Gaa na ọdịnaya

Amanitore

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Amanitore

Amanitore, nke a na-akpọkwa Amanitere ma ọ bụ Amanitar,[1] bụ eze nwanyị nke alaeze Kush, onye chịrị site na Meroë n’etiti narị afọ mbụ AD.[2] Ya na nwa ya nwoke, Natakamani, chịrị alaeze ahụ. Ọchịchị Amanitore na Natakamani bụ oge e nwere ọtụtụ ihe akaebe gbasara ya, ma o yikwara ka ọ bụ oge ọganihu na ịba ụba. O nwere ike ịbụ na ha biri n’otu oge ahụ na eze ukwu Nero.

Ndụ ya

[dezie | dezie ebe o si]


A maara Amanitore na Natakamani site n’ili ha na ọtụtụ ihe ncheta nke na-egosi ha abụọ ọnụ. Ndị ọkà mmụta mbụ chere na Amanitore bụ nwunye Natakamani, ma ugbu a a na-ekwenyekarị na ha bụ nne na nwa nwoke. Nke a bụ n’ihi na ihe odide oge ochie a chọtara n’Ụlọ Nsọ Dakka na-egosi na Amanitore bụ nne Natakamani.[2]

N’oge ha na-achị, ọ bụ naanị Natakamani ka a kpọrọ aha doro anya dị ka onye ọchịchị (qore), ebe a na-akpọ Amanitore kandake (eze nwanyị/nne eze).[3] Otú ọ dị, a na-egosi ha n’ụzọ doro anya dị ka ndị ọchịchị ibe ha nwere ikike hà nhata n’ihi na a na-egosipụta ha abụọ na regalia na uwe ndị eze.[4] Ọ dịghị mgbe e nwere ihe àmà na-egosi na Natakamani ma ọ bụ Amanitore chịrị n’onwe ha na-enweghị onye nke ọzọ.[5] E liri Amanitore na pyramid nke ya na Meroë, Beg. N 1.[6] Lli ahụ dị ihe dịka square mita isii n’ala ya, ọ bụghị pyramid n’echiche mgbakọ na mwepụ.

  1. ↑ Richard A. Lobban Jr. (2020-10-20). Historical Dictionary of Medieval Christian Nubia. Rowman & Littlefield. p. 26. ISBN 978-1-5381-3341-5.
  2. 1 2 Kuckertz, Josefine (2021). "Meroe and Egypt". UCLA Encyclopedia of Egyptology: 5, 13, 17.
  3. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  4. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  5. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).
  6. ↑ Lua error in Module:Citation/CS1 at line 2548: attempt to call field 'is_valid_date' (a nil value).