Gaa na ọdịnaya

Awadeya Mahmoud

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mahmoud na emume mmeri maka onyinye ya Women of Courage

Awadeya Mahmoud (Arabic: عوضية محمود) onye Sudan na onye nchoputa na onye isi oche nke Women's Food and Tea Sellers Cooperative na Women's Multi-Purpose Cooperative for Khartoum state, Sudan.[1][2] Na 28 Maachị 2016, Ngalaba Ọchịchị United States kwupụtara ya dịka otu n'ime ndị nnata nke International Women of Courage Award maka afọ ahụ..[1]

A mụrụ Awadeya Mahmoud na 1963 na Sudan, mpaghara South Kordofan ma mgbe esemokwu gasịrị, ezinụlọ ya kwagara Khartoum. Ọ lụrụ di ma na 1986 ọ malitere ire tii iji nweta ihe ọ ga-eri. Nke a bụ ọrụ dị ala mana ọ dị ya mkpa ịkwado ezinụlọ ya. N'afọ 1990, ọ malitere otu ọrụ nke nyere ndị otu ya enyemaka na nkwado iwu. A kpọrọ ya Women's Food and Tea Sellers' Cooperative na Women's Multi-Purpose Cooperative.[2][3]

Site n'ụlọ ọrụ na-arụkọ ọrụ ọnụ, a ga-enyezi ụzọ iwu kwadoro iji lụso ndị ọchịchị ọgụ mgbe ha bukọrọ ngwá ọrụ nke ndị òtù (karịsịa ụmụ nwanyị) maka ire tii na nri n'okporo ámá. Ọ bụghị ihe niile na-aga nke ọma ma ọ ga-anọrịrị afọ anọ n'ụlọ mkpọrọ mgbe ya na ndị ọzọ ji ụgwọ ka ha nwesịrị ego na-adịghị mma. Mgbe a tọhapụrụ ya, ọ gara n'ihu na-akwado ụmụ nwanyị na ndị otu ahụ nwere ndị otu 8,000 na Khartoum.[1] Otu a bịara ịnọchite anya ụmụnwaanyị nsogbu Darfur na mpaghara abụọ chụpụrụ..

Nsọpụrụ

[dezie | dezie ebe o si]

Na 28 Maachị 2016, Ngalaba Ọchịchị United States kwupụtara ya dị ka otu n'ime ndị nnata iri na anọ nke International Women of Courage Award maka afọ ahụ.[1] A kọrọ na ọ laghachiri n'ọrụ ya ozugbo ọ nwetasịrị ihe nrite ya n'agbanyeghị na o bu n'obi ịgbatị ọrụ ya na mpụga Khartoum.

Edemsibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. "State Department honors 14 leaders from around the world". The New York Times. Archived from the original on 3 May 2016. Retrieved 30 March 2016.
  2. "Biographies of 2016 Award Winners". The U.S. Department of State. Archived from the original on 30 March 2016. Retrieved 30 March 2016.
  3. "Awadeya Mahmoud Koko: From tea seller to union leader to 'mother of the revolution'". Mada Masr (in Bekee ndị America). Retrieved 2021-06-11.