Ausbeth Ajagu

Ausbeth Ajagu (amuru Ọktoba 26, 1965) bu onye okachamara ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria na Canada. Ọ bụ onye isi oche nke ụlọ ọrụ Betcy Group na Onye isi oche nke Academy of Entrepreneurial Studies. [1] [2][3]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Ajagu na Asaba, Naijiria. Ọ bụ ezie na ọ bi na Canada, ọ bụ nwa afọ Nimo na Njikoka na Anambra Steeti. Ọ gara Oneh Primary School, Asaba, Delta Steeti site na 1971 ruo 1976 ma mesịa Osadedenis High School site na 1976 ruo 1981.
Ọ bụ nwa akwụkwọ nke Federal School of Arts and Science, Sokoto tupu ọ gawa Mahadum Bendel Steeti (nke bụzi Mahadum Ambrose Alli ), Ekpoma. Ka ọ gachara nzere nke mbụ na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ gụchara summa cum laude na Mahadum Lagos Steeti ebe ọ nwetara nzere masta na mmụta gbasara iwu na 1997. Ọ nwetara Ph.D. na nchịkwa azụmahịa sitere na Mahadum California Coast dị na United States. [4]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ajagu malitere ọrụ ya na Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọrụ nchịkwa site na 1988 ruo 1989. Ọchịchọ ya maka ọchụnta ego mere ka ọ malite azụmahịa nke ya na 1992. O guzobere Oak Hotels, Lagos, Abuja Oxford Hotels, Lekki Oxford Hotels, Lagos. Goldfish Insurance Brokers Ltd na President, Governing Council, AES Excellence Club, yana AES Nigeria, Canada.[1]
A họpụtara ya dị ka onye nduzi nke Standard Alliance Capital Ltd na 2007.
Ajagu jerela ozi ma na-ejekwa ozi gọọmenti etiti Naijiria n'ọrụ dị iche iche. Ọ bụ onye so na Nigerian Economic Summit Group ma rụọ ọrụ na bọọdụ nke Corporate Affairs Commission, Naịjiria. Ọ bụkwa onye so na kọmitii onyeisiala na-ahụ maka imepụta ọrụ n'oge ọchịchị onye bubu onye isi ala Naịjiria Goodluck Jonathan.[5]
Ajagu bụ onye otu Academy for Entrepreneurial Studies Nigeria, Institute of Corporate Administration of Nigeria, Chartered Institute of Finance Consultants, IoD Nigeria, na CICMA. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onyeisi oche nke Institute of Directors Industry Committee site na 2003 ruo 2007. [1]
Ihe nrite na mmata
[dezie | dezie ebe o si]Onye isi ala Naijiria Umaru Musa Yar'Adua nyere ya onyinye nkwanye ugwu nke onye otu Order of the Federal Republic na Disemba 2007. N'afọ 2014, e nyere ya National Productivity and Order of Merit site n'aka onye bụbu onye isi ala Naijiria Goodluck Jonathan.[6][7]
Ndụ onwe onye
[dezie | dezie ebe o si]Ọ lụrụ Anuli Ausbeth-Ajagu ma nwee ụmụ atọ.[8]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 3 Ausbeth Ajagu: The multi-talented entrepreneur. Transparent Nigeria. Archived from the original on 2017-07-06. Retrieved on 2017-07-15.. Transparent Nigeria. Archived from on 2017-07-06. Retrieved 2017-07-15.
- ↑ ausbeth ajagu. The Eagle Online. Retrieved on 2017-07-15.
- ↑ "Ghana prevented Nigerians from selling generator – Ajagu", Vanguard News, 2012-05-21. Retrieved on 2017-07-15.
- ↑ Ausbeth Ajagu Exclusive – Why Most People Fail in Marriage But Succeed in Business. Yes International! Magazine. Retrieved on 2017-07-15.
- ↑ "Aliko Dangote to lead National Committee on Job Creation", Economic Confidential. Retrieved on 2017-07-15.
- ↑ STAR INFORMATION: List of Nigeria's 2007 National Honours recipients. NigerianMuse. Retrieved on 2017-07-15.
- ↑ 30 to receive 2013 productivity award. Archived from the original on 2017-12-01. Retrieved on 2017-11-29.
- ↑ Secrets of my Successful Marriage to an Actress – Ausbeth Ajagu, Chairman Betcy Group Of Companies (en-US). nigerianbestforum.com. Retrieved on 2017-07-15.