Beatriz Francisco
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Brazil |
| Aha enyere | Beatriz |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 11 Julaị 1996 |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Portuguese |
| Ọrụ ọ na-arụ | rhythmic gymnast |
| Ụdị egwuregwu | rhythmic gymnastics |
Beatriz Pomini Francisco (amụrụ na 11 Julaị afo 1996) bụ onye obodo Brazil na-eme egwuregwu mmega ahụ. Ọ na-anọchite anya mba ya na asọmpi mba ụwa. O sonyere na asọmpi ụwa, gụnyere na afo 2015 World Rhythmic Gymnastics Championship.[1]
N'afọ 2013, Beatriz Francisco na ndị ọzọ so n'òtù Brazil - Eliane Sampaio, Bianca Mendonça, Debora Falda, Francielly Pereira na Gabrielle Silva - nwetara ọla nchara na bọọlụ 3 + 2 ribbons na ihe mmemme Minsk nke afo 2013 Rhythmic Gymnastics World Cup Series. Nke a abụghị naanị ihe nrite mbụ nke Brazil kamakwa nke Latin America na usoro Rhythmic Gymnastics World Cup, ọ bụkwa naanị oge nke abụọ mba si Amerịka nwetara ihe nrite na asompi ịko mba uwa, mgbe Mary Fuzesi nke obodo Canada nwetara ọla nchara na eriri na afo 1990 FIG World Cup Final.
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 2015 World Rhythmic Gymnastics Championships athletes - Beatriz Francisco. Longinestiming.com. Retrieved on 27 January 2016.