Civil Liberties Organization (Òtù Nnwere Onwe Obodo)
Civil Liberties Organization bụ òtù Naijiria na-abụghị nke gọọmentị nke lekwasịrị anya na ikike mmadụ na nkwado ọchịchị onye kwuo uche ya.
Akụkọ Mmalite
[dezie | dezie ebe o si]Òtù Civil Liberties Organization (CLO) anọwo na-akwalite ikike mmadụ na Naijiria kemgbe ọ malitere n'afọ 1987. [1] N'abalị iri na abụọ n'ọnwa Ọgọst n'afọ 1993, onye guzobere CLO na onye isi ya bụ Olisa Agbakoba, so n'ime ndị isi nke mkpọsa na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya megide nkagbu nke ntuli aka onye isi ala nke 12 Jun 1993 site n'aka General Ibrahim Babaginda. E jidere ọtụtụ ndị òtù CLO ma kpọchie ha ruo ọtụtụ izu ma buga ha n'ụlọ ọgwụ mgbe a tọhapụrụ ha n'ihi ọnọdụ siri ike ha na-enweta, ebe ụfọdụ ka eboro iwu maka inwe akwụkwọ mpịakọta na-ejwu maka ọchịchị onye kwuo uche ya.[2]
N'afọ 1995, African Commission on Human and Peoples' Rights natara akwụkwọ mkpesa nke Civil Liberties Organization yana Nigeria, Comm. No. 129/94 (1995) ebe CLO na-ebo ebubo na gọọmentị ndị agha nke Naijiria akwụsịla iwu nchịkwa obodo, gbasaa òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị gasị, yie ndị ikpe egwu site n'ịchụpụ ikike nke ụlọ ikpe, mebie ikike ụmụ amaala, ma mee iwu na-emebi Charter Africa.[3][4]
Mgbalị ndị a na-eme n'oge na-adịbeghị anya
[dezie | dezie ebe o si]- N'afọ 2014, CLO gbara onye isi ndị uwe ojii akwụkwọ n'ụlọ ikpe maka njide ogologo oge nke ndị na-akwado Biafra. [5]
- Na Febụwarị 2018, CLO rịọrọ Ibikunle Amosun, onye bụ gọvanọ nke steeti Ogun n'oge ahụ, maka inweta ala n'ụzọ iwu na-akwadoghị na steeti ahụ. [6]
- N'ọnwa Ọgọst afọ 2018, CLO yiri egwu ịgba Nyesom Wike akwụkwọ, onye bụ gọvanọ steeti Rivers n'oge ahụ maka emezughị nkwa ya ịmepụta ọrụ gọọmentị dị puku ise maka ndị mmadụ dị ka o kwere na nkwa na 2019. [7]
- N'ọnwa Julaị 2021, CLO dị na Akwa Ibom steeti mere mkpesa maka mmegide nke panel nnyocha EndSARS a họpụtara nye Gọvanọ Akwa Ibom Steeti, Udom Emmanuelsite n'aka ndị òtù panel ahụ.[8]
- N'ọnwa Julaị 2023, CLO katọrọ ịrị elu nke ọnụahịa mgbapụta mmanụ petrol nke ihe kpatara ya bụ mwepụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala site na nchịkwa onye isi ala Bola Ahmed Tinubu.[9]
Ndị òtù ahụ a ma ama
[dezie | dezie ebe o si]- Ahmed Adamu, onye na-ahụ maka akụ na ụba mmanụ ala na onye nkuzi mahadum, onye nwe mgbe ọ bụụrụ odeakwụkwọ mgbasa ozi nke alaka Kaduna nke CLO.
- Ayo Obe, onye ọka iwu Britain-Nigeria bụbu onye isi oche nke CLO.
- Auwal Musa Rafsanjani, onye guzobere Civil Society Legislative Advocacy Centre, onye òtù.
- Chidi Odinkalu, onye bụbu onye isi oche nke National Human Rights Commission nke Naịjirịa, sooro CLO rụọ ọrụ dị ka onye nduzi nke ọrụ na atụmatụ.
- Alex Ibru, onye Naijiria bụ ọgaranya ọchụnta ego, onye guzobere ma na-ebipụta akwụkwọ akụkọ The Guardian (Nigeria) , nyere CLO ego n'oge ọchịchị General Ibrahim Babangida.
- Gani Adams, onye na-eme mkpọsa na onye bụ ugbu a Aare Ona Kakanfo nke Yorubaland, onye ọrụ mgbasa ozi ọha na eze nke CLO n'okpuru ọchịchị Mushin n'afọ 1993
- Nnimmo Bassey, onye Naijiria na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ, jere ozi na Bọọdụ ndị Nduzi nke CLO na 1980s
- Ogaga Ifowodo, onye ọka iwu Naijiria, onye ọrụ afọ ofufo CLO maka ikike mmadụ
- Abdul Mahmud, onye ọka iwu Naijiria, jere ozi dị ka onye nduzi nke ọrụ iwu, na CLO.
- Emmanuel Onwe, onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ, Onwe so na ndị òtù guzobere CLO.
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Noble. "Lagos Journal; In Nigeria, to Rot in Jail Is a Hazard of the Innocent (Published 1989)", The New York Times, 1989-06-29. Retrieved on 2023-08-09. (in en)
- ↑ Refugees. Refworld | Nigeria: Information on the Civil Liberty Organization (CLO), its leadership, its activities, the arrest of its members and its involvement in demonstrations that followed the annulment of the 12 June 1993 elections (en). Refworld. Retrieved on 2023-08-09.
- ↑ Noble. "Lagos Journal; In Nigeria, to Rot in Jail Is a Hazard of the Innocent (Published 1989)", The New York Times, 1989-06-29. Retrieved on 2023-08-09. (in en)

- ↑ CLO Tackles Tinubu over Hike in Pump Price of Fuel – Independent Newspaper Nigeria.