Gaa na ọdịnaya

Claude Fuller (onye na-amụ banyere ụmụ ahụhụ)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Claude W. Fuller (1 Ọktoba 1872 Castle Hill, New South Wales - 5 Nọvemba 1928 Lourenço Marques) gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Melbourne nke Australia. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-amụ banyere ụmụ ahụhụ na Australia mana ọ rụrụ ọrụ nke ukwuu na South nakwa mpaghara ọdịda anyanwụ Africa.

Mgbe ọ dị afọ iri na itoolu, Fuller nwetara ọrụ mbụ dị ka onye na-ahụ maka ọrịa akwụkwọ nri na New South Wales e wee zifee ya na Western Australia ka afọ isii gasịrị. N'afọ 1898, ọ kwagara Cape Colony ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ahụ maka ụmụ ahụhụ nke gọọmentị. N'afọ sochirinụ, ọ ghọrọ onye ọrụ gọọmentị mbụ na-ahụ maka ụmụ ahụhụ na Natal ebe nlekwasị ányá ya ghọrọ njikwa na mkpochapụ nke ụmụ ahụhụ. Ọ gbasakwuru òkè n'ọrụ ya site n'ime nnyocha nke ọrịa fungus na nje akụmakụ gasị, ma rụọ ọrụ bara uru na njikwa igurube. N'oge ọ nọrọ na Natal, o wepụtara oge dị ukwuu iji chịkwaa ma kpochapụ ụmụ ahụhụ na-egbu egbu. Ọ ghọrọ otu n'ime ndị ọsụ ụzọ nke ịkpọ ụmụ ahụhụ aha na Natal, na-aga n'ihu n'ọrụ nke Swede Bror Yngve Sjöstedt.

Ọ bụ Fuller hụtara nje na-agba ọka oji (MSV) na mbụ ma kọwaa ya na akụkọ ya nke 1901 dị ka "mealie variegation" ('mealie' bụ okwu South Africa na-akpọ ọka). Ọ gbasara n'Africa na agwaetiti Indian Ocean ma bụrụ otu n'ime ọrịa ndị siri ike na kọntinent ahụ. Nje virus ahụ bụ ụmụ ahụhụ na-ekesa ya ma na-egosi dị ka akwụkwọ na-acha odo odo ma ọ bụ achatụ odo odo achakwa ọcha, na-eduga na osisi ndị na-enweghị ike itoputa ọfụma, nwekwaghị ike ịmepụta isi ọka..

Nnyocha ya banyere Ahụhụ Tsetse mere ka o kwere na ịdị adị nke Hluhluwe-Umfolozi Game Reserve na Mkhuze Game Reserves na Zululand na nhiwe nke Kruger Park na Transvaal lowveld, ga-enye ohere ga-eme ka ahụhụ ahụ si na Southern Rhodesia yana Portuguese East Africa nughachịtakwa azụ. Fuller nwere nkwado nke ndị dọkịta anụmanụ a ma ama dịka Arnold Theiler na Petrus du Toit.

N'afọ 1904, o bipụtara akwụkwọ na-ekwu maka ịkọ ụmụ osisi.ndị na-amị mkpụrụ osisi na Natal. N'otu afọ ahụ, ọ gara Brazil iji weghachite nje iji chịkwaa ụmụ ahụhụ mkpụrụ osisi nke ghọrọ nnukwu ihe na-egbu egbu n'ubi mkpụrụ osisi South Africa. Site na 1910 ọ rụrụ ọrụ dị ka osote onye isi nke ngalaba Entomology maka Union of South Africa, ọ laa ezumike nká na 1926 ma rụọ ọrụ dị ka entomologist na Portuguese East Africa.

Ọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọala na 1928 na mpụga obodo Mozambique nke Lourenço Marques, Maputo nke oge a.

Akwụkwọ Ndị O Dere

[dezie | dezie ebe o si]
    • The termites of South Africa – Claude Fuller, (South African Biological Society, 1921)
    • Observations on some South African termites – Claude Fuller, (Annals of the Natal Museum, 1919)
    • Tsetse in the Transvaal and Surrounding Territories – An Historical Review – Claude Fuller, (Division of Entomology, 1923)
    • Louis Trigardt's Trek across the Drakensberg, 1837–1838 – Claude Fuller, edited by Leo Fouché (The Van Riebeeck Society, 1932)

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]

Edensibịa

[dezie | dezie ebe o si]