Chamu Krishna Shastry

Chamu Krishna Shastry [1] (amụrụ na 23 Jenụwarị 1956) bụ onye India na-akuzi nkuzi nke na-arụ ọrụ maka mweghachi nke Asụsụ Sanskrit. Ọ bụ onye nlekọta na Odeakwụkwọ nke Samskrit Promotion Foundation. Ọ bụkwa onye so guzobeSamskrita Bharati. Ugbu a ọ na-eduzi òtù iji kụzie Sanskrit Site na Sanskrit Na 25 Jenụwarị 2017, Gọọmentị India kwupụtara ihe nrite "Padma Shri" na ngalaba akwụkwọ ọgụgụ na agụmakwụkwọ maka enyemaka ya n'ịkwalite Sanskrit.[2]
Oge ọ malitere
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Shastry na 23 Jenụwarị 1956 n'obodo Kedila dị nso na Mangalore (Bantwal taluk). Ọ mụtara Sanskrit site na Rashtriya Sanskrit Vidyapeetha dị na Tirupati.[3][4] Dị ka onye ọrụ Rashtriya Swayamsevak Sangh dị afọ iri na ụma, a tụrụ Shastry mkpọrọ n'oge ọnọdụ mberede. Onye naanị ya nọ n'ụlọ mkpọrọ, ọ malitere ịgụ akụkọ ndụ ndị mmadụ. N'ihe odide nke Vinayak Damodar Savarkar na Swami Vivekananda ọ mụtara òtù Sanskrit nwere ike isi mepee ihe ọmụma sayensị, mgbakọ na mwepụ na ahụike e liri n'ihe odide Sanskrit oge ochie.[5]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Òtù Sụwakwa Samskrit
[dezie | dezie ebe o si]Krishna Shastry, ya na ụfọdụ ndị enyi ya, gara n'ihu malite òtù ' Sụwakwa Samskrit' na 1981 site na Bangalore.[3] Ụzọ o si akụzi Sanskrit ga ème ka nwa akwụkwọ mụta ya n'otu asụsụ ahụ kama site na asụsụ ọzọ bụ site na ntụgharị.[6] Ịmụta Sanskrit nwere ike ịbụ ihe na-ajụ ajụ n'ihi na a na-akụzi ya site na ntụgharị. Iji mee ka ọ dịkwuo mfe nye ụmụ akwụkwọ, usoro Shastry abụghị ịmụta asụsụ site na ụtọ asụsụ, kama ịkụziri Sanskrit dịka a na-asụ ya.[7] N'ihi ya, ụmụ akwụkwọ anaghị enwe ịma mgba n'inwe mgbagwoju anya nke syntactics. Ọ na-adịzi mfe ịmụta asụsụ ahụ, nke mere na ọbụna ndị na-amaghị akwụkwọ nwere ike ịhọrọ usoro ahụ.
Samskrita Bharati
[dezie | dezie ebe o si]Òtù ahụ mesịrị ghọọ òtù na-abụghị maka uru Samskrita Bharati, òtù ọrụ afọ ofufo raara onwe ya nye ihe gbasara Sanskrit.[3] Mgbalị Shastry mere ka e mepụta "Ụzọ Asụsụ Sanskrit nke Ụbọchị iri'" nke Samskrita Bharati. O meela ka ndị ọrụ raara onwe ha nye maka Sanskrit na mba ahụ gbaa gburugburu nke na-eduga ọrụ mgbasa ozi na steeti dị iche iche. Samskrita Bharati na Shastry anọwo na-etinye usoro ụbọchị iri ndị ahụ n'ọrụ site na netwọk nke ndị ọrụ oge niile dị narị abụọ na iri ise yana ndị ọrụ afọ ofufo Sanskrit Bharati dị puku ise.[7] Ọ na-enyekwa aka na a na-enye usoro ọmụmụ ahụ n'efu.[8] Samskrita Bharati na-azọrọ na o nyerela ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ iri aka ịmụta ma na-ekwurịta okwu n'asụsụ Sanskrit ahụ, otu narị puku n'ime ha bụ ndị kpebirila iji Sanskrit mee ihe n'ụlọ n'ụdị oge ochie.[8]
