Augustine Umoh
Augustine Vincent Umoh bụ kwa prọfesọ Naijiria, ọkachamara na ihe gbasara ụmụ nwanyị, onye na-ahụ maka ịmụ nwa na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị jere ozi dị ka Kọmishọna maka ahụike na Akwa Ibom Steeti. Ọ bụrụ Gọvanọ Udom Emmanuel August họpụtara ya, na 2020 ma Gọvanọ Umo Eno họpụtara ya ọzọ na Julaị 2023.[1][2][3] Ọ bụzi onye ndụmọdụ nnyefe maka ụlọ ọgwụ ọcha mara Steeti na General Hospital na Ikono. [4][5]
Mmalite na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Umoh na Okopedi Ibianang, Ikono Local gọọmenti Area na Akwa Ibom State. Ọ nụ kwa Rosemary Augustine Umoh ma bụrụ ndị a gọziri ha wee Nweta Ụmụaka.[2] Augustine gụsịrị akwụkwọ praịmarị ya na Primary School, Uyo Obio, Akwa Ibom State. Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndrị site na 1978 ruo 1983 na Federal Government College Ikot Ekpene . O nwetara nzere MBBS ya na College of Medicine, Mahadum Lagos site na 1984 wee ruo 1990, wee mechaa otu afọ ya na Ụlọ Ọgwụ Nkuzi nke Mahadum Legas na National Youth Service Corps (NYSC) na General Hospital, Anka na Zamfara steeti nke Naịjirịa. O nwetara diplọma postgraduate ya na ahụike ọmụmụ site na Liverpool School of Tropical Medicine (LSTM), United Kingdom na 2001, e nyekwara ya Fellowship nke West African Kọleji nke Ndị Dọkịta na Ngalaba nke Ọmụmụ Nwa na Ọrịa Ụmụ nwanyị na 2002. Ọ bụkwa Fellow nke International College of Surgeons ma nwee asambodo na Economic Evaluation na Global Health site na Mahadum Washington .[2]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]Na afọ 2020, a họpụtara Augustine dị ka Kọmishọna maka Ahụike na Akwa Ibom Steeti. Ọ bụ kwa Gọvanọ Udom Emmanuel bu onye họpụtara ya, Gọvanụ Umo Eno họpụtara ya ọzọ na Julaị 2023 . [1][6] Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka onye ndụmọdụ nnyefe maka State Specialist Hospital na General Hospital na Ikono.[4]
Edemsibia
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 Sherifat (2020-08-01). Gov Emmanuel to swear-in 8 new EXCO members Monday (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2025-08-18.
- 1 2 3 Commissioner for Health – AKSPHCDA – Akwa Ibom State Primary Healthcare Development Agency (en-US). Retrieved on 2025-08-18."Commissioner for Health – AKSPHCDA – Akwa Ibom State Primary Healthcare Development Agency". Retrieved 2025-08-18.
- ↑ Nigeria (2024-10-11). 12,000 people enrolled in Akwa Ibom health insurance scheme: Commissioner (en-US). Peoples Gazette Nigeria. Retrieved on 2025-08-18.
- 1 2 Nwafor (2025-03-04). Reservations as Gov Eno recalls sacked commissioners as project monitors (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2025-08-18.Nwafor (2025-03-04). "Reservations as Gov Eno recalls sacked commissioners as project monitors". Vanguard News. Retrieved 2025-08-18.
- ↑ FRANK. "Mixed Reactions Trail Appointment Of Ex-Commissioners As Advisors In Akwa Ibom", Thewhistler, March 4, 2025.
- ↑ admin (2024-11-04). Gov Eno Assures on Continuous Spread of Projects Across all LGAs - Akwa Ibom State Government (en-US). Retrieved on 2025-08-18.