Gaa na ọdịnaya

Cecilia Eckelmann Battistello

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Cecilia Eckelmann Battistello
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịItaly Dezie
Aha enyereCecilia Dezie
Aha ezinụlọ yaEckelmann Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Eprel 1950 Dezie
Ebe ọmụmụVicenza Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya6 Maachị 2024 Dezie
Ebe ọ nwụrụHamburg Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụsụ mba Italy Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụnta ego Dezie

Cecilia Eckelmann Battistello (13 Eprel 1950 - 6 Machị 2024) bụ onye ọchụnta ego nke mba Britain a mụrụ n'Ịtali bụ onye isi oche na onye isi nchịkwa nke otu Contship Italia.

Ndụ na ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

Battistello malitere ọrụ ya na ụlọ ọrụ Ụgbọ mmiri CP Switzerland dị ka onye nnọchi anya azụmahịa maka Contship Containerlines. N'oge afọ 1988, a họpụtara ya dịka onye isi ụlọ ọrụ ahụ, ma n' oge afọ 1989 ọ ghọrọ nwanyị mbụ bụ onye isi oche nke UK India Pakistan Bangladesh Shipping Conference . [1] N' oge afọ 1993, ọ ghọrọ osote onye isi ala ma n' oge afọ 1996 a họpụtara ya dịka onyeisi oche na onye isi otu. [2] N' oge afọ 1998, mgbe eresiri Contship Containerlines nye ndi CP Ships, ọ gbara arụkwaghịm dị ka Onye isi oche nke Board wee ghọọ Onye isi oche nke otu Contship Italia.[3] Site na oge afọ 2005 ruo oge afọ 2010 ọ bụ onye isi oche nke FEPORT (Federation of European Private Port Operators). [4]

N'ọnwa Febụwarị nke oge afọ 2020, e bipụtara akụkọ ndụ ya "Il sogno di Cecilia - Una Nave Rosa Attraverso l"Oceano". Onye nduzi na onye edemede telivishọn bụ Aldo Innocenti bọ onye dezikwara akwụkwọ ahụ dị ka onye edemede ma Mondadori bọzi onye bipụtara ya. [Ihe e dere n'ala ala peeji] [citation needed]

Battistello nwụrụ n’obodo Hamburg n’ọbọchi isii nke ọnwa Maachị nke oge afọ 2024, mgbe ọ dị afọ 73. [5]

Onyinye na nsọpụrụ

[dezie | dezie ebe o si]

N'oge afọ 1992, akwụkwọ akụkọ The Times raara ya nye otu isiokwu maka iwebata usoro ụgbọ mmiri ndị e sere ákwà ha na elu ha na-achazikwa pinki pinki.[6][7]

N' oge afọ 2014, o ritere ihe nrite Bellisario na ngalaba "Entrepreneurship".[8]

N' oge afọ 2015, London Containerisation International nyere ya Lifetime Achievement Award iji kwado ọrụ ya na ụlọ ọrụ ụgbọ mmiri zuzikwara ụwa ọnụ. [9][10]

N'oge afọ 2016, e gosipụtara ya na Lloyd's Top 100 Most Influential People in Shipping . [11]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. I primati di Cecilia la signora dello shipping. Repubblica.it. Retrieved on 3 May 2019.
  2. Profile. Marketscreener.com.
  3. "The Lady", l’italiana regina dei container. il Giornale.it.
  4. Battistello a tempo di record. ship2shore.it.
  5. Latorre (6 March 2024). European transport mourns the loss of Cecilia Eckelmann Battistello. TrasportoEuropa. Retrieved on 6 March 2024.
  6. "The Times, London", 25 November 1992.
  7. Battistello: "Ho voluto una nave rosa, è stata un’idea folle ma riuscita". LaStampa.it.
  8. 26a edizione: Donne ad Alta Quota. fondazionebellisario.org.
  9. Cecilia Eckelmann-Battistello presented with CI's Lifetime Achievement Award. Lloyd's List.
  10. Cecilia Battistello wins Life Time Achievement Award. Contshipitalia.com. Archived from the original on 2019-05-03. Retrieved on 2025-09-01.
  11. The most influential people in the shipping industry - one Hundred. Lloyd's List, One Hundred - Edition Seven. Archived from the original on 3 May 2019. Retrieved on 3 May 2019.