 June 2003
  5. MacLeod, Donald (11 February 2005), "Course closures creating maths 'wasteland'", The Guardian
  6. Review of Statistics and Scientific Method:
  7. Reviews of A Cascade of Numbers:

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  • Ihu mbụ
  • Mbipụta Amanda Chetwynd ndị edepụtara na Google Scholar

Templeeti:Lancaster University