Bisoye Tejuoso

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bisoye Tejuoso
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1916 Dezie
Ebe ọmụmụAbeokuta Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1996 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụnta ego Dezie

Chif Esther Bisoye Tejuoso (1916 - 19 Septemba 1996) bụ nwafọ Naijiria na-achụ nta ego si Abeokuta . [1] A mụrụ ya na ezi n’ulo onye ọrụ ugbo bu Egba onye bubukwa onye isi n'Abeokuta. Ya onwe ya jidere ọkwa onye isi nke Iyalode, eziokwu nke mere ya onye a ma ama na ihe gbasara Egba.

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Tejuosho n’ezinaụlọ na-achị Egba, nna nna ya bụbu Oba Karunwi, Osile nke Oke-Ona, n'Abeokuta. Ọ gụrụ akwụkwọ na Igbein Primary School, n'Abeokuta tupu ọ gaa Idi Aba Teacher’s Training College, n'Abeokuta. [2] Mgbe ọ dị afọ 18, ọ lụrụ onye nkụzi, Joseph Somoye Tejuoso ma mesịa soro ya gaa Zarịa, ebe ọ na-arụ ọrụ. Na Zarịa, Tejuoso nwere ọganihu n'ahịa nri na ndịda Naijiria; o si n’ọdụ ụgbọ oloko bufee ngwongwo si Zaria gawa Legos. Na mbido afọ 1950, ọ ghọrọ onye nnọchi anya ụlọ ọrụ United African Company ,  na n'afọ ndị sochirinụ, ụlọ ọrụ Vono gbakwunyere ndị na - ewetara ya ngwaahịa. O nwere ezigbo ọganihu n'oge a were nweta ala na mpaghara dị iche iche nke Naijiria. Na mmalite afọ 1960, ọ bụ nnukwu onye na-ere ahịa akwa ndina Vono na Broad St bụrụkwazị mmadụ onye ọchụnta ego si na Norway bịakwutere maka mmekorita ị zụ ahịa akwa ndina. Mmekọrịta a malitere n'afọ 1964 mgbe Nigerian Polyurethane Ltd bidoro ị mepụta akara akwa ndina nke ya bụ Cool Foams.  [ <span title="This claim needs references to reliable sources. (May 2018)">see okwu dị mkpa</span> ]

Ọrụ na ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1970, mgbe ya na ndị mmekọ ya e kwenyeghi n'ahịa akwa ndina na kapeeti, o kpebiri iwu ụlọ ọrụ nke ya. O nwetara ego n’aka ụlọ ọrụ ‘Nigerian Industrial Development Bank’ ma hiwe ya, ụlọ ọrụ Teju, bụ ụlọ ọrụ pụrụ iche n’imepụta akwa ndina. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọ na-azụ ahịa ndị ọzọ. A na-echeta ya dị ka nwanyị ọsụ ụzọ nke ruru nzuko nke nnwere onwe ego na ọganihu. [3]

E gburu ya n'ụbọchị nke 19 n'ọnwa Septemba n'afọ 1996 mgbe ọ dị afọ 80 n’etiti esemokwu banyere ị bụ Ọba nke obodo Egba. Ruo ugbu a, ndị ọchịchị Naijiria e mechabeghị nnyocha maka ogbugbu ya. [4]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Alaafin Adisa on Instagram: “-Mrs Bisoye Esther Tejuosho is Nigeria’s first female industrialist. Bisoye Tejuoso was a prominent Nigerian businesswoman from Abeokuta.…” (en).
  2. Kuti, A. (1999). Ten years on, a decade of royal selfless service 20th of May 1989 to 20th of May 1999: Salute to Kabiyesi Alaiyeluwa Oba Dr. Adedapo Adewale Tejuoso. Abuja, Nigeria. P. 74-76
  3. Bisoye Tejuoso biography, net worth, age, family, contact & picture.
  4. Archived copy. Archived from the original on 2011-08-31. Retrieved on 2020-11-07.