Gaa na ọdịnaya

Christiaan Hendrik Persoon

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Christiaan Hendrik Persoon (31 Disemba 1761[1] – 16 Nọvemba 1836) bụ onye nwere akara ugo mmụta mycology si mba Caoe Colony, onye a na-ekwu na o so na ndị chọpụtara mycological taxonomy.

Mmalite Ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Persoon na Cape Colony na Cape of Good Hope, nwa nke atọ nke nna onye Pomerania, Christiaan Daniel Persoon si mba ọzọ kwafeta, yana nne onye Dutch, Wilhelmina Elizabeth Groenwald.[1] Nne ya nwụrụ n'oge na-adịghị anya mgbe amuchara ya. N'afọ 1775, mgbe ọ dị afọ iri na atọ, e zigara ya Europe maka agụmakwụkwọ ya. Nna ya nwụrụ ka otu afọ gasịrị n'afọ 1776.[2]

Agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Onye bụbu nwa akwụkwọ nke nkà mmụta okpukpe na Halle na mbụ, Persoon gbanwere ọmụmụ ya gaa na ọmụmụ ọgwụ, nke ọ gbasoro na Leiden na Göttingen. Ọ natara nzere ọkankuzi site na Deutsche Akademie der Naturforscher na Erlangen n'afọ 1799.

Afọ ndị sochirinụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ kwagara Paris tupu afọ 1803, ebe ọ nọrọ ndụ ya fọdụrụnụ, na-akwụ ụgwọ ụlọ dị n'elu n'akụkụ ndị dara ogbenye nke obodo ahụ. O doro anya na ọ bụ onye na-enweghị ọrụ, alụghị di, dara ogbenye na onye na-anọ naanị ya, ọ bụ ezie na ya na ndị ọkà mmụta ihe ọkụkụ na Europe niile na-ederịta akwụkwọ ozi. N'ihi nsogbu ego ya, Persoon kwetara inye Ụlọ Orange ụlọ ọgwụ ya, iji nweta akwụm ụgwọ ezumike nká zuru oke maka oge ndụ ya.

Ọrụ agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

A maghị maka mmalite nke mmasị Persoon gbasara ihe ọkụkụ. Ọrụ mbụ ya bụ Abbildungen der Schwämme (Ihe osise nke fungus), nke e bipụtara n'akụkụ atọ, n'afọ 1790, 1791, na 1793. N'afọ 1794, Persoon webatara okwu lirella maka ụdị ascomata nwere oghere nke agbụrụ lichen bụ Graphis.[3] Site na 1805 ruo 1807, o bipụtara mpịakọta abụọ nke Synopsis plantarum ya (Archived 20 May 2011 na Wayback Machine), ọrụ a ma ama na-akọwa ụdị puku iri abụọ nke ụdị akụmakụ niile. Mana ọrụ ndị mbụ ya bụ gbasara fungi, nke o bipụtara ọtụtụ ọrụ maka, na-amalite na Synopsis methodica fungorum (1801); ọ bụ mmalite maka aha nke Uredinales, Ustilaginales, na Gasteromycetes. Persoon kọwara ọtụtụ ụdị polypore; ọtụtụ n'ime ha sitere na nchịkọta nke ya na Europe etiti, ebe e zigaara ya ọtụtụ ụdị ndị ọzọ sitere na nchịkọta nke onye France na-ahụ maka ihe ọkụkụ Charles Gaudichaud-Beaupré mere n'oge njem ya gburugburu ụwa. Fungi ndị a e wetara ka emesịrị so na polypores mbụ a kọwara n'ebe okpomọkụ. N'afọ 1815, a họpụtara Persoon ka ọ bụrụ onye òtù Royal Swedish Academy of Sciences.

Persoon bụ onye malitere ụdị fungal ọhụrụ, ebe ọ kọwara puku abụọ, narị abụọ na iri isii na itoolu n'ọrụ ya.[4]

Nkwanye Ùgwù

[dezie | dezie ebe o si]

A kpọrọ ụdị Persọnia, bụ ụdị obere osisi na obere ahịhịa dị iche iche nke Australia, aha ya. A na-enyekwa aha <i id="mwXw">Persọnia</i> na akwụkwọ sayensị a na-ebipụta kwa afọ abụọ gbasara molecular phylogeny and evolution of fungi, nke National Herbarium nke Netherlands na CBS Fungal Biodiversity Centre jikọrọ aka ebipụta.[5]

  • Ụdị:Taxa ndị Christiaan Hendrik Persoon nyere aha

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  • Duane Isely, One hundred and one botanists (Iowa State University Press, 1994), pp. 124-126. 
  1. 1.0 1.1 Gorter (1990). "The Life and Work of Christiaan Hendrik Persoon". Mycologist 4 (3): 106–107. DOI:10.1016/S0269-915X(09)80034-7.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "The Life and Work of Christiaan Hen" defined multiple times with different content
  2. Ainsworth (1962). "Christiaan Hendrik Persoon (1761–1836)". Nature 193 (4810). DOI:10.1038/193022a0. 
  3. Mitchell (2014). "De Bary's legacy: the emergence of differing perspectives on lichen symbiosis". Huntia 15 (1): 5–22 [13]. 
  4. Lücking (2020). "Three challenges to contemporaneous taxonomy from a licheno-mycological perspective". Megataxa 1 (1): 78–103 [85]. DOI:10.11646/megataxa.1.1.16. 
  5. PERSOONIA - Molecular Phylogeny and Evolution of Fungi. Archived from the original on 24 February 2014.
Kpọpụta njehie: <ref> tag with name "Ryvarden 1973" defined in <references> is not used in prior text.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]