Buchi Emecheta

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

  Florence Onyebuchi "Buchi" Emecheta OBE (amuru ụbọchi iri abụọ na onwa Julaị nke afọ nari itoolu iri anọ na anọ rue ubochi iri abụọ na ise onwa Jenụwarị puku abụọ na iri na asaa) bụ onye edemede a mụrụ na Naijiria, nke bi na UK site na afọ nari itoolu iri isii na abụọ, onye dekwara ihe nkiri na akụkọ ndụ onwe onye, yana ọrụ maka ụmụaka.[1] Ọ bụ onye dere ihe karịrị akwụkwọ 20, gụnyere Second Class Citizen (afọ nari itoolu iri asaa na anọ), The Bride Price (1976), The Slave Girl (1977) na The Joys of Motherhood (afọ nari itoolu iri asaa na itoolu). Allison na Busby bipụtara ọtụtụ n'ime akwụkwọ akụkọ mbụ ya, ebe onye nchịkọta akụkọ ya bụ Margaret Busby.[1]

Isiokwu Emecheta banyere ịgba ohu ụmụaka, ịbụ nne, nnwere onwe ụmụ nwanyị na nnwere onwe site na agụmakwụkwọ nwetara nkwado site n'aka ndị nkatọ na nsọpụrụ. O nwere oge ọ kọwara akụkọ ya dị ka "akụkọ nke ụwa, ebe ụmụ nwanyị na-eche nsogbu zuru ụwa ọnụ nke ịda ogbenye na mmegbu ihu, na ogologo oge ha na-anọ, n'agbanyeghị ebe ha si na mbụ, nsogbu ndị ahụ na-aghọ otu. " Ọrụ ya na-enyocha esemokwu dị n'etiti ọdịnala na oge a.[2] A kọwaala ya dị ka "nwaanyị ojii mbụ na-ede akwụkwọ akụkọ nke nwere ihe ịga nke ọma bi na Britain mgbe 1948 gasịrị".[3]

  1. 1.0 1.1 Busby. "Buchi Emecheta obituary", The Guardian, 3 February 2017.
  2. Buchi Emecheta | Biography, Books, & Facts (en). Encyclopedia Britannica. Retrieved on 9 May 2019.
  3. Dawson, Ashley, "Beyond Imperial Feminism: Buchi Emecheta's London Novels and Black British Women's Emancipation", in Mongrel Nation: Diasporic Culture and the Making of Postcolonial Britain, University of Michigan Press, 2007, p. 117.