Gaa na ọdịnaya

Apollonia Mathia

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Apollonia Mathia
Born
Apollonia Adong Mathia
Died
Juba
OccupationJournalist
Notable workFounder, AMWISS, UJOSS

Apollonia Mathia (nwụrụ n'abalị iri na asatọ n'ọnwa Machị afọ 2011) bụ onye nta akụkọ nke obodo South Sudan na onye na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Mathia bụ otu n'ime ndị guzobere Association for Media Women in South Sudan (AMWISS) yana Union of Journalists of Southern Sudan (UJOSS).

Mmalite na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Mathia n'oge afọ ndị 1950. [1]Ọ nọrọ n'oge ọ bụ nwata n'ebe ugwu Uganda tupu ọ kwajezie Juba.[2][3]

Apollonia Mathia
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịSouth Sudan Dezie
Aha enyereApollonia Dezie
Aha ezinụlọ yaMathia Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1950s Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya18 Maachị 2011 Dezie
Ebe ọ nwụrụJuba Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ntaakụkọ, activist Dezie

Tupu ọ banye na Ministry of Finance dịka odeakwụkwọ n’oge afọ 1978, Mathia rụrụ ọrụ dịka onye njikwa ozi na Chọọchị Katọlik.[1] O mechara hapụ ya iji sonye na Juba Post ebe ọ bụ naanị nwanyị nchịkọta akụkọ na Onye nchịkọta akụkọ. [4] Ọ hapụrụ Juba Post n’oge afọ 2008 wee sonye na BBC Monitoring Service dịka onye nnọchi anya ha na obodo South Sudan. [4][2]

Mathia rụrụ ọrụ n'ọtụtụ ọrụ ma nyere aka guzobe Union of Journalists of Southern Sudan (UJOSS). Ọ rụkwara ọrụ dịka onye ndụmọdụ na ngalaba itinye ego World Bank Micro-finance nke obodo South Sudan.[5]

N'oge ọ nwụrụ n’afọ 2011, Mathia bụ onye isi nchịkwa nke Association for Media Women in South Sudan (AMWISS) nke o nyere aka mepụta n’oge afọ 2008 n'akụkụ Veronica Lucy Gordon na ndị ọzọ sonyekwa ha. [3]

Ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]

N'abalị iri na asatọ n'ọnwa Machị n'oge afọ 2011, Mathia nwụrụ n'ihi ihe mberede mgbe otu ọgba tum tum ọ nọ na ya kụrụ ụgbọala.[1]

Hụkwazie

[dezie | dezie ebe o si]

Edensịbia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 1.2 Oduha. "Leading woman journalist dies in road accident", The Pioneer, 19 March 2011, pp. 3–4. Retrieved on 21 March 2022.Oduha, Joseph (19 March 2011). "Leading woman journalist dies in road accident" (PDF). The Pioneer. pp. 3–4. Retrieved 21 March 2022.
  2. 2.0 2.1 Apollonia Mathia: A rock of Sudanese journalism. The Journalist (30 April 2021). Retrieved on 2022-03-21.
  3. 3.0 3.1 Remembering South Sudan's pioneer female reporter (en-US). Committee to Protect Journalists (30 March 2011). Retrieved on 2022-03-22.
  4. 4.0 4.1 Okello. "Celebrating the life of Apollonia Mathias : GMMP national coordinator and the first femalejournalist in South Sudan", Media & Gender Monitor, May 2011, pp. 15–16. Retrieved on 21 March 2022.
  5. South Sudan's veteran female journalist passes on (en-GB). Media Diversity Institute (4 April 2011). Retrieved on 2022-03-22.