Betty Awori Engola
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Uganda |
| Aha enyere | Betty |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 24 Disemba 1960 |
| Ebe ọmụmụ | Uganda |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ọchụnta ego, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
| Ọkwá o ji | Member of Parliament of Uganda, Member of Parliament of Uganda |
| Mpaghara ntuli aka | Apac |
| Ebe agụmakwụkwọ | Shimoni Demonstration School, Tororo Girls School |
| Onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | National Resistance Movement |
Betty Awori Engola (amụrụ na 24 Disemba na afo 1960) nke a na-akpọkwa Betty Engola bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ugandan. Ọ bụ nwanyị nnọchi anya distrikti nke distrikti Apac n'okpuru pati National Resistance Movement na-achị na 10th Parliament (na afo 2016 ruo na afo 2021).[1][2]
Mmalite na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]N'afọ 1974, ọ gụsịrị akwụkwọ Primary Leaving Examination na Shimon Demonstration School. N'afọ 1978, ọ nwetara asambodo agụmakwụkwọ nke Uganda na St Josephs Girls School, Nsambya. Awori gụsịrị akwụkwọ Uganda Advanced Certificate na Tororo Girls School n'afọ 1981. N'afọ 1984, ọ sonyeere Mahadum Makerere, gụsịrị akwụkwọ na Bachelor of Arts na Social Science.[3]
Ahụmahụ ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Site na afo 2009 ruo na afo 2010, Betty Awori Engola jere ozi dị ka onye otu kansụl na-achịkwa na Uganda Technical College, Lira. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye otu Board n'etiti na afọ 2005 na afo 2008 na National Agricultural Advisory Services. Ọ rụrụ ọrụ na Uganda Advisory Board of Trade dị ka onye ọrụ azụmahịa site na afo 1986 ruo na afo 1987. Site na afo 1988 ruo na afo 2001, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọrụ azụmahịa mba ọzọ na Ministry of Tourism, Trade and Industry. Site na afo 2016 ruo taa, ọ na-eje ozi dị ka onye omeiwu na ụlọ omeiwu nke Uganda.[4]
Ọrụ ndị ọzọ
[dezie | dezie ebe o si]Betty Awori Engola na-eje ozi na ọrụ ọzọ na Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda dị ka Kọmitii na Sayensị na Teknụzụ site na ndị otu.[5] O sonyere na nnọkọ nke iri na anọ nke United Nations Conference on Trade and Development na Nairobi, Kenya nke mere site na 17-22 Julaị na afo 2016. Awori sonyekwara na mmepe nhazi nke Local Government Budget Framework Paper maka Apac District.
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Nzukọ omebe iwu nke Uganda.
- Ógbè Apac
- Ndepụta nke ndị otu nke iri nke Uganda
- National Resistance Movement
- Onye omeiwu
- Tonny Ayoo
- Akora Maxwell
- Ebong Patrick
Ihe odide
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2020-04-15.
- ↑ Find an MP | The Parliament. parliamentofuganda.nwtdemos.com. Archived from the original on 2021-11-30. Retrieved on 2020-04-15.
- ↑ Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2020-04-15.
- ↑ Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2020-04-15.
- ↑ Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2020-04-15.