Angeline Murimirwa
Angeline Murimirwa ( née Mugwendere) bụ nwanyị onye Zimbabwe, bia bụrụkwa onye isi ụlọ ọrụ Camfed na Africa. [1] Murimirwa so na 2017 BBC ndepụta ụmụ nwanyị kacha nwee mmetụta. [2]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Murimirwa tolitere na Denhere n'ime obodo Zimbabwe. N'afọ ndị 1990, ọ bụ otu n'ime ụmụ agbọghọ mbụ ndi Camfed nyere onyinye maka agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya, nke gụnyere nkwado ego, ejiji ụlọ akwụkwọ ya, akpụkpọ ụkwụ na ngwá ụlọ akwụkwọ. [3] [4][5][6]
Tupu ahọpụta ya dị ka onye isi nchịkwa - Africa, Murimirwa rụrụ ọrụ dị ka onye isi nchịkwa mpaghara maka Camfed n' ime Ndịda na Ọwụwa Anyanwụ Africa. [5] [7] N'afọ 1998, e nyere Murimirwa aka iji melite Camfed Alumnae Network (CAMA), nke malitere site na narị ụmụ nwanyị ole na ole. Site n'afọ 2012, CAMA nwere ndị otu 17,000 na mba Africa ise. [6] Netwọk ahụ mere emume ndị otu 100,000 n'afọ 2017. [8] N'afọ 2005, Murimirwa gosipụtara na ihe ogbako Global Exchange, na n'afọ 2006, e nyere ya ihe nrite maka okike na ndụ ime obodo site n'aka ndi ama dika Women's World Summit Foundation. [4] E gosipụtara Murimirwa na akwụkwọ nke 2009 Half the Sky site na Pulitzer Prize na-emeri akwụkwọ akụkọ Sheryl WuDunn na Nicholas Kristof . [6] [5] N'afọ 2014, o kwuru okwu na ihe omume na Michelle Obama . N'afọ 2016, Murimirwa gara emume Camfed ebe Julia Gillard, onye bụbu Prime Minister nke Australia, ghọrọ onye na-elekọta nzukọ ahụ. N'oge mmemme ahụ, Murimirwa kwuru na "Ngwọta ahaziri n'ime obodo, ịkwanyere ọnọdụ ya ugwu na iwulite akụrụngwa mpaghara, bụ isi ihe na-eme ka anyị nwee ọganihu." [9] N'afọ 2017, e nyere ya onyinye nsọpụrụ nke 2017 Diamond Ball site na ndi otu Clara Lionel Foundation . Na mmemme ahụ, Murimirwa kwuru maka njem onwe ya site na ịda ogbenye ruo ọrụ ọ na-arụ ugbu a na Camfed, na Murimirwa nyekwaara ndị otu "100,000 Camfed Alumnae". Ndị ama ama gụnyere Dave Chappelle, Rihanna, Kendrick Lamar na Calvin Harris bịara mmemme ahụ. [7] [10] [11] N'afọ 2018, n'oge nleta eze na Zambia, Prince Harry zutere Murimirwa. N'afọ 2020, e nyere Murimirwa ihe nrite Yidan maka mmepe agụmakwụkwọ maka ịkwalite mmepe agụmakwụkwọ. [12]
Ndụ onwe onye
[dezie | dezie ebe o si]Murimirwa lụrụ di ma nwe ụmụ anọ. [5]Weiner. "A dynamic African woman lives up to Michelle Obama's call to give girls the chance to go to school", The Washington Post, 12 December 2014. Retrieved on 23 December 2017.Weiner, Joanna (12 December 2014). "A dynamic African woman lives up to Michelle Obama's call to give girls the chance to go to school". The Washington Post. Retrieved 23 December 2017.</ref>
Ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Our team – Camfed – Campaign for Female Education. camfed.org. Retrieved on 3 January 2018.
- ↑ "BBC 100 Women 2017: Who is on the list?", BBC News, 1 November 2017. Retrieved on 23 December 2017.
- ↑ How one advocate uses her own story to build trust in girls' education. New Zimbabwe (23 May 2017). Archived from the original on 24 December 2017. Retrieved on 23 December 2017.
- ↑ 4.0 4.1 Angeline Murimirwa – Regional Executive Director (Southern Africa), Camfed – DFID Girl Summit 2014. The Communication Initiative Network (20 August 2015). Retrieved on 23 December 2017.
- ↑ 5.0 5.1 5.2 5.3 Weiner. "A dynamic African woman lives up to Michelle Obama's call to give girls the chance to go to school", The Washington Post, 12 December 2014. Retrieved on 23 December 2017.
- ↑ 6.0 6.1 6.2 Cotton (20 August 2012). Education: An Unstoppable Tide. Half the Sky Movement. Archived from the original on 24 December 2017. Retrieved on 24 December 2017.
- ↑ 7.0 7.1 Angeline Murimirwa accepts award from Rihanna's Clara Lionel Foundation. Cambridge Network (15 September 2017). Archived from the original on 24 December 2017. Retrieved on 23 December 2017.
- ↑ Camfed celebrates CAMA milestone of 100,000 empowered and educated women (en). Cambridge Network. Archived from the original on 4 January 2018. Retrieved on 3 January 2018.
- ↑ Sweeney. "Julia Gillard boosts Camfed's female education fight", Business Weekly, 10 February 2016. Retrieved on 24 December 2017.
- ↑ Bruner. "What It's Like Inside Rihanna's Power Player-Filled Diamond Ball", Time, 15 September 2017. Retrieved on 24 December 2017.
- ↑ Rihanna Foundation Honours Zimbabwean Woman. PA Zimbabwe (18 September 2017). Archived from the original on 31 October 2018. Retrieved on 24 December 2017.
- ↑ CAMFED female education ambassadors awarded Yidan Prize. Business Weekly (28 September 2020). Retrieved on 22 April 2021.