Gaa na ọdịnaya

Betty Anyanwu-Akeredolu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Betty Anyanwu-Akeredolu
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Aha ọmụmụBetty Chioma Anyanwu Dezie
Aha enyereBetty Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Julaị 1953 Dezie
Ebe ọmụmụOwẹrrẹ Dezie
Dị/nwunyeOluwarotimi Odunayo Akeredolu Dezie
Ọrụ ọ na-arụọkà mmụta sayensị Dezie
Ụdị ọrụ yaSTIM Dezie
Ebe agụmakwụkwọUniversity of Nigeria, University of the Philippines Dezie
Onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Congress Dezie
Ọnọdụ ahụikeKansa ara Dezie

Betty Anyanwu-Akeredolu (a mụrụ n'afọ 1953) bu akwakọlchọristị, onye na-enyere ndi mmadu aka, ma burukwa nwunye onye isi ala nke Ondo Steeti na Naijiria. Ọ lụrụ gọvanọ bụ Oluwarotimi Odunayo Akeredolu . [1] O bu onye hiwere Breast Cancer Association nke Naijiria. [2]

Omumu na mmuta

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Betty Anyanwu- Akeredolu n'ụbọchị nke 20 n'ọnwa Julaị n'afọ 1953, na ezi na ulo nke onye isi BUB na Nneoma Dora Anyanwu, na Emeabiam, nke Owerri-West, na Imo Steeti . [3] Anyanwu-Akeredolu gara Mahadum nke Naijiria,dị na Nsukka ebe ọ nwetara nzere bachelọ nke sayensị na zuuọlọji n'afọ 1977. O nwere akara nzere masta na sayensị nke azụ, nke isi agụmagụ ya bụ akwakọlchọristị, na Mahadum nke Philippines dị na Visayas n'obodo Iloilo . [4]

Ọ malitere ọrụ ya dị ka ọkachamara n'ịkụ azụ mgbe ọ na-arụ ọrụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Azụ n'ogo gọọmentị etiti. Ọ lara ezumike nká n'afọ 2005. [5] [6] Ọ bu onye na-azu ahia azụ ma na enyekwa ndumodu site na ulo oru ya, Aquatek Farms Ventures. [7] Na mgbakwunye, ọ banyela na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kemgbe afọ 2007 ma na-arụsi ọrụ ike n'oge a (2017). [8]

Afọ ọma na inyere ndi mmadu aka

[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 1997, a chọpụtara na ọ na-arịa kansa ara. Ọ gara nlekọta ma gbakee. Ọ malitere otu ụlọ ọrụ bụ ndị ọrụ ebere, Breast Cancer Association of Nigeria (BRECAN) [9] iji mee ka a mata banyere ọrịa a. O ritela ugo na ntunye ọrụ ya na mbọ ọ na-agba i buso ọrịa kansa aha na Naịjirịa. [6]

Ọ bụkwa onye nkwado nke otu ‘Bring Back Our Girls’. [10]

Ndụ onwe ya

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụrụ Oluwarotimi Odunayo Akeredolu, SAN . [10] [6] Ha nwere ụmụ anọ na ụmụ ụmụ anọ.

Ebe m si dee

[dezie | dezie ebe o si]