Gaa na ọdịnaya

Ateke Tom

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

N'ubochi Ọktoba 1, 2009,emume ncheta afọ iri anọ na itoolu nke nnwere onwe Naịjirịa na ụbọchị atọ tupu mmechi nke mmemme mgbaghara gọọmentị, Tom ji obi ya nyefee onwe ya n'aka Onye isi ala Umaru Musa Yar'Adua N'Ụlọ Gọọmentị, Abuja. E zigara ụgbọelu onye isi ala ka ọ gaa Abuja, onye isi ala ahụ kwuru, "Taa, Chief Tom Ateke ị nyere m onyinye ncheta nnwere onwe m nke 49 ma enwere m mmasị na ya nke ukwuu. " Ndị ọbiara nọ na ntinye aka ahụ bụ osote onye isi ala Goodluck Jonathan, Minista na-ahụ maka nchekwa General Godwin Abbe, Onye odeakwụkwọ nke gọọmentị nke mba jikoro onu Yayale Ahmed, Onye isi ndi agha nchekwa Paul Dike na Onye ndumodu nchekwa mba Abdullahi Sarki Mukhtar, ndị ọzọ.

N'ubochi iri abụọ na ise n'ọnwa Nọvemba n'afọ 2017, e chiri Ateke Tom okpueze dị ka Amanyanabo mbụ nke Okochiri. Ndi bịara okpueze ahụ bụ Ezenwo Wike, Gọvanọ nke Rivers State.[1][2]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Onoyume (25 November 2017). Ex militant leader, Ateke Tom crowned king of Okochiri. Vanguard News. Retrieved on 8 May 2021.
  2. Akinrujomu (27 November 2017). Former militant leader Ateke Tom has been crowned king of a kingdom in the oil-rich Niger Delta (en). Legit.ng. Retrieved on 8 May 2021.