Annie Kenney
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Obodoézè Nà Ofú |
| Aha enyere | Annie |
| Aha ezinụlọ ya | Kenney |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 13 Septemba 1879 |
| Ebe ọmụmụ | Springhead |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 9 Julaị 1953 |
| Ebe ọ nwụrụ | Hitchin |
| Nwanne | Jessie Kenney, Nell Kenney, Rowland Kenney, Kitty Kenney |
| Dị/nwunye | James Taylor |
| Nwa | Warwick Kenney-Taylor |
| Onye dị ịrịba ama | Christabel Pankhurst, Frederick Pethick-Lawrence, 1st Baron Pethick-Lawrence, Grace Roe |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, suffragist, suffragette, women's rights activist |
| Ụdị ọrụ ya | Women's suffrage |
| Archive na | University of East Anglia Archives |
| Onye òtù nke | Women's Social and Political Union |
| Ihe omume dị ịrịba ama | imprisonment |
| Ihe nrite | Hunger Strike Medal |
Ann "Annie" Kenney (13 Septemba 1879 – 9 Julaị 1953) bụ onye bekee na-arụ ọrụ n'ọkwa nke ghọrọ onye isi na Women's Social and Political Union.
Akụkọ ndụ ya
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Kenney na 1879 na West Riding of Yorkshire, England.[1] Ọ bụ nwa nwanyị nke anọ n'ime ezinụlọ nwere ụmụ iri na abụọ.[2]
Mgbe ọ dị afọ 10, ọ malitere ịrụ ọrụ n'ebe a na-akwa ákwà na-agakwa ụlọ akwụkwọ, ọ bụkwa onye na-agachi chọọchị anya.[3][4]
Mgbe nne ya nwụrụ na 1905, Kenney na ụmụnne ya isii nọgidere na nna ya.[5]
Kenney sonyeere aka na otu Women's Social and Political Union (WSPU).[6] O jiri Minnie Baldock hibere alaka mbụ ya na London.[7] Kenney dọọrọ mmasị ndị nta akụkọ na ọha na 1905 mgbe a tụrụ ya na Christabel Pankhurst mkpọrọ ruo ọtụtụ ụbọchị maka mwakpo na mgbochi metụtara ajụjụ Sir Edward Grey na nnọkọ oriri na ọṅụṅụ na Manchester n'okwu gbasara votu ụmụ nwanyị.[8] A na-ekwu na ihe a merenụ bụ ịmalite usoro ọhụrụ na mgba maka ịhọpụta ụmụ nwanyị na UK site na nkwenye nke usoro agha.[9]
Annie nwere ọtụtụ ndị enyi dị ka Emmeline Pethick-Lawrence, Baroness Pethick-Lawrence, Mary Blathwayt, Clara Codd, Adela Pankhurst na Christabel Pankhurst.[10][11]
Mgbe ụmụ nwanyị karịrị afọ 30 meriri votu ahụ na 1918, Kenney lụrụ James Taylor wee biri na Hertfordshire. A mụrụ otu nwa nwoke, Warwick Kenney Taylor na 1921. Mgbe ọrịa strok gasịrị ọ nwụrụ na 9 Julaị 1953, ọ gbara afọ 73.[12][13]
Ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Rosen, Andrew (2013-01-17). Rise Up, Women!: The Militant Campaign of the Women's Social and Political Union, 1903-1914 (in en). Routledge. ISBN 978-1-136-24754-5.
- ↑ Woodhead, Geoffrey (2003). The Kenney family of Springhead.
- ↑ Jenkins, Lyndsey (2019-12-01). "Annie Kenney and the Politics of Class in the Women’s Social and Political Union" (in en). Twentieth Century British History 30 (4): 477–503. DOI:10.1093/tcbh/hwz021. ISSN 0955-2359.
- ↑ Harrison, Brian (2004-09-23), "Annie Kenney (1879–1953)", The Oxford Dictionary of National Biography, Oxford University Press, doi:10.1093/ref:odnb/34285, retrieved 2025-09-12
- ↑ Rappaport, Helen. (2001) Encyclopedia of women social reformers, Volume 1. Santa Barbara, California : ABC-CLIO. p. 359-361. ISBN 9781576071014.
- ↑ "Jessie Kenney", Spartacus Educational. (in en)
- ↑ Jackson, Sarah. "The suffragettes weren't just white, middle-class women throwing stones", The Guardian, 12 October 2015.
- ↑ Sacrifice that is all but forgotten (en) (2005-10-13).
- ↑ Rosemary Taylor (4 August 2014). East London Suffragettes. History Press, 32–. ISBN 978-0-7509-6216-2.
- ↑ Christabel Pankhurst and Annie Kenney (en-GB).
- ↑ "Diary reveals lesbian love trysts of suffragette leaders", The Observer, 2000-06-11. (in en-GB)
- ↑ The British Archive for Contemporary Writing CollectionsOnline | KP/AK/6/3 - Scattering of Annie Kenney's ashes -photographs. Retrieved on 15 November 2022.
- ↑ Annie Kenney - a truly remarkable Oldham woman. Retrieved on 15 November 2022.