Gaa na ọdịnaya

Bata language

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Bata language

Bata (Gbwata) bụ asụsụ Afro-Asiatic a na-asụ na Naijiria na Adamawa Steeti na Numan, Song, Fufore na ọchịchị ime obodo Mubi, Cameroon na mpaghara ugwu n'akụkụ ókèala ya na Naijiria. Asụsụ ndị a bụ Demsa, Garoua, Jirai, Kobotachi, Malabu, Ndeewe, Ribaw, Wadi, na Zumu (Jimo). A na-elekarị ya anya dị ka otu asụsụ dị ka Bacama.

Blench (2019) depụtara Bwatye (endonym: Ɓwaare; exonym: Bachama) dị ka asụsụ dịgasị iche iche. Asụsụ ndi a dị na Adamawa Steeti (Numan na ọchịchị ime obodo Guyuk) na Kaduna Steeti (n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke obodo Kaduna).[1] A na-akpọkwa ya Kwā ɓwàryē.[2]

ALCAM (2012) depụtara Gbwata (Bwaara na Naịjirịa) dị ka otu ụdị nke Bata. Ndị na-asụ asụsụ a na-ezo aka na ọ dị ka "asụsụ nke Gbwata", nke a na-akpọ Magbwatá, Magbwati nke anakpọ kwa

Magbwatiye na Cameroon.[3]

Na Cameroon, e nwere ụdị Gbwata atọ:[3]

  • Demsa (obodo Demsa dị na ngalaba Bénoué, nke dị n'ókè Naijiria, iri atọ kilomita n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke Garoua)
  • Kokoumi (obodo Garoua, ngalaba Bénoué, nke dị n'akụkụ Osimiri Benue)
  • Faro (Jelepo na obodo Beka, ngalaba Faro)

Ndeewe bụ olumba nke ndị Gbwata bi dị anya site n'ikpere osimiri Faro na Benue, ebe "Bata ọrụ ugbo" bi. Ọ bụ naanị mmadụ iri na abụọ na-asụ asụsụ a n'ogea a.[3]

Bacama bụ agbụrụ Gbwata nke bi na Naịjirịa.[3]

E nwere mmadụ puku abụọ na narị ise na asụ asụsụ a na Cameroon.[3]

  1. Blench (2019). An Atlas of Nigerian Languages, 4th, Cambridge: Kay Williamson Educational Foundation. 
  2. Bata materials from Raymond Boyd
  3. 1 2 3 4 5 (2012) in Binam Bikoi: Atlas linguistique du Cameroun (ALCAM), Atlas linguistique de l'Afrique centrale (ALAC) (in fr). Yaoundé: CERDOTOLA. ISBN 9789956796069. Binam Bikoi, Charles, ed. (2012). Atlas linguistique du Cameroun (ALCAM) [Linguistic Atlas of Cameroon]. Atlas linguistique de l'Afrique centrale (ALAC) (in French). Vol. 1: Inventaire des langues. Yaoundé: CERDOTOLA. ISBN 9789956796069.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]