Chiamaka Nnadozie

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chiamaka Nnadozie
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Aha enyereChiamaka Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya8 Disemba 2000 Dezie
Ebe ọmụmụorlu Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheOchee bọọlụ Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuNdị otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị nke mba Naịjirịa, Otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa na-erubeghị afọ iri na asaa, Rivers Angels F.C., Nigeria women's national under-20 football team, Paris FC Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
so na2019 FIFA Women's World Cup Dezie

Chiamaka Cynthia Nnadozie bụ onye ọgba bọọlụ Naịjirịa na-agbara Paris FC bọọlụ na ngalaba egwuregwu nke French Division 1 Féminine league. [1]

Ọrụ klọb[dezie | dezie ebe o si]

Nnadozie binyere aka maka klọb Rivers Angels na mbido afọ 2016.[2]

N’afọ 2019 Nnadozie rụrụ nnukwu ọrụ mere ka otu asọmpi Rivers Angels 2019–2020 Season merie NWPL n'asọmpi league ha.

Na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na abụọ n'ọnwa nke mbụ (Jenụwarị) n'afọ 2020 o sonyere otu klọb na French aha ya bụ Paris FC na nkwekọrịta ọnwa nke iri na asatọ.[3][4]

Ọrụ mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

N’oge asọmpi 2018 FIFA U-20 Women's World Cup Nnadozie gbara ụgbọrọ anọ.[5] Mgbe a gbaara Haiti, o nwetara aha nsọpụrụ nke "Dare to Shine" maka ezigbo arụmọrụ ya.[6] N'oge na-adịghị anya mgbe asọmpi U-20 gasịrị, ahọpụtakwara ya maka asọmpi 2018 Africa Women Cup of Nations nke afọ 2018[7] ebe ọ nọdụrụ n'oche maka egwuregwu ise niile, na asọmpi Iko WAFU nke 2019 ọ nọ na goolu maka arụmọrụ Super Falcons dị egwu, wee nweta ọkwa dịka otu n'ime ndị nche atọ na-anọchite anya Super Falcons nke Naijiria na 2019 FIFA Women's World Cupin emere na France. Ọ bụkwa mmemme izizi Nnadozie ghọrọ onye nche bọọlụ nwere ndekọ maka enyeghị gọọlụ na egwuregwu iko mba ụwa mgbe Naịjirịa jiri gọọlụ abụọ merie Korea.

Ka egwuregwu iko mba ụwa mechara, Nnadozie nyekwara ndị Falconets aka rite ọla edo na egwuruegwu mba Afrịka na Morocco mgbe o chekwara penariti atọ n'ịgba bọọlụ ha na Cameroon.

Nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mba Ofesi[dezie | dezie ebe o si]

Naijiria

Klọb[dezie | dezie ebe o si]

Ndị Mmụọ Ozi Osimiri

Nke otu onye[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Chiamaka Nnadozie at Soccerway