Boleslaus nke Atọ, Duke nke Bohemia
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Aha enyere | Boleslav |
| Aha ọma | Duke of Bohemia, duke |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 950s |
| Ebe ọmụmụ | Prague |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 1037, unknown value |
| Ebe ọ nwụrụ | Poland |
| Ńnà | Boleslaus II, Duke of Bohemia |
| Ńné | Emma of Mělník |
| Nwanne | Jaromír, Oldřich, Duke of Bohemia, Václav Přemyslovec |
| Ezinụlọ | Přemyslid dynasty |
| Ọkwá o ji | Duke of Bohemia, Duke of Bohemia |
Boleslaus nke Atọ (ihe dị ka - 1037), nke a na-akpọ Red (Czech: Boleslav III. Ryšavý; iji gosipụta "onye nwere ntutu isii na-acha uhie") ma ọ bụ Blind, onye so n'ezinụlọ nke Přemyslid, bụ Duke nke ndị Bohemia site n'afo 999 ruo n'afo 1002 na obere oge ọzọ n'afọ 1003. N'oge ọchịchị ọgba aghara ya, Bohemia ghọrọ onye na-akwado ogologo agha German-Polish n'etiti Eze Henry nke Abụọ na Duke Bolesław nke Mbụ, "onye nwere obi ike", nke mba Poland.
Ndụ
[dezie | dezie ebe o si]Nwa mbụ nke Duke Boleslaus nke Abụọ "onye nsọ", ma eleghị anya ya na nwunye mbụ ya bụ Adiva, ọ nọchiri n'ocheeze nke Bohemian mgbe nna ya nwụrụ n'afo 999. Boleslaus nke Atọ ghọrọ onye ọchịchị na-adịghị ike ma n'oge na-adịghị anya ya na ụmụnne ya ndị obere ndị bụ Jaromír na Oldřich banyere na esemokwu nketa. A chụpụrụ ha abụọ n'ụlọ ikpe Bavarian nke Henry nke Abụọ na Regensburg, ya na nne ha Dowager Duchess Emma.
Ka ọ na-erule afo1002, nnupụisi nke ndị isi nke ezinụlọ Vršovci (ya na ọgọ Boleslaus) haziri mere ka ọ gbaga mba Germany, ebe Margrave Henry nke ndị Austria nabatara ya. Na mbụ, Henry onye nke Mbụ nyere iwu ka e jide onye ọbịa ya ma kpochie ya n'ihi mmejọ ochie, mana n'oge na-adịghị anya, ọ gbaghara ya ma kwe ya nkwa nkwado. Ka ọ sina di, onye ọchịchị Poland bụ Bolesław nke Mbụ debere onye ikwu Boleslaus bụ Vladivoj n'ocheeze Bohemian. O doro anya na Vladivoj bụ onye aṅụrụma, ma nwụọ n'ime otu afọ. Mgbe ọnwụ Vladivoj n'afo 1003, ndị Bohemian a ma ama kpọrọ Jaromír na Oldřich ka ha si n'ebe a chụgara ha lọta. N'otu n'otu, onye ọ bụla n'ime ha mechara weghara ocheeze na Prague.
Na 9 Febụwarị afo 1003, e weghachiri Boleslaus the Red n'ọchịchị ya site na nkwado agha nke sitere n'aka Duke Bolesław nke Poland. Ụmụnne Boleslaus ndị bụ Jaromír na Oldřich gbagara Germany ọzọ ma tinye onwe ha n'okpuru nchebe nke Henry nke Abụọ. Mana n'oge na-adịghị anya, Boleslaus mebiri ọnọdụ nke ya site n'inye iwu ka e gbuo ndị isi nke ezinụlọ ndịVršovci na Vyšehrad. Dị ka onye na-ede akụkọ ihe mere eme onye aha ya bụ Thietmar nke Merseburg si kwuo, Boleslav ji mma agha nke ya gbuo ọgọ ya nwoke.
Ndị a ma ama ndị lanarịrị ogbugbu ahụ zigara ndị ozi na nzuzo na nke Bolesław the Brave nke Poland ma rịọ ya ka ọ zọpụta ha. Onye ọchịchị Poland ji obi ya kweta ma kpọọ Czech onye nke nya na ya na azakọ otu aha, ka ọ gaa leta ya n'ụlọ ya (ma eleghị anya na Kraków). N'ebe ahụ, e jidere Boleslaus the Red, kpuo chie ya anya ma tụọ ya mkpọrọ. Ọ laghachighị na Bohemia. Bolesław the Brave kwuru na ocheeze ducal maka onwe ya, wakporo ndị Bohemia n'afo 1003 wee weghara Prague n'enweghị mmegide ọ bụla; ọ chịrị dị ka Duke Boleslaus nke anọ ruo ihe karịrị otu afọ. Mgbe ahụ, ọ hapụrụ ihe ọ na-ekwu maka Duchy nke Bohemia ma jiri Jaromír dochie ya, onye, nke Henry nke Abụọ kwadoro, banyere site n'ọnụ ụzọ ámá Prague ma n'afo 1004 nata Duchy nke Bohaemian dị ka fief site n'aka eze ndị Germany.
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Thietmar nke Merseburg. Akụkọ ihe mere eme [Ihe e dere n'ala ala peeji]
- Cosmas nke Prague. Akụkọ ihe mere eme nke ndị Bohemian.