Christine Ouinsavi
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Benin |
| Aha ọmụmụ | Christine Adjokè Ifètayo Nougbodé Ouinsavi |
| Aha enyere | Christine |
| Aha ezinụlọ ya | Ouinsavi |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 24 Julaị 1975 |
| Ebe ọmụmụ | Bétérou |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | French |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, researcher |
| Onye were ọrụ | University of Parakou |
| Ọkwá o ji | minister |
| Ebe agụmakwụkwọ | University of Abomey-Calavi, University of Ibadan |
| Ihe nrite | Grand Officer of the National Order of Benin, Chevalier de l'Ordre national des Palmes académiques (France), L'Oréal-UNESCO Award For Women in Science |
Christine Ouinsavi bụ onye nyocha ihe gbasara ihe gbasara ọhịa, onye natara 2007 UNESCO-L'ORÉAL International Fellowships maka ụmụ nwanyị na Sayensị, nakwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị si Benin. Kemgbe ọnwa Juun afọ 2017, ọ bụ minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ praịmarị, ịgụ na ide asụsụ mba Benin . [1] [2]
Akụkọ Ndụ
[dezie | dezie ebe o si]N'ime ụmụ agbọghọ iri na ise na-eme nchọpụta na ngalaba sayensị ndụ, Christine Ouinsavi natara ihe nrite UNESCO-L'ORÉAL International Fellowships maka ụmụ nwanyị na sayensị na 2007. Ọ so n'ime ụmụ nwanyị atọ si Afrịka natara onyinye ahụ. Mmasị ya dị na bayoloji ọhịa, Laval Forest Study Centre, University Laval, Québec, Canada kwadoro ya iji "nyocha ojiji na-adịgide adịgide nke ụdị osisi ọhịa atọ e ji mee ihe dị ka isi iyi ego dị mkpa site n'aka ndị bi n'ime ime obodo Benin ".
Christine Ouinsavi bụ onye otu gọọmentị Dr. Boni Yayi . Ọ na-ahụ maka ọrụ nke ministri na-ahụ maka agụmakwụkwọ praịmarị, ịgụ na ide ihe na asụsụ mba Benin.
Na 2017, o nwetara nzere PhD na sayensị ugbo ma nweta ọkwa prọfesọ zuru oke na Mahadum Parakou, nwanyị mbụ ruru ọkwa prọfesọ zuru oke na mahadum ahụ. Tupu nke ahụ, a nabatara ya na Mahadum dị ka osote prọfesọ na 2009 na nzere masta nke sayensị na injinịa Agronomy.
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Fifteen Young Women Researchers Receive Unesco-L'Oréal 2007 International Fellowships For Women In Science - L'Oréal Group (en). www.loreal.com. Retrieved on 2017-11-25.
- ↑ Publications (2005-03-30). Benin Diplomatic Handbook (in en). Int'l Business Publications. ISBN 9780739757451.