Mgbalị Shastry emeelakwa ka ọtụtụ mahadum na kọleji nabata usoro nkuzi nkwurịta okwu maka Sanskrit. Na US, SAFL (Samskrit as A Foreign Language) bụ usoro ihe ọmụmụ na-ewu ewu n'etiti ụmụaka ndị si India. Samskrita Bharati na-arụsi ọrụ ike na India niile yana na mba iri na atọ gụnyere USA, Canada, UK na UAE.[3] A na-ekwukwa na nzukọ ahụ mere ka Sanskrit dịghachi ndụ na Gujarat [9]
Ihe nnwale ole na ole pụrụ iche dịka "Samskrit Homes" ná "Samskrit mother tongue Children" na-ewu ewu. "Saraswati Seva" bụ ọrụ nke e sitere na ya asụgharị akwụkwọ ndị na narị na narị sitere n'asụsụ India na asụsụ mba ndị ọzọ gaa n'asụsụ Sanskrit. Iji kwalite ndị odee ndị ntorobịa yana akwụkwọ ndị ọgbaraọhụrụ na Sanskrit, o merubela mmemme ndị dị ka "Samskrit Book Fair", ma "Sahityotsava". [citation needed]
Ọhụụ
[dezie | dezie ebe o si]Shastry na-ahụ Sanskrit dị ka asụsụ mba India.[9] Ọ na-ekwu, "Ruo ugbu a, a na-ahụ Samskrit naanị site n'echiche ime mmụọ ma ọ bụ nke okpukpe; o ruola mgbe a ga na-ahụta Samskrit site n'ụzọ sayensị. " Ọ na-atụ aro na Sanskrit ga-abụ ihe na-ejikọ India. [3]{[10]
Shastry kwenyere na iwere Sanskrit gakwuru ndị na-enweghị ihe ùgwù. Ọ na-ekwughachi nkwado Dr. Ambedkar [11] maka Sanskrit dị ka ikpo okwu maka ime ka mmekọrịta mmadụ na ibe ya nwee ọganihu na nhatanha.
Òtù Nkwalite Samskrit
[dezie | dezie ebe o si]Krishna shastry enyela aka ịmalite Samskrit Promotion Foundation, nke bụ ụlọ ọrụ na-emepụta usoro nkuzi Sanskrit maka ụmụ akwụkwọ na n'ịmepụta ihe ọmụmụ ọhụrụ dị iche iche maka "Sanskrit maka ebumnuche pụrụ iche" [12] òtù na-abụghị maka uru, nke na-achọ "ịme ka Samskrit wuwe ewu ọzọ" na India ọzọ yana n'ime ebumnuche ndị ọzọ iji mee ka Samskrit bụrụ "ngwá ọrụ dị irè" iji mee ka ngalaba ndị na-adịghị ike" nke ọha mmadụ dị ike n'ụzọ mmekọrịta mmadụ na ibe ya na n'ụzọ akụnaụba. Ndị nlekọta ahụ gụnyere ụmụ amaala ama ama dị ka onye bụbu Chief Justice of India R. C. Lahoti, maka Chief Election Commissioner N. Gopalaswami, Justice Rama Jois, S. Gurumurthy, na ndị ọzọ. Shastry bụ onye isi yana onye odeakwụkwọ nke òtù a. [13]
Iwu na-emetụta
[dezie | dezie ebe o si]Shastry na-etinye ihe ka ukwuu n'oge ya na ọzụzụ ndị nkuzi, ọgbakọ, imepụta ihe ndị e ji amụ ihe na ikwurịta maka agụmakwụkwọ Sanskrit yana ndị na-eme iwu. O kwenyere na ọ bụghị naanị Sanskrit dị ka asụsụ, kamakwa ihe ọmụmụ nke oge a dị ka kemịstrị, mgbakọ na mwepụ, akụkọ ihe mere eme wdg ka a ga-eji asụsụ Sanskrit na-akụzi.[3]
Ọ bụkwaara onye òtù Sanskrit Committee nke gọọmentị etiti mba ahụ hiwere nke mepụtara akwụkwọ "Road Map for the Development of Sanskrit - Ten Year Perspective Plan" na 2016. [14]
Ndị ọzọ
[dezie | dezie ebe o si]Ahụmahụ ya dị ukwuu o nwere na agụmakwụkwọ na usoro nkuzi emeela ka ọ nọrọ na Bọọdụ Rashtriya Sanskrit Sansthan na ọtụtụ mahadum ndị ọzọ.
