Boohle

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Boohle
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Febụwarị 1999 Dezie
Ebe ọmụmụVosloorus Dezie
Dị/nwunyesingle person Dezie
Ọrụ ọ na-arụsinger-songwriter Dezie
Ebe obibiJohannesburg Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2016 Dezie
agbụrụBlack people Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyablack Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
Ọmụma Mmekọahụheterosexuality Dezie

Buhle Manyathi, onye a maara dịka Boohle, bụ onye South Africa na-agụ egwu na onye na-ede egwu. A maara ya nke ọma maka egwu ya bụ"Yini Na", "Slala Amalunde" na "Siyathandana". Egwú ya bụ nnke mejupụtara na Amapiano, afro-house, afro-soul, na ozioma.[1]

Mmalite ndụ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na obodo Vosloorus, Gauteng ebe onọ tolite.[2] Ọ malitere ọrụ egwu ya mgbe ọ bụ nwata n'afọ 2016 mgbe ya na ụmụnne ya hiwere otu egwu ozioma atọ.[3]

Egwu ya akpọrọ "Yini Na" ruru ọnụ ọgụgụ nke mbụ na chaatị YFM Hot 99 ya na DJ Candii ebe egwu ya ndị ọzọ dịka "Slala Amalunde" pụtara ihe n'ikuku na ụlọ ọrụ redio dịka Jozi FM, Capricorn FM na Kasie FM.[4]

N'onwa julaị afọ 2020, o wepụtara Izibongo, abọm egwu asatọ nke gosipụtara ndị mmepụta egwu ya nọrọla ogologo oge, Tee-Jay na Elastic . Ya na JazziDisciples, Nonny D na DJ Stokie rụkọrọ ọrụ. N'ọnwa Ọktọba afọ 2020, ya na Josiah De Disciple rụkọrọ ọrụ na abọm egwu iri akpọrọ Umbuso Wabam’nyama . Abọm ahụ gosipụtara ndị egwu South Africa Le Sax, Chelete na Mogomotsi Chosen .[5]

N'abalị itoolu n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2021, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye egwu ọhụrụ kachasị mma nke afọ na African Social Entertainment Awards.[6]

Otu egwu ya bụ “Ngixolele” nke onye na-emepụta ihe nchịkọta ụda egwu amapiano bụ Busta 929 nọ n'ọkwa kachasị elu na The Official South African Charts . Otu a chịkọtara ihe karịrị mpụtara ngosi 778 200 gafee Spotify, Apple Music na Deezer.[7]

N'ọnwa Nọvemba afọ 2021, o ritere ihe nrite onye ọhụrụ amapiano kacha mma na nwanyị amapiano kacha mma na awọd South African Amapiano .[8]

Discografị[dezie | dezie ebe o si]

  • Izibongo (2020)

Ihe nrite na nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Emume onyinye Nrite Nsonaazụ
2021 South African Amapiano Awards Best amapiano newcomer
Best amapiano female vocalist
African Social Entertainment Awards Onye egwu ọhụrụ kachasị mma nke afọ

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Boohle to debut at Bahama Lounge. mmegi.bw. Retrieved on 9 December 2021.
  2. Meet Boohle, the vocalist making people dance right now. news24.com. Retrieved on 9 December 2021.
  3. The day that changed Boohle’s life forever. chronicle.co.zw. Archived from the original on 9 December 2021. Retrieved on 9 December 2021.
  4. Who is Boohle? 5 things to know about this rising music star. gq.co.za. Retrieved on 9 December 2021.
  5. #TheRadar: Have You Met Genre Bending Vocalist & Songwriter, Boohle?. thesouthafrican.com. Retrieved on 8 December 2021.
  6. Boohle Reveals The Nomination She Has Bagged At The African Social Entertainment Awards. thesouthafrican.com. Retrieved on 8 December 2021.
  7. Busta 929 surges to the top of RiSA's new charts. thesouthafrican.com. Retrieved on 8 December 2021.
  8. Soulful songstress Boohle wins big at inaugural Amapiano Awards [photos]. thesouthafrican.com. Retrieved on 8 December 2021.