Bernadette Jagger
Bernadette Maria Jagger (amụrụ 26 February 1958) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Namibia. Ọ bụ onye SWAPO wee bụrụ onye a họpụtara na kọmitii etiti pati ahụ na 2012. Na 2015 ọ meriri oche na nzuko omeiwu.[1] N'ime mgbanwe nke ụlọ ọrụ na February 2018, a họpụtara ya osote onye minista na-ahụ maka gburugburu ebe obibi na njem nlegharị anya, nọchiri Tommy Nambahu..[1]
Jagger bụ onye nkuzi site na ọrụ. O nwere asambodo na agụmakwụkwọ praịmarị dị ala na nke dị elu site na Sohnge Training College na Mahadum nke Namibia, ma rịa elu site na ịbụ onye nkuzi na 1976, osote onye isi na 1992, ruo onye isi nchịkwa nke Kunene na 2012. Jagger nwetakwara diplọma postgraduate na nkuzi asụsụ Bekee na nchịkwa na Mahadum Warwick, na Bachelor of Philosophy in Education na Mahadim Exeter . [2]
Jagger bụ onye isi kansụl nke obodo Riemvasmakers, otu agbụrụ nke Ndị Nama.[3]
Edemsibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Matthys. "President reshuffles Cabinet—Vice President relieved of duties", Namibia Economist, 8 February 2018.
- ↑ Jagger, Bernadette Maria. Parliament of Namibia. Archived from the original on 22 October 2019. Retrieved on 22 October 2019.
- ↑ Miyanicwe. "Riemvasmakers defend settlement", The Namibian, 20 October 2019, p. 6. Retrieved on 23 October 2019.