Shastry bụ onye okwu okwu a maara nke ọma nke a na-akwanyekwara ùgwù n'ebe ọ dị elu maka ịsụ asụsụ Sanskrit n'ebe ọ dị ụtọ ma dị ike n'olu.[14] O kwenyere na okwu nchịkwa nke Bhagavad Gita ịrụ ọrụ iji nweta ebumnuche ihe na-enweghị ihe ị na-atụ anya site na ya, o wee ňụọ iyi nke onwe na ọ gaghị anata ihe nrite maọbu ihe nkwanye ùgwù ọbụla. [citation needed] Ọ na-edesi akwụkwọ ike, onye derela akwụkwọ iri na abụọ na ọtụtụ edemede ndị ọzọ n'asụsụ Sanskrit.
Akwụkwọ Ndị O Dere
[dezie | dezie ebe o si]O dere akwụkwọ iri na atọ n'Asụsụ Sanskrit.
- Savdhana Syaam
- Utthistatha Ma Svapthaha (Rielie! Ehi ụra!!)
- Parishkaaraha (Akwụkwọ na Sanskrit)
Ihe Nrite
[dezie | dezie ebe o si]- Saraswata Sudhakara na 1984 site na Kashi Pandit Parishat
- Rashtriya Yuva Puraskar na 1985 site na ABVP
- Ihe nrite Padma Shri na 2017[13]
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ "vijayavani, ನಾಡಿನ 9 ಸಾಧಕರಿಗೆ ಪದ್ಮ ಪ್ರಶಸ್ತಿ ಕಿರೀಟ, 26.01.2017". Archived from the original on 2 February 2017. Retrieved 27 January 2017.
- ↑ "PadmaAwards-2017" (PDF). Archived from the original (PDF) on 2017-01-29.
- 1 2 3 4 5 6 Unni, Aparna (4 August 2012). "A classic case of Chamu Sastry". The New Indian Express. Archived from the original on 2 February 2015. Retrieved 2 February 2015.
- ↑ Fishman, Joshua (2010-01-01). Handbook of Language and Ethnic Identity:The Success-Failure Continuum in Language and Ethnic Identity Efforts (Volume 2): The Success-Failure Continuum in Language and Ethnic Identity Efforts (|) (in Bekee). Oxford University Press, USA. ISBN 9780195392456.
- ↑ Mahurkar, Uday. "The Right Word". India Today. Archived from the original on 11 August 2010. Retrieved 21 July 2010.
- ↑ "A man's bid to revive deva vani, Sanskrit". Daily News and Analysis. 4 June 2013. Retrieved 2 February 2015.
- 1 2 Venkatraman, Vijaysree (2007-07-05). "Sanskrit echoes around the world". Christian Science Monitor. Retrieved 2016-12-21.
- 1 2 Mahurkar, Uday. "The Right Word". India Today. Archived from the original on 11 August 2010. Retrieved 2 February 2015.
- 1 2 India Today International (in Bekee). Living Media India Limited. 1999-01-01.
- ↑ India Today (in Bekee). Thomson Living Media India Limited. 2000-01-01.
- ↑ Manohar Joshi, Murli (25 April 2016). "Ambedkar wanted Sanskrit as national language: Murli Manohar". The Times of India. Retrieved 24 December 2018.
- ↑ "Learn Samskrit Online".
- 1 2 "Padma award winners from Karnataka are an eclectic mix". The Hindu. 25 January 2017. Retrieved 21 December 2018.
- 1 2 "Sanskrit will flourish despite Prejudices of Left, Libtards: Chamu Krishna Shastry". THe Hindu Business Line. 26 January 2017. Retrieved 22 December 2018.