Gaa na ọdịnaya

Collette Coullard

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Collette René Coullard bụ onye America na-eme mgbakọ na mwepụ, onye Injinia ụlọ ọrụ, onye na-eme nchọpụta, na onye na-ahụ maka ihe gbasara Matroid nke a maara maka nyocha ya gbasara nsogbu njikarịcha ngwakọta nke jikọtara ebe ụlọ ọrụ na njikwa ngwaahịa. Onye bụbu prọfesọ na Mahadum Purdue, Mahadum Waterloo, Mahadum Northwestern, na Mahadum Lake Superior State, ọ lara ezumike nká ịghọ prọfesọ emeritus.

Agụmakwụkwọ na ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

Coullard gụsịrị akwụkwọ n'afọ 1980 na Mahadum Lake Superior State, [1][2] wee nweta Ph.D. ya n'afọ 1985 na Mahadum Northwestern . Akwụkwọ edemede ya, Minors of 3-Connected Matroids and Adjoints of Binary Matroids, gbasara echiche matroid ma Robert E. Bixby lekọtara ya.[3]

Ọ kụziri na Mahadum Purdue na Mahadim Waterloo tupu ọ laghachi Northwestern dị ka onye otu ngalaba n'afọ 1990, [2] wee laa ezumike nká dị ka prọfesọ mgbakọ na mwepụ na Mahadam nke Lake Superior State n'afo 2018.[4][5] Ọ gakwara Mahadum nke Bonn dị ka Humboldt Fellow . [4]

Coullard bụ Charles Deering McCormick Prọfesọ nke ọka mmụta pụrụ iche na nkụzi na Mahadum Northwestern site n'afọ 1996 ruo n'afọ 1999. [1][2] N'afọ 2003, Lake Superior State University Alumni Association nyere ya Kenneth J. Shouldice Achievement Award kwa afọ. [1]

Edemsibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 3 Kenneth J. Shouldice Achievement Award, Lake Superior State University Alumni Association, retrieved 2019-09-15
  2. 1 2 3 University teaching award recipients: 1996, Northwestern University, retrieved 2019-09-15
  3. Templeeti:Mathgenealogy
  4. 1 2 "About the authors", GIDEN: a graphical environment for network optimization (PDF), November 7, 1999, p. ii, retrieved 2019-09-15
  5. Annual Retirement And Service Awards Evening Recognizes University Employees, Lake Superior State University, April 4, 2018, retrieved 2019-09-15

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  • Collette Coullard mbipụta ndị edepụtara site na Onye Ọkà mmụta Google