Gaa na ọdịnaya

Beatrice, Countess nke Arundel

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Beatrice of Portugal (Portuguese: Beatriz; c. 1380[1] – Nọvemba 1439[2]), LG,[1] bu nwa John I of Portugal na Inês Pires mụtara, ha mụtara ya tupu alum dị na nwunye nna ya na Philippa of Lancaster, nwa nwanyị nke John of Gaunt.[4]O bu nwanne nwaanyị Afonso, Duke of Braganza na nwanne nwanyị nke ọkara nke eze Edward of Portugal, Infante Peter, Duke nke Coimbra, Henry nke Navigator, Isabella nke portugal, Duchess nke Burgundy, John, Constable nke Portugal, na Ferdinand nke Saint Prince. Eze nwaanyị Philippa onye na-ahụ maka ọrụ agụmakwụkwọ nke gbasara ụmụ di ya mụtara n'alụghị di ya.[4]

A mụrụ Beatrice n'afọ dị ka 1380, [1] ma eleghị anya na obodo Veiros, Alentejo, Portugal. Ụfọdụ na-ekwu na nne ya Inês Pires bụ "nwa nwanyị nke onye Juu na-eme akpụkpọ ụkwụ". Mana ndị ọzọ na-ekwu ete o si n'ezinụlọ ochie Portuguese. N'ọnwa Eprel n'afo 1405, e mere emume agbamakwụkwọ ya na Thomas Fitzalan, 12th Earl of Arundel site na nnọchiteanya na Lisbon, n'otu afọ ahụ, ọ gara England, ya na nwanne ya nwoke Afonso na ọtụtụ ndị na-akwado eze na ndị inyom ya na-echere ebe emume agbụrụ ahụ mere na onwa 26 Nọvemba n'afo 1405 na London, na Eze Henry nke Anọ bịara.[4]

Thomas nwụrụ na 13 Ọktoba 1415. Beatrice lụrụ John Holland, 2nd Earl of Huntingdon, nwa nwanne nne ya Eze nwaanyị Philippa, n'afo 1432. Mgbe ụfọdụ, a na-agbagwoju ya anya na nwanyị Portuguese ọzọ, Beatrice Pinto, [2] nwunye Gilbert Talbot na Thomas Fittiplace. A maghị ma Beatrice nwere ụmụ site na alụmdi na nwunye ya ọ bụla. Beatrice nwụrụ na Bordeaux, France na onwa Nọvemba n'afo 1439. Mgbe ọ nwụsịrị, di ya lụrụ Lady Anne Montagu.

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

 

Ịgụ ihe ọzọ

[dezie | dezie ebe o si]
  • Douglas Richardson's Royal Ancestry (2013), Vol. II, peeji nke di na 538-539 & 613, na Vol. [Ihe e dere n'ala ala nke peeji]  
  1. Collins (2000). The Order of the Garter 1348-1461: Chivalry and Politics in Late Medieval England. Clarendon Press. ISBN 9780198208174. Retrieved on 27 October 2021. 
  2. Elbl (2023). "The Pregnant Abbess: Sex, Social 'Norms', and Nuns in the Lower Douro Valley Southern Hill Country, 1410s – 1440s". Portuguese Studies Review 31 (2): 7–69. Retrieved on 23 July 2024. . The last part of the article discusses "the other Portuguese lady", Beatriz Pinto (and her two spouses -- Gilbert Talbot and Thomas Fettiplace [not 'Fittiplace']), at length, in context and with extensive secondary and primary sources (English and Portuguese). The article includes a digital facial reconstruction from burial effigy. The pages specifically pertaining to Beatriz Pinto and the confusion involving her and the Countess of Arundel are 58-69.