Bako Sarai
Bako Sarai bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria si Kano Steeti onye jere ozi dị ka onye nnọchi anya Dawakin Kudu / Warawa na Ulo ndí Nnọchiteanya na ime Mgbakọ Mba. A họpụtara ya na afọ 1999 ma jee ozi ruo afọ 2003, mgbe ahụ a họpụtara ya ọzọ na afọ 2003 wee gaa n'ihu ruo afọ 2007 dị ka onye otu People's Democratic Party (PDP). Mustapha Dawaki Bala nọchiri ya n'afọ 2011.[1][2]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Bako Sarai n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1952 na Kano Steeti, Naịjirịa. O nwere M.Sc. na Injinia site na Crafield Institute of Technology na England.
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Sarai rụrụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ gọọmentị ime obodo n'okpuru Social Democratic Party (S.D.P.) ma bụrụ onye otu Mgbakọ Mba nke Naịjirịa, na-eje ozi na Ụlọ ndị Nnọchiteanya site na afọ 1999 ruo afọ 2003 na ọzọ site na afọ 2003 ruo afọ 2007.[2][3]
Mgbe ọ gụsịrị ọrụ ya, Mustapha Dawaki Bala nọchiri ya n'afọ 2011.[1]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 Citizen Science Nigeria (en). citizensciencenigeria.org. Retrieved on 2025-01-04.
- ↑ 2.0 2.1 House of Representatives Member | Honourable Bako Sarai (2007-10-20). Archived from the original on 20 October 2007. Retrieved on 2025-01-04.
- ↑ The House of Representatives, Federal Republic of Nigeria (2007-12-21). Archived from the original on 21 December 2007. Retrieved on 2025-01-04.