Bitter (novel)
Bitter bụ akwụkwọ akụkọ nke ndị ntorobia na-eto eto nke onye edemede Naijiria bụ Akwaeke Emezi dere, Knopf bipụtara ya, na 15 Febụwarị 2022. Akwụkwọ a n’esote akwụkwọ Emezi dere nke anakpọ Pet, Bitter na akọ akụkọ banyere nwa agbọghọ ojii nọ na agbata afọ iri na iri n’iteghete bi n'obodo na-enwe nsogbu site na ngagharị iwe na ime ihe ike, mgbe niile.
Atụmatụ
[dezie | dezie ebe o si]Bitter nọrọ nke ukwuu n'oge ntorobịa ya n'ụlọ nlekọta. Ọ nwere obi ụtọ mgbe a họpụtara ya isonyere “Eucalyptus,”ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ebe ọ nwere ike ilekwasị anya na esemese ya, ebe ụmụaka ndị ọzọ pụrụ iche n’esemese gbara ya gburugburu. N'aka nke ọzọ, ngagharị iwe ikpe ziri ezi naeme n'okporo uzọ ámá dị nso n’ụlo akwụkwọ ya, na-eme ka ọ nwee nchegbu. Ọ na-anafelụ nsogbua site n'ịse ụmụ anụmanụ ma mee ka ha dị ndụ. Ịhe ọsise zoro ezo a ọ na ese na eme ya iche na ihe niile bụ etu ahụ ka ọdị, ruo mgbe otu n'ime ihe ndị ọ sere ese wepụtara ajọ nsí ma ghọọ ihe ike. Bitter ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji kwụsị anụ ọhịa ahụ o mere.
Ihe gbasara odee
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe Emezi malitere ide Pet na 2017, ha mere atụmatụ ka ọ bụrụ akụkụ nke trilogy mana ha mechara hapụ echiche ahụ. Maka Bitter, Emezi "chọrọ ide banyere mgbanwe kama obodo" na otu ndị nwere ike ịchọ inyere aka abụghị iwu na ha ga achọ ịnọ n'ihu.[1]
Nnabata
[dezie | dezie ebe o si]Kirkus Reviews nyere akwụkwọ ahụ nyocha dị egwu, nke ha gosipụtara "mgba aghara n'oge" dị na edemede Emezi ka ndị na-ede akwụkwọ ga-ekpebi "mgbe na otu esi eme ihe n'ihu ime ihe ike na-enweghị isi, n'etiti ihe omume obi ọjọọ ndị ọzọ. " [2] Na mgbakwunye, onye nyocha ahụ kwuru otú ndị dị iche iche "na-enweta ịhụnanya na nkwado" site n'aka ndị gbara ha gburugburu. Publishers Weekly toro ndị edemede ahụ, ọkachasị n'ihi na ha nwere "ụlọ ọrụ iji kọwaa ọdịnihu maka onwe ha na obodo ha. " Ha kpọkwara onye isi na ndi nọ n’akụkọ a, Bitter, "ihe niile a na-echeta maka mgbagwoju anya ya".[3]
Natalie Berglind, onye nyochara maka The Bulletin of the Center for Children's Books, kpọrọ akwụkwọ akụkọ ahụ n'oge, n'ihi na "ọ na-abụkarị ndị Ojii na-eme ngagharị iwe megide ụwa na-ezighị ezi. " [4] Berglind kwukwara otú ọ na-achọ ị ghara ikwunyere isiokwu nke iji ime ihe ike “wee ghasaa ọchichi ogologo oge”na otu onye edemede ahụ anaghị enye azịza nye ajụjụ ndị metụtara ya mana kama ọ na-atụ anya ịkpali akụkọ”. Ha kwukwara na ngwucha” na ngwucha akwụkwọ akụkọ a gwụrụ na mberede" mana ọnyere ndi ntorobia n’eto eto nnukwu nchekwube banyere ụwa nachọghị ịma maka agamnihu ha .” [4]
Susan Harari, na-ede maka Massachusetts' Youth Services Book Review, na-enye ya kpakpando ise (n'ime 5) ma kwunyekwara akwụkwọ ahụ nye "Ndị na-agụ akwụkwọ nwere ike ịghọta aghụghọ Emezi ma nwee afọ ojuju na-enyocha ajụjụ na-enweghị azịza dị mfe;" ọ tụkwara alo ka ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Ọ́bá akwụkwọ ọha dobe ya bụakwụkwọ na ọba akwụkwọ ha .[5]
Ebensidee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Grey. "Q & A with Akwaeke Emezi", Publishers Weekly, 3 February 2022. Retrieved on 4 February 2022.
- ↑ Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>tag; no text was provided for refs named:0 - ↑ "Bitter", Publishers Weekly. Retrieved on 4 February 2022.
- ↑ 4.0 4.1 Berglind (Feb 2022). "Bitter by Akwaeke Emezi". Bulletin of the Center for Children's Books 75 (6). DOI:10.1353/bcc.2022.0061.
- ↑ Harari (4 March 2022). Bitter by Akwaeke Emezi (en). Youth Services Book Review. Retrieved on 4 July 2023.