Betty Awori Engola

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Betty Awori Engola
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Aha enyereBetty Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Disemba 1960 Dezie
Ebe ọmụmụUganda Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụnta ego, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the Parliament of Uganda, Member of the Parliament of Uganda Dezie
Mpaghara ntuli akaApac Dezie
ebe agụmakwụkwọShimoni Demonstration School, Tororo Girls School Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Resistance Movement, National Resistance Movement Dezie

Betty Awori Engola (amụrụ na 24 Disemba na afo 1960) nke a na-akpọkwa Betty Engola bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ugandan. Ọ bụ nwanyị nnọchi anya distrikti nke distrikti Apac n'okpuru pati National Resistance Movement na-achị na 10th Parliament (na afo 2016 ruo na afo 2021).[1][2]

Mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1974, ọ gụsịrị akwụkwọ Primary Leaving Examination na Shimon Demonstration School. N'afọ 1978, ọ nwetara asambodo agụmakwụkwọ nke Uganda na St Josephs Girls School, Nsambya. Awori gụsịrị akwụkwọ Uganda Advanced Certificate na Tororo Girls School n'afọ 1981. N'afọ 1984, ọ sonyeere Mahadum Makerere, gụsịrị akwụkwọ na Bachelor of Arts na Social Science.[3]

Ahụmahụ ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Site na afo 2009 ruo na afo 2010, Betty Awori Engola jere ozi dị ka onye otu kansụl na-achịkwa na Uganda Technical College, Lira. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye otu Board n'etiti na afọ 2005 na afo 2008 na National Agricultural Advisory Services. Ọ rụrụ ọrụ na Uganda Advisory Board of Trade dị ka onye ọrụ azụmahịa site na afo 1986 ruo na afo 1987. Site na afo 1988 ruo na afo 2001, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọrụ azụmahịa mba ọzọ na Ministry of Tourism, Trade and Industry. Site na afo 2016 ruo taa, ọ na-eje ozi dị ka onye omeiwu na ụlọ omeiwu nke Uganda.[4]

Ọrụ ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Betty Awori Engola na-eje ozi na ọrụ ọzọ na Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda dị ka Kọmitii na Sayensị na Teknụzụ site na ndị otu.[5] O sonyere na nnọkọ nke iri na anọ nke United Nations Conference on Trade and Development na Nairobi, Kenya nke mere site na 17-22 Julaị na afo 2016. Awori sonyekwara na mmepe nhazi nke Local Government Budget Framework Paper maka Apac District.

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Nzukọ omebe iwu nke Uganda.
  • Ógbè Apac
  • Ndepụta nke ndị otu nke iri nke Uganda
  • National Resistance Movement
  • Onye omeiwu
  • Tonny Ayoo
  • Akora Maxwell
  • Ebong Patrick

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2020-04-15.
  2. Find an MP | The Parliament. parliamentofuganda.nwtdemos.com. Retrieved on 2020-04-15.
  3. Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2020-04-15.
  4. Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2020-04-15.
  5. Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2020-04-15.