Chidera Okolie

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chidera Okolie
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya27 Maachị 1993 Dezie
Ebe ọmụmụEnúgwu Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2014 Dezie

Chidera Nneoma Okolie amụrụ n’abalị iri abụọ na asaa n'ime ọnwa atọ n’afọ 1993 [1]bụ̀ ode akwụkwọ agụmagụ nke alaNaịjirịa onye nwetara nlebaa anya nke mba mgbe akwụkwọ m̀bụ̀ ya bụ ,"Silence Become Too Loud" nwetara ézí nkwado na 2015 site n’aka onye isi ala Naịjirịa n’oge ahụ bụ Goodluck Jonathan . [2] [3]

Ákụ́kọ́ ńdù ónyé[dezie | dezie ebe o si]

Á mụ̀rụ̀ Okolie na Enugu na southeast Nigeria .

Okolie bidoro igosipụ̀ta ḿmásị́ ya ebe agụmagụ nọ̀ mgbe ọ́ ka bụ nwata, síté n'ime nke ọma na ngalaba akwukwo agụ́mágụ́ na ulo akwụkwọ ma ó bidokwara idere ụmụ akwụkwọ ibe ya obere akwụkwọ akụkọ n'ụlọ akwụkwọ. [4]

Okolie gụrụ akwụkwọ gbasara ìwú na Mahadum nke Naijiria,ma anabatakwara ya n'ụlọọrụ ndị òkaiwu Naijiria na Nọvemba 2016.

Ọ́rụ́ ágụ́mágụ́[dezie | dezie ebe o si]

Okolie bipụtara akwụkwọ mbụ ya, "when silence Became Too Loud"na Disemba 2014 mgbe ọ́ ka bụ nwata akwụkwọ mmụta iwu. [5] N'ọnwa Maachi 2015, akwụkwọ a nwètàrà ezi nkwado n' aka Onye bụ onye isi ala Naijiria ógè ahu, bụ Goodluck Jonathan, [3] na ọ́gbákọ̀ atụmatụ nkwalite aka ọrụ Onwe na Abuja .

Na Septemba 2017, o wepụtara akwụkwọ nke abụọ ya, bụ Nọt Forgiven,nke bụ mkpokota obere akụkọ gbasara mmetụta echiche. [6] [7]

Íkêwàpụ̀tà échìchè[dezie | dezie ebe o si]

Na February 2018, Okolie guzobere Idios Creatives, otu ịkpọ na ịnye ndị na-eto eto òhèrè ,bụ ńdí nwéré mmásị́ ma chọsie ike ka ha gosipụta ihe okike/echiche ha. [7] [4] N’Epril 2018, ọ́ tụ́pụ̀tàrà atụmatụ ńchémì echiche nke ihe ńríté sò nke lekwasịrị ányá nà akụkọ echepụtara echepụta/emeghị eme, [6] nke dọtara ụmụaka ụlọ akwụkwọ opekarịa mmadụ narị atọ,iri itoolu na asaa. Ọ bụ Okolie họpụtara akụkọ otu narị ma chịkọta ya n’akwụkwọ nke akpọrọ The Future: Nchịkọta akwụkwọ abụ na obere akụkọ nke Umuaka Ndị ahọpụtara n'ụfọdụ ụlọ akwụkwọ nọ na Naịjirịa, nke ewepụtara na Nọvemba 2018.

Ńtúrúgo na Ḿbọ̀[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Jun 2015, Okolie nwetara ihe ńríté African Achievers Awards.[Tinye edensibịa] Na 2016, é nyere ya aha dị ka odéé kachasị n'akụkọ echepụtara echepụta nke afọ ahụ ma bụrụkwa ótù n'ime otu narị odee áká ńkō na Naịjirịa na-agafebeghi afọ iri anọ na mmemmé nke mbu na mbụ nke Nigerian writers Awards. Á kọwapụtakwara ya dị ka odee kachasị n' agụmagụ echepụtara echepụta nke Xperience Womanity Awards.[1][8]

Na Jenụwarị 2019, edepụtara ya na otu narị ụmụ ntorọbịa kachasị n'iweta mgbanwe nke AvanceMedia na ngalaba Iwu na ọchịchị. [9]

Ńrụ̀tụ́áká[dezie | dezie ebe o si]