Chineze Anyaene

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chineze Anyaene
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoChineze Anyaene Dezie
Aha ọmụmụChineze Anyaene Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1984, 28 Disemba 1983 Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụfilmmaker, onye na-emeputa ihe nkiiri, onye nhazi ndu ihe nkiri Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Abuja, New York Film Academy Dezie
ogo mmụtaBachelor of Arts, nzere masters Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
Ọrụ ama amaIjé Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Chineze Anyaene (a muru n'ụbọchị nke 28 n’ọnwa Disemba nke afọ 1983) bụ onye Naijiria na-eme ihe nkiri. A maara ya nke ọma maka nkiri ya dị egwu nke afọ 2010, Ijé: The Journey..

Mmalite Ndụ na Mmụta ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Chineze Anyaene ma zulite ya n'Abuja, nke Naijiria, dị na West Afrịka. O nwetara nzere bachelọ na Theater Art na mahadum nke Abuja, dị na Naijiria. N'afọ 2005, ọ kwagara Amerịka ebe o nwetara nzere masta na Directing na New York Film Academy (NYFA).

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Chineze Anyaene, onye agụụ i me ihe nkiri na-anụ ọkụ n'obi i ji nkọwapụta dị omimi na-akọ akụkọ na nke tozuru etozu a nabatara na mba ụwa niile. Onye guzobere / onye isi oche nke Xandria Productions, [1] ụlọ ọrụ nke mmepụta ihe nkiri zuru oke nke na-ahụ maka naanị mmepụta, nnweta, azụmaahịa na nkesa ihe nkiri n'ime Afrịka n'ahịa mba ụwa. Xandria Productions nwere ihe nkiri izizi ya bụ "Ije: The Journey" n'afọ 2010 bụ nke Chineze Anyaene mepụtara ma duzie ya,nke Omotola Jalade-Ekeinde na Genevieve Nnaji tinyere nkwado mmepụta ndị Kodak. Ije na-akọ akụkọ banyere ụmụnwaanyị abụọ ndi Naijiria, Chioma na Anya, na otu Chioma si a ga mba Amerịka i nye aka ị zọpụta nwanne ya nwanyị n'ikpe igbu ọchụ. [2] E mere ihe onyonyo ọma a na Naijiria na mba Amerịka dị ka ihe nkiri mbụ e mere nke nwata akwụkwọ New York Film Academy mere; "Ije: The Journey" gara gburugburu na mmemme nkiri dị iche iche n'ụwa, rite ugwu dị icheiche dị elu ma bụrụ ihe nkiri Nigerian box office nke kpụ ọkụ n'ọnụ ma nyekwa aka na mgbanwe nke ihe nkiri sịnịma Naijiria.

N'afọ 2012, Anyaene mepụtara obere ihe nkiri, 20 Years Later, nke Larry Ulrich duziri na nke Jeff Handy, Chris Oliver na Angel Princess pụtara na ya. N'ihi ego nrụpụta nke Ijé: The Journey, n'afọ 2013, ọ ka na-achọ ego iji mee ihe nkiri ọzọ ugbu a. [3]

Chineze bu onye kwuru okwu na mmemme nke 14th Edition of African Business Club, Harvard Business School, n’isiokwu bu ‘Entertainment: A Nexus of the Movie and Music Industries in Africa. African Business Club bụ emume kasị ukwuu n'ụwa niile nke ụmụ akwụkwọ haziri na-elekwasị anya n'azụmahịa n'Afrịka. Ọ na - akpọkọ karịa ndị mmadụ 900, ndị ọkachamara n'azụmaahịa si gburugburu ụwa ebe ha na - enye ohere maka ịkparịta ụka na mmemorịta maka ndị azụmaahịa na ndị isi obodo, ụlọ ọrụ, ndị na - akwado ha, ụmụ akwụkwọ Harvard MBA na ndị ka ga-abịa, ụmụ akwụkwọ sitere na mmemme ndị ọzọ na ndị nkuzi si gburugburu ụwa. Isiokwu nke agba nke iri na anọ nke Chineze so na ya bụ Africa Incorporated: Cultivating an Integrated Market

Chineze Anyaene duuru ndị nnọchi anya ya na Tope Oshin Ogun, Ramsey Nouah, Charles Novia ị nọchite anya ụlọ ọrụ ihe nkiri nke Naijiria na World Economic Forum nke e mere n'Abuja n'afọ 2014 dịka ndị ga-atụle gbasara Nollywood na ọdịnịhụ ya [4]

Chineze na-enyekwa ndụmọdụ onye na-emepụta ihe nkiri nye akara nke mejupụtara chanelụ asaa na Sub-Saharan African direct broadcast satellite service.

Kọmitii Nhọrọ Oscar nke Naijiria (NOSC)[dezie | dezie ebe o si]

Chineze Anyaene mebere Kọmitii Nhọrọ Oscar nke Naijiria (NOSC) were nata nnabata site na Academy of Motion Picture Arts and Sciences n'afọ 2012 dịka nzukọ Naịjirịa kwadoro i dobe ma nọchite anya ntinye ihe nkiri nke mba ahụ na kaigori International Feature Film (IFF); a kwadoro kọmitii ahụ ọ bụ onye isi oche ya maka ọrụ nchịkwa afọ 5. [5]

E meghachiri kọmitii ahụ n'afọ 2019 site na Academy of Motion Picture Arts and Sciences Awards tinyekwa ya ka onye isi oche nke kọmitii mmadụ iri n'abụọ. N'afọ 2019, kọmitii ahụ nyefere ntinye mbu nke Oscars maka Best International Feature Film nke a na-akpọbu Best Foreign language category [6] [7]

Nrite[dezie | dezie ebe o si]

Onyinye ndị a ma ama bụ:

Award of Excellence na Canada International Film Festival,

The Golden Ace Award at the Las Vegas International Film Festival, [8]

The Silver Palm Award at the Mexico International Film Festival,

The Melvin van Peebles Award at the San Francisco Black Festival,[9] na

The Festival Prize for Best International Student at Swansea Bay Film Festival, awarded by Catherine Zeta-Jones and Michael Sheen.[10]